AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA
Ilu 17:17—“Enyi Nwere Ịhụnanya Mgbe Niile”
“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”—Ilu 17:17, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
“Enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, nwanne nọ maka igbo mkpa.”—Ilu 17:17, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.
Ihe Ilu 17:17 Pụtara
A na-atụkwasị ezigbo enyi obi, ọ naghịkwa agharịpụ enyi ya. Ọ na-akwado enyi ya, na-elekọtakwa ya otú ahụ nwanne na-emere nwanne ya, karịchaa n’oge nsogbu.
“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.” Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na “enyi na-ahụ enyi ya n’anya mgbe niile.” Okwu Hibru asụgharịrị “ịhụnanya” n’ahịrịokwu a apụtaghị naanị otú obi na-adị mmadụ. Kama ọ bụ ụdị ịhụnanya enyi na-esi n’ihe ọ na-eme gosi na ọ hụrụ enyi ya n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 13:4-7) Ndị enyi hụrụ ibe ha n’anya otú ahụ anaghị agbasa ma ha nwee nghọtahie ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ. Ha na-ejikwa obi ha niile agbaghara ibe ha. (Ilu 10:12) Ezigbo enyi anaghịkwa enwere enyi ya anyaụfụ ma ihe gaziwere ya. Kama, ọ na-enwe obi ụtọ.—Ndị Rom 12:15.
“Ezigbo enyi . . . bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.” Ilu a gosiri na ndị bụ́ ụmụnne na-adịkarị n’ezigbo mma. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile iji nyere enyi anyị ihe na-esiri ike aka, anyị na-eme ka nwanne afọ onye ahụ. Nsogbu anaghịkwa eme ka enyi ndị dị ná mma otú a gbasaa. Kama, ha na-adịkwu ná mma maka na ha nwee nsogbu, ha na-abịa hụkwuo ibe ha n’anya, na-akwanyekwuru ibe ha ùgwù.
Ihe Ndị Gbara Ilu 17:17 Gburugburu
Ihe juru n’akwụkwọ Ilu bụ okwu amamihe ndị e dere ná nkenke, ndị na-emekwa ka onye na-agụ ya chee echiche. Ọ bụ Eze Solomọn dere ọtụtụ n’ime ha. O dere ha otú ndị Hibru si ede abụ uri. Kama ide okwu ndị otú e si akpọ ha yiri ibe ha, o dere ihe ndị yiri ibe ha na ihe ndị dị iche n’ibe ha. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ede otu ihe iji mesie nke mbụ o dere ike ma ọ bụkwanụ ya edee ihe dị iche n’ihe mbụ o dere. Ilu 17:17 bụ ụdị abụ uri yiri ibe ya, e ji ahịrịokwu nke abụọ mesie ahịrịokwu nke mbụ ike. Ilu 18:24 bụ ụdị nke ihe nke abụọ o dere dị iche n’ihe mbụ o dere. Ebe ahụ sịrị: “E nwere ndị enyi dị njikere ịla ibe ha n’iyi, ma e nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya.”
Mgbe Solomọn dere Ilu 17:17, o nwere ike ịbụ na ọ na-eche banyere otú nna ya, bụ́ Devid, na Jonatan, nwa Eze Sọl, si dị n’ezigbo mma. (1 Samuel 13:16; 18:1; 19:1-3; 20:30-34, 41, 42; 23:16-18) N’agbanyeghị na Devid na Jonatan abụghị ụmụnne, ha dị n’ezigbo mma karịadị ụmụnne. Jonatan medịrị ihe gaara ata isi ya iji chebe enyi ya. a
Otú E Si Sụgharịa Ilu 17:17 ná Nsụgharị Baịbụl Ọzọ
“Na mgbe niile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Bible Nsọ nke Union Version.
Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Ilu na-ekwu.
a Gụọ isiokwu bụ́ “Bound Together in Close Friendship.”