Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ụmụaka na Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet​—Nke 2: Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Otú Ọ Ga-esi Zere Nsogbu n’Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet

Ụmụaka na Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet​—Nke 2: Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Otú Ọ Ga-esi Zere Nsogbu n’Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet

 Ọtụtụ ndị nne na nna anaghị ekwe ka ụmụ ha na-aga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet n’ihi nsogbu ndị o nwere ike ịkpata. Ma, ọ bụrụ na ị hapụ nwa gị na-eto eto ka ọ na-aga n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, olee otú ị ga-esi nyere ya aka izere nsogbu ndị o nwere ike ịkpata, nyekwara ya aka ịmụta otú ọ ga-esi na-eme ihe dị mma n’Ịntanet?

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Ihe kacha nwa gị mkpa

 Ihe i kwesịrị ịma: Ebe ọ bụ na ịga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike iri mmadụ isi, o nwere ike ịdị mkpa ka i nyere nwa gị aka ịma awa ole ọ ga na-anọru ebe ahụ.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—Ndị Filipaị 1:10.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Nwa gị ọ̀ na-anọ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet mgbe o kwesịrị ịna-ehi ụra, na-arụ ọrụ e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe ya na ndị ezinụlọ unu kwesịrị ịnọ? Ndị ọkachamara kwuru na ndị na-eto eto kwesịrị ịna-ehi ụra ihe dị ka awa itoolu n’abalị ọ bụla, ma ndị na-anọ ọtụtụ awa kwa ụbọchị n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike ha agaghị ehili ụra ruo awa asaa.

 Ihe i nwere ike ime: Gị na nwa gị kwurịta ihe kwesịrị ịkacha ya mkpa, gwakwa ya uru iwebilata awa ole ọ ga na-anọ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet bara. Tie iwu ndị dabara adaba, dị ka ịgwa ya ejila ekwentị ya aba n’ọnụ ụlọ ya ma ọ gawa ịlakpu ụra n’abali. Mkpa gị kwesịrị ịbụ inyere ya aka ka ọ mụta ịna-ejide onwe ya. Àgwà a ga-abara ya ezigbo uru ndụ ya niile.​—1 Ndị Kọrịnt 9:25.

 Nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara nwa gị

 Ihe i kwesịrị ịma: Ọ bụrụ na onye na-eto eto na-elekarị foto ndị mmadụ tinyere n’Ịntanet, bụ́ ndị e ji ngwá ọrụ ụfọdụ mee ka ha makwuo mma, ma ọ bụkwanụ foto ndị enyi ya sere ebe ha na-ekpori ndụ, owu nwere ike ịna-ama ya, ya ana-echegbu onwe ya, ma ọ bụkwanụ ya adaa mbà.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Unu emekwarala ndị ọzọ anyaụfụ.”​—1 Pita 2:1.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ịga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ọ̀ na-eme ka obi na-ajọ nwa gị njọ maka na ọ dịghị otú ndị ọ hụrụ ebe ahụ dị? Ọ̀ na-eche na ndị ọzọ niile na-enwe obi ụtọ ma ndụ nke ya ana-agwụ ike?

 Ihe i nwere ike ime: Gị na nwa gị kwurịta nsogbu ndị iji onwe ya atụnyere ndị ọzọ na-akpata. Buru n’uche na ihe a nwere ike ịkpa ụmụ nwaanyị aka karịa ụmụ nwoke, n’ihi na ụmụ nwaanyị na-echegbukarị onwe ha gbasara ha na ndị ọzọ ịdị ná mma na otú ha dị n’anya karịa ụmụ nwoke. I nwedịrị ike ịtụrụ nwa gị aro ka ọ na-eme ọ gụrụ gụrụ, ya akwụsị ịga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jacob kwuru, sị: “E nwere mgbe m wepụrụ ihe m na-eji aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Ihe a nyeere m aka ịchọpụta ihe ndị kacha m mkpa, meekwa ka m gbanwee otú m si ele onwe m na ndị ọzọ anya.”

 Ihe nwa gị na-eme n’Ịntanet

 Ihe i kwesịrị ịma: Onye na-aga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet yiri onye ya na ọtụtụ mmadụ bi. Ha ga na-aghọtahie ibe ha, na-esekwa okwu.

 Ihe Baịbụl kwuru: ‘Kwụsịnụ inwe ụdị obi ilu ọ bụla, iwe, ọnụma, iti mkpu, na ịkparị mmadụ . . . Na-enwerenụ ibe unu obiọma.’​—Ndị Efesọs 4:31, 32.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ịga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ò meela ka nwa gị bido ịgba asịrị, na-ese okwu, ma ọ bụ na-ekwu okwu ọjọọ?

 Ihe i nwere ike ime: Kụziere nwa gị otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ọma n’Ịntanet. Akwụkwọ bụ́ Digital Kids kwuru, sị: “Anyị bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ anyị na ha ekwesịghị ịna-akpaso mmadụ àgwà ọjọọ, ma n’ịntanet ma ihu na ihu. Ọ so n’ọrụ anyị.”

 Cheta na mmadụ ịga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet esoghị n’ihe na-eme ka mmadụ dịrị ndụ, ọ bụghịkwa ndị nne na nna niile na-ekwe ka ụmụ ha na-aga ebe ahụ. Ọ bụrụ na ị hapụ nwa gị ka ọ na-aga ebe ahụ, i kwesịrị ijide n’aka na ọ ga-ekpebili awa ole ọ ga na-anọ ebe ahụ, na ọ ga na-emete ezigbo ndị enyi ebe ahụ, nakwa na ọ ga-ezere ihe ndị na-adịghị mma.