AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA
Ndị Rom 6:23—“Ụgwọ Ọrụ nke Mmehie Bụ Ọnwụ; ma Onyinye Amara nke Chineke Na-enye Bụ Ndụ Ebighị Ebi”
“Ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye Chineke si n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị na-enye bụ ndụ ebighị ebi.”—Ndị Rom 6:23, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
“Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23, Bible Nsọ nke Union Version.
Ihe Ndị Rom 6:23 Pụtara
Pọl onyeozi ji ihe a o kwuru na-egosi na ihe mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ bụ n’ihi na ha bụ ndị mmehie. Ma, Chineke nyere ndị ji obi ha niile na-efe ya onyinye pụrụ iche, ya bụ, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.
“Ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” Anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, n’ihi ya, anyị na-eme mmehie. a (Abụ Ọma 51:5; Ekliziastis 7:20) Ebe ọ bụ na anyị bu mmehie pụta ụwa, anyị na-aka nká, na-anwụkwa anwụ.—Ndị Rom 5:12.
Iji mee ka ihe a doo anya, Pọl ji mmehie tụnyere nna ukwu nke na-akwụ onye rụụrụ ya ọrụ ụgwọ ọrụ. Otú ahụ onye ọrụ na-atụ anya ka a kwụọ ya ụgwọ ọrụ ya, ka ụmụ mmadụ na-atụkwa anya ịnwụ maka na ha bụ ndị na-ezughị okè.
Ma, Pọl kwukwara na “onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná mmehie ya.” (Ndị Rom 6:7) Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, onye ahụ enwerela onwe ya, ma ọ bụ a tọhapụla ya na mmehie ọ bụla o mere. Ọ bụ ya mere na anyị ekwesịghị ịna-eche na onye nwụrụ anwụ nwere ebe ọ nọ na-ata ahụhụ maka mmehie ndị o mere n’oge gara aga. Baịbụl medịrị ka o doo anya na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike iche echiche ma ọ bụ ime ihe ọ bụla.—Ekliziastis 9:5.
“Ma onyinye Chineke si n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị na-enye bụ ndụ ebighị ebi.” “Ụgwọ ọrụ” mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi. Okwu Grik e si sụgharịta “onyinye” nwekwara ike ịpụta “onyinye e nyere mmadụ nke na-erughịrị ya” ma ọ bụ “onyinye amara.” Ọ pụtara ihe e nyere mmadụ n’agbanyeghị na onye ahụ arụghị ọrụ iji nweta ya. E nweghị mmadụ ọ bụla ga-emetali ihe ga-eme ka a zọpụta ya ma ọ bụ ka e nye ya ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 49:7, 8) Ma, Chineke ji obiọma ya na-enye ndị nwere okwukwe na Jizọs onyinye a na-enweghị atụ, ya bụ, ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; Ndị Rom 5:15, 18.
Ihe Ndị Gbara Ndị Rom 6:23 Gburugburu
Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi a n’ihe dị ka afọ 56 O.N.K. O yiri ka ihe ụfọdụ Ndị Krịast n’oge ahụ ghọtara banyere ebere Chineke adabaghị adaba. N’ihi ihe ndị Grik na-akụzi, ha chere na ka ha na-emekwu ihe ọjọọ ka Chineke ga na-agbagharakwu ha. (Ndị Rom 6:1) O nwekwara ike ịbụ na ndị ọzọ chere na a gaghị ata ha ahụhụ maka ihe ọjọọ ndị ha na-eme n’ihi na ha anọghịzi n’okpuru Iwu Mosis. (Ndị Rom 6:15) N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl dere, o mere ka o doo anya na Chineke agaghị na-emere Ndị Kraịst ebere ma ọ bụrụ na ha ekwe ka mmehie na-achị ha.—Ndị Rom 6:12-14, 16.
Ihe Pọl kwuru na-agba ndị na-efe Chineke taa ume na n’agbanyeghị na a mụrụ ha ná mmehie, ha ka nwere olileanya. Ọ bụrụ na ha ana-edebe iwu Chineke nyere ma ghara ịna-eme ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ, Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye ha ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:22.
Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Ndị Rom na-ekwu.
a Na Baịbụl, “mmehie” pụtara ihe ọ bụla mmadụ mere ma ọ bụ àgwà ọ bụla mmadụ kpara nke na-adabaghị n’iwu Chineke. (1 Jọn 3:4) Gụọ isiokwu bụ “Gịnị bụ Mmehie?”