Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Ile Ndị Gba Ọtọ Nwere Ike Ime Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Tisaa

Ile Ndị Gba Ọtọ Nwere Ike Ime Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Tisaa

 Otu nwaanyị chọpụtara omume ọjọọ di ya na-ezo. Di ya adaa n’ala na-arịọ ya mgbaghara, kwe ya nkwa na ọ ga-akwụsị ya. Ọ kwụsịrị ya ruo oge ụfọdụ, ma mechaa mee ya ọzọ, rịọwakwa mgbaghara ọzọ. Ọ bụ otú a ka ọ na-eme.

 Ụdị ihe a ọ̀ na-eme gị? Ya bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịghọta na ndị gba ọtọ ị na-ele na-akpa nwunye gị aka ọjọọ, matakwa otú i nwere ike isi kwụsịchaa àgwà ọjọọ a kpamkpam. a

Ihe dị n’isiokwu a

 Ihe i kwesịrị ịma

 Ile ndị gba ọtọ nwere ike itisa di na nwunye. O nwere ike ime ka nwaanyị na-eburu di ya iwe n’obi, meekwa ka ọ ghara ịtụkwasị ya obi. b

 Lee nsogbu ụfọdụ nwaanyị di ya na-ele ndị gba ọtọ nwere ike inwe:

  •   O nwere ike ịdị ya ka di ya ọ̀ gbara n’èzí. Otu nwaanyị aha ya bụ Sarah kwuru, sị: “Ọ na-adị m ka di m ọ̀ kwaala iko ugboro ugboro.”

  •   O nwere ike ịdị ya ka e nweghị uru ọ bara. Otu nwaanyị kwuru na ndị gba ọtọ di ya na-ele mere ka ya na-ele onwe ya anya ka ‘akpa njọ, ihere ana-emekwa ya.’

  •   O nwere ike isiri ya ike ịtụkwasị di ya obi. Otu nwaanyị aha ya bụ Helen kwuru, sị: “M na-enyo ihe niile di m na-eme enyo.”

  •   O nwere ike ịna-echegbu onwe ya. Otu nwaanyị aha ya bụ Catherine sịrị: “Naanị ihe m na-eche mgbe niile bụ àgwà ahụ riri di m ahụ́.”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Baịbụl gwara di ka ọ hụ nwunye ya n’anya. (Ndị Efesọs 5:25) Ọ bụrụ na àgwà di na-akpa na-eme ka nwunye ya na-enwe otu n’ime nsogbu ndị ahụ e kwuru, ọ̀ hụrụnụ nwunye ya n’anya?

 Ihe i nwere ike ime

 Ịkwụsị ile ndị gba ọtọ anaghị adị mfe. Otu nwaanyị aha ya bụ Stacey kwuru, sị: “Di m kwụsịrị ịṅụ sịga, ịṅụ ìgbó, na ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ma ịkwụsị ile ndị gba ọtọ ka na-esiri ya ike.”

 Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ihe ndị a nwere ike inyere gị aka ịkwụsị àgwà ọjọọ a kpamkpam.

  •   Ghọta ihe mere ile ndị gba ọtọ ji dị njọ. Ile ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ na-eme ihe ga-atọ naanị ya ụtọ, nke ga-eme ka àgwà ndị na-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ nyụọ ka ọkụ, àgwà ndị dị ka ịhụ ibe ha n’anya, ịtụkwasị ibe ha obi, na ịkwado ibe ha. Onye na-ele ya na-egosikwa na ọ naghị akwanyere Jehova Chineke, Onye malitere alụmdi na nwunye, ùgwù.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka mmadụ niile na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù.”​—Ndị Hibru 13:4.

  •   Atala onye ọzọ ụta maka ihe i mere. Asịla, ‘Agaraghị m na-ele ndị gba ọtọ ma a sị na nwunye m na-egosi m na ọ hụrụ m n’anya karịa otú o si eme.’ Ịta nwunye gị ụta adịghị mma. Ọ ga-eme ka i nwee ihe ị ga-akụdo aka lee ndị gba ọtọ ọzọ ma o mee ihe wutere gị.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.”​—Jems 1:14.

  •   Na-agwa nwunye gị eziokwu niile. Otu nwoke aha ya bụ Kevin kwuru, sị: “M na-ajụkarị nwunye m ụbọchị ọ bụla ma è nwere otú m si lee ihe nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa m, ka m̀ zeere ya. Mụ na nwunye m isi otú a na-ekwurịta okwu mere ka ọ ghara iche na e nwere ihe m na-ezoro ya.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Anyị chọkwara ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.”​—Ndị Hibru 13:18.

  •   Mụrụ anya. I nwere ike ile ndị gba ọtọ ọzọ ọ bụrụgodị na ọtụtụ afọ agaala kemgbe i chere na ị kwụsịla ya. Kevin anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M kwụsịrị ile ndị gba ọtọ ruo afọ iri. Obi sikwara m ike na nsogbu nke ahụ agaala. Ma àgwà ọjọọ ahụ dị ka anụ ọjọọ gara zoo, na-eche mgbe ọ ga-abịa ọgụ ọzọ.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka onye chere na ya kwụ chịm lezie anya ka ọ ghara ịda.”​—1 Ndị Kọrịnt 10:12.

  •   Ọnwụnwa bịara gị, chere. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ị gaghị egbochili ihe ọjọọ ịbata gị n’obi, ma ị ga-ekpebili ma ị̀ ga-eme ihe ọjọọ ahụ ma ọ bụ jụ ya. Ihe ọjọọ ahụ ga-apụ gị n’obi. O nwedịrị ike ịpụ ngwa ngwa ma ị mụta ichewe ihe ọzọ.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Onye ọ bụla n’ime unu kwesịrị ịma otú ọ ga-esi na-ejide ahụ́ ya, ka ahụ́ ya wee dị nsọ ma dị ùgwù, ọ bụghị ime ka mba ndị na-amaghị Chineke, bụ́ ndị anyaukwu na-eme ka ha ghara ijide onwe ha ma agụụ mmekọahụ gụwa ha.”​—1 Ndị Tesalonaịka 4:4, 5.

  •   Zere ihe ndị nwere ike ime ka i mee ya ọzọ. Otu akwụkwọ bụ́ Willpower’s Not Enough kwuru, sị: “I mewehaala ihe nwere ike ime ka i mee ya ọzọ, ọ ga-adị ka ebe ị mụnyere ọkụ, na-echezi obere mmanụ ọkụ ga-eme ka ọkụ ahụ nwuru.”

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ekwela ka ihe ọjọọ ọ bụla na-achị m.”​—Abụ Ọma 119:133.

  •   Echela na olileanya adịghị. O nwere ike iwe ogologo oge, ma ọ bụdị ọtụtụ afọ, tupu nwunye gị amalitekwa ịtụkwasị gị obi. Mana, ọtụtụ di na nwunye ebidola ịtụkwasị ibe ha obi.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ịhụnanya na-enwe ndidi.”​—1 Ndị Kọrịnt 13:4.

a Ọ bụ eziokwu na isiokwu a na-ekwu maka di, ihe ndị e kwuru na ya gbasakwara ndị nwunye na-ele ndị gba ọtọ.

b Ụfọdụ di na nwunye na-ekwu na ha ilekọ ndị gba ọtọ ọnụ nwere ike ime ka ha dịkwuo ná mma. Mana, omume a adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru.​—Ilu 5:15-20; 1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5; Ndị Galeshia 5:22, 23.