AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA
Matiu 6:34—“Ụnụ Echegbula Onwe Ụnụ Banyere Echi”
“Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.”—Matiu 6:34, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
“Ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere echi. N’ihi na echi ga-echere onwe ya banyere mkpà nke dịrị ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuerela ụbọchị taa.”—Matiu 6:34, Bible Nsọ Ọhụụ.
Ihe Matiu 6:34 Pụtara
Ọ bụ Jizọs kwuru ihe dị n’amaokwu a. O ji ya na-agwa ndị ọ na-akụziri ihe na ha ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha banyere nsogbu ndị nwere ike ịbịara ha n’ọdịnihu ma ọ bụ kwe ka nsogbu ndị ahụ na-echu ha ụra. Kama, ọ ga-aka abara ha uru ma ọ bụrụ na ha na-eche naanị maka ụbọchị nke ọ bụla, ghara ịna-echegbu onwe ha banyere echi.
Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na anyị ekwesịtụdịghị iche maka echi ma ọ bụ mee atụmatụ maka echi. (Ilu 21:5) Kama, ọ na-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-enye onwe anyị oké nsogbu ma o bụ na-echekasị onwe anyị maka ihe nwere ike ime echi. Ịna-echekasị onwe anyị otú ahụ nwere ike ime ka anyị kwụsị ịna-enwe obi ụtọ, meekwa ka anyị gharazie ịna-eme ihe ndị anyị kwesịrị ime. Ọ bụghị anyị ịnọ na-echegbu onwe anyị ga-eme ka nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu ghara ịbịa. Ihe ọzọ bụ na ihe ndị anyị na-echegbu onwe anyị gbasara ha nwedịrị ike ghara ime. Ha meekwanụ eme, ha anaghịdị adị njọ otú anyị cheburu.
Ihe Ndị Gbara Matiu 6:34 Gburugburu
Ihe ndị a Jizọs kwuru n’amaokwu a so n’ihe ndị ọ kụziri n’Ozizi Elu Ugwu ya. E dere ihe ndị a ọ kụziri na Matiu 5-7. Jizọs kụziri na nchegbu agaghị emeli ka ahụ́ dị anyị mma ma ọ bụ mee ka anyị dịtee ndụ aka. (Matiu 6:27) O kwukwara na ọ bụrụ na anyị ana-ebute ihe gbasara Chineke ụzọ ná ndụ anyị, na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị maka echi. Ebe ọ bụ na Chineke na-elekọta ma osisi ma ahịhịa ma ụmụ anụmanụ, ọ ga-elekọtakwa ndị na-efe ya.—Matiu 6:25, 26, 28-33.
Gụọ Matiu isi 6 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.