Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Ànyị Kwesịrị Ibiri Tupu Anyị Alụọ Di na Nwunye?

Ànyị Kwesịrị Ibiri Tupu Anyị Alụọ Di na Nwunye?

 Ọtụtụ ndị chọrọ ịlụ di na nwunye na-ebiri tupu ha alụọ. Ụfọdụ na-ebiri iji mara ma ihe ọ̀ ga-adabakwara ha abụọ. Ụfọdụ chekwara na ọ ga-enyere ha aka ịna-ebi n’udo ma ha mechaa lụọ. Ma, ọ̀ dị mma nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ?

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Gịnị ka Baịbụl kwuru?

  •   Baịbụl akwadoghị nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị ka anyị “ghara ịna-akwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3; 1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ihe so n’ịkwa iko a bụ nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye ibi n’otu ụlọ ma na-enwe mmekọahụ, ọ bụrụgodị na ha bu n’obi ịlụ n’ọdịnihu. a Ihe ndị Baịbụl kwuru na-enyere nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ aka izere ibute afọ ime mgbe ha na-alụbeghị alụ, nyekwara ha aka izere nsogbu ndị ọzọ mmadụ abụọ ibiri tupu alụọ na-akpata.

  •   Alụmdi na nwunye si n’aka Chineke. Mgbe Chineke malitere ya, o kwuru, sị: ‘Nwoke ga-ahapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụrụzie otu anụ ahụ́.’ (Jenesis 2:24) Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị alụọ alụọ, ha ga-ahụ ibe ha n’anya, na-ebi n’udo ma jiri alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe.

 Nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ, ọ̀ ga-eme ka ha jikere maka alụmdi na nwunye?

 Ụfọdụ chere na azịza ajụjụ a bụ ee. Ha na-eche na nwoke na nwaanyị ga-amụta ihe ndị ga-abara ha uru ka ha na-arụkọ ọrụ ndị dị n’ụlọ ọnụ nakwa ka ha na-ahụ otú ibe ha si akpa àgwà. Ma, otu ihe dị ezigbo mkpa na-eme ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma bụ iji ya kpọrọ ihe.

 Olee otú nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ ga-esi mụta ịrapara n’ahụ́ ibe ha ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe siri ike? Otú ha ga-esi amụta ya abụghị ibiri tupu ha alụọ, ma were ya na onye nke ọ bụla nwere ike ịgawara onwe ya ma ọ bụrụ na ihe adabaraghị ha. Kama, ha ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụ na ha ejiri ibe ha kpọrọ ihe ma na-agbakọ aka emeri nsogbu ọ bụla bịaara ha.

 Nke bụ́ eziokwu: Nwoke na nwaanyị biri tupu ha alụọ, ọ naghị eme ka ha jikere maka alụmdi na nwunye, kama, o nwere ike ime ka ha tisaa.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.”​—Ndị Galeshia 6:7.

 Nwoke na nwaanyị biri tupu ha alụọ, ọ̀ ga-ebelata ego ha ga-emefu?

 Ụfọdụ ndị chere na azịza ajụjụ a bụ ee. Ụlọ ọrụ na-eme nchọnchọ a na-akpọ Pew Research Center chọpụtara na n’Amerịka, mmadụ anọ n’ime mmadụ iri ndị biiri tupu ha alụọ mere ya maka na ha chere na ọ ga-ebelata ego ha ga-emefu. Ma, ka ha biri ruo oge ụfọdụ, ọtụtụ n’ime ha kwuru na ihe mere na ha adịbeghị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye bụ maka na ego adịbeghị.

 E nwere nsogbu ndị ọzọ nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ nwere ike ịkpatara ha, karịchaa nke nwaanyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha etisaa, ọ na-abụkarị nke nwaanyị ka a na-ahapụrụ ụmụ ha mụtara ka ọ zụwa.

 Nke bụ́ eziokwu: E nwetụdịghị uru dị na nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ ma e jiri ya tụnyere nsogbu ndị ọ na-akpata.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị. Ọ bụ m na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.”​—Aịzaya 48:17.

 Nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ, ọ̀ ga-eme ka ha ghara ịlụ onye ihe na-agaghị adabara ha na ya?

 Ụfọdụ ndị chere na azịza ajụjụ a bụ ee. Ma, akwụkwọ bụ́ Fighting for Your Marriage kwuru na “ndị na-ebiri tupu ha alụọ anaghị aghọta na ọ ga-eme ka ịhapụ ibe ha siere ha ike.” Maka gịnị? Maka na ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịchọpụta na ihe anatụdịghị adabara ha. Ma n’agbanyeghị ya, ha anaghị akwụsị ibi. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na n’agbanyeghị na ha achọghịzi ibi, ha na-ebiri gawa naanị maka na ha abụọ ibi amarala ha ahụ́ n’ihi ihe ndị dị ka anụ ụlọ ha gbakọrọ aka nwee, ụlọ ha bi na ya nke ha abụọ na-akwụ ụgwọ ya, ma ọ bụ afọ ime ha na-atụghị anya ya. b Dị ka akwụkwọ ahụ bụ́ Fighting for Your Marriage kwuru, ihe a pụtara na “ụfọdụ ndị na-agaraghị emecha lụọ, na-alụzi maka na ọ dịịrị ha mfe ibiri na-aga karịa ịhapụ ibe ha.”

 Nke bụ́ eziokwu: Ibiri tupu unu alụọ agaghị enyere gị aka ikpebi ihe dị mma gbasara onye ị ga-alụ, kama, ọ ga-eme ka o siere gị ike ịhapụ onye ihe na-anaghị adabara gị na ya.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo, ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.”​—Ilu 22:3.

 È nwere ihe ga-akara unu mma ime karịa ibiri tupu unu alụọ?

 E nwere ihe ga-eme ka unu na-ebi n’udo ma unu lụọ di ma ọ bụ nwunye, meekwa ka unu zere nsogbu nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ na-akpata. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru ka di na nwunye na-eme. Wepụta ezigbo oge ị ga-eji amata onye ị chọrọ ịlụ tupu unu alụọ ma biri n’otu ụlọ. Ọ ga-akara gị mma ịlụ onye gị na ya kweere n’otu ihe na onye ihe ndị bụ́ mkpa gị bụkwa mkpa ya, kama ịlụ mmadụ naanị maka na gị na ya ga na-enwe mmekọahụ.

 Ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-eme ihe ndị ga-eme ka alụmdi na nwunye unu bụrụ a kwaa akwụrụ, unu ana-enwekwa obi ụtọ. c Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka . . .

 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe ndị a, gaa n’ebe a kpọrọ “Alụmdi na Nwunye na Ezinụlọ” na jw.org.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ha bakwara uru iji ha akụzi ihe.”​—2 Timoti 3:16.

b Ihe a gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Family Relations, n’isiokwu bụ́ “Sliding Versus Deciding: Inertia and the Premarital Cohabitation Effect,” nke Scott M Stanley, Galena Kline Rhoades, na Howard J. Markman dere.

c N’omenala ụfọdụ, aka ndị nne na nna na-adị n’ịchọta onye nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị ga-alụ. Ọ dị otú ahụ, Baịbụl ga-enyere ndị nne na nna aka ịmata àgwà onye ha ga-achọ ka nwa ha lụọ kwesịrị ịna-akpa.