AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA
Abụ Ọma 46:10—“Nọrọ Jụụ ma Mara na M Bụ Chineke”
“Chịlierenụ m aka elu. Maranụ na m bụ Chineke. A ga-eto m ná mba niile. A ga-eto m n’ụwa.”—Abụ Ọma 46:10, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
“Nọrọ jụụ ma mara na m bụ Chineke, adị m elu karịa mba niile, dịrịkwa elu karịa ụwa niile.”—Abụ Ọma 46:10, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.
Ihe Abụ Ọma 46:10 Pụtara
Chineke na-agba mmadụ niile ume ka ha fee ya ma ghọta na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ụwa. O doro anya na ọ dị ike, bụrụkwa ya kwesịrị ịna-achị. Onye ọ bụla chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi ga-ekweta ihe a.—Mkpughe 4:11.
“Chịlierenụ m aka elu. Maranụ na m bụ Chineke.” N’ụfọdụ Baịbụl, otú e si sụgharịa okwu mbido a bụ “nọrọ jụụ.” Ihe a meziri ka ụfọdụ ghọtahie amaokwu a. Ha na-eche na ọ bụ iwu ka e nyere ebe a ka ndị mmadụ na-anọ jii na chọọchị. Ma, okwu Hibru e si sụgharịta “chịlierenụ m aka elu” nakwa “maranụ na m bụ Chineke,” bụ ọdụ ka Jehova a Chineke na-adụ ndị si mba niile, ka ha kwụsị imegide ya ma ghọta na ọ bụ naanị ya ka e kwesịrị ife ofufe.
Ụdị ndụmọdụ ahụ dị n’Abụ Ọma nke 2. N’ebe ahụ, Chineke kwuru na ya ga-ebibi ndị na-emegide ya. Ma, ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-achị ha tụkwasịrị ya obi ka ọ na-edu ha, na-enyekwa ha ike na amamihe. Ha na-enwe obi ụtọ, obi na-erukwa ha ala maka na ha ‘gbabara n’ime ya.’—Abụ Ọma 2:9-12.
“A ga-eto m ná mba niile. A ga-eto m n’ụwa.” N’oge ochie, e toro Jehova Chineke mgbe o ji nnukwu ike ya chebe ndị ya. (Ọpụpụ 15:1-3) N’ọdịnihu, a ga-etokwu ya mgbe mmadụ niile bị n’ụwa ga-ekweta ka ọ chịwa ha ma na-efe ya.—Abụ Ọma 86:9, 10; Aịzaya 2:11.
Ihe Ndị Gbara Abụ Ọma 46:10 Gburugburu
Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na Abụ Ọma nke 46 bụ “abụ e ji eto Chineke make ike ya” nakwa nke e ji eto ya maka na ọ bụ “onye na-agbachitere ndị ya.” Ndị Chineke bụwa Abụ Ọma nke 46, ha na-egosi na ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-echebe ha ma nyere ha aka. (Abụ Ọma 46:1, 2) Ihe ndị ha na-abụ na ya na-echetara ha na Jehova nọnyeere ha mgbe niile.—Abụ Ọma 46:7, 11.
Abụ ọma a na-echetara ha ka ha tụgharịa uche n’ọrụ ndị dị ịtụnanya Jehova Chineke rụrụ iji mee ka obi sie ha ezigbo ike na o nwere ike ọ ga-eji echebe ha. (Abụ Ọma 46:8) O kwuru hoo haa na Chineke ga-emeli ka agha kwụsị. (Abụ Ọma 46:9) N’oge ochie, Jehova mere ka agha kwụsị mgbe o chebere ndị ya ka ndị iro ha ghara ime ha ihe ọ bụla. Ma, Baịbụl kwere nkwa na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.—Aịzaya 2:4.
Jehova ọ̀ ka na-enyere ndị na-efe ya aka taa? Eenụ. Pọl onyeozi gbasiri Ndị Kraịst ume ike ka ha tụkwasị Jehova obi na ọ ga enyere ha aka. (Ndị Hibru 13:6) Ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke 46 na-eme ka obi sikwuo anyị ike na Chineke ga-echebe anyị. Ha na-enyere anyị aka ịna-ele Chineke anya ka “ebe mgbaba anyị na ike anyị.”—Abụ Ọma 46:1.
Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Abụ Ọma na-ekwu.
a Aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?“