Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ụmụaka na Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet​—Nke 1: M̀ Kwesịrị Ịhapụ Nwa M Ka Ọ Na-aga Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet?

Ụmụaka na Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet​—Nke 1: M̀ Kwesịrị Ịhapụ Nwa M Ka Ọ Na-aga Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet?

 N’otu nchọpụta e mere, n’ime ndị na-eto eto iri, asaa kwuru na ha na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Ọ̀ na-agụsi nwa gị agụụ ike iso na-aga ebe ahụ? Ọ bụrụ na ọ na-agụ ya agụụ, e nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Ihe nwa gị ga-eji oge ya na-eme

 Ebe a kpọrọ HelpGuide n’Ịntanet kwuru na “a haziri ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ka ịga na ya na-agụ mmadụ agụụ, ka mmadụ na-anọte aka na ya, nakwa ka mmadụ na-ele ekwentị ya mgbe niile iji mara ma è nweela ihe ọhụrụ bataranụ.”

 “M lewe ihe dị iche iche ndị mmadụ tinyere n’Ịntanet, anaghị m ama mgbe ọtụtụ awa ji gaa. Ọ na-esi ezigbo ike idowe ekwentị m, ma malite ime ihe ọzọ bara uru.”​—Lynne. Ọ dị afọ 20.

 Jụọ onwe gị, sị: Nwa m ọ̀ ga na-ejideli onwe ya ma na-erube isi n’iwu ndị m ga-enye ya gbasara awa ole ọ ga na-anọ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet? Nwa m ò toruola ikpebiri onwe ya awa ole ọ ga na-anọ na ya ma na-eme ihe ahụ o kpebiri?

 Ihe Baịbụl kwuru: ‘Kpacharanụ nnọọ anya ka unu na-akpa àgwà ka ndị ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.’​—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Ịhapụ nwa gị ka ọ na-aga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet n’agwaghị ya ihe ndị o kwesịrị ime na ihe ndị ọ na-ekwesịghị ime dị ka ịhapụ ya ka ọ gbawa ịnyịnya n’ebughị ụzọ kụziere ya otú e si agba ya

 Ihe nwa gị chere gbasara imete ndị enyi

 A haziri ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet otú ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-eche na ha nwere ọtụtụ ndị enyi. Ma ndị ha na mmadụ na-akpa n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet anaghị abụ ndị enyi n’eziokwu.

 “Achọpụtala m na ọtụtụ ndị na-eto eto na-eche na ọ bụrụ na ihe ha tinyere n’Ịntanet amasị ọtụtụ ndị ma ọ bụ ha nwee ọtụtụ ndị na-ahụ ihe ha tinyere n’Ịntanet, ọ pụtara na e nwere ọtụtụ ndị hụrụ ha n’anya ọ bụrụgodị na ha amaghị ndị ha bụ. Ma ihe a ha na-eche abụghị eziokwu.”​—Patricia. Ọ dị afọ 17.

 Jụọ onwe gị, sị: Nwa m ò toruola otú ọ ga-aghọta na e nweghị uru ịbụ onye a ma ama n’Ịntanet bara? Ọ̀ matala otú e si emete ndị enyi ihu na ihu?

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

 Otú obi na-adị nwa gị

 Ndị na-eme nchọpụta achọpụtala na owu na-amakarị ndị na-anọ ogologo oge n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, ha na-echegbukarị onwe ha, na-adakwa mbà n’obi.

 “Obi ọjọọ ga na-eme gị ma ị hụ foto dị iche iche na-egosi ihe ndị enyi gị na ibe ha na-eme mgbe ị na-esoghị ha.”​—Serena. Ọ dị afọ 19.

 Jụọ onwe gị, sị: Nwa m ò toola nke na ọ ga-aghọta na o kwesịghị ịna-eche naanị gbasara onwe ya, na-ama aka, ma ọ bụ kwe ka ihe ndị ọ na-ahụ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet kpaa ya aka?

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi, ghara ịna-amarịta aka, gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.”​—Ndị Galeshia 5:26.

 Ihe nwa gị ga na-eme ma ọ gaa ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet

 Ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike ime ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịchọ ibe ha okwu, izigara ibe ha foto gbasara mmekọahụ, na ile ndị gba ọtọ. Ọ bụrụgodị na nwa gị ebughị n’obi ime ihe ndị a, ndị nke ọ na-ahụ ebe ahụ nwere ike ịkpa ya aka ọjọọ.

 “M chọpụtara na ihe ndị dị n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike iyi ihe na-adịghị njọ, ma ha nwere ike iji nwayọọ nwayọọ mee ka mmadụ mewe ihe ọjọọ. A na-ekwu ọtụtụ okwu ọjọọ ebe ahụ, na-etinyekwa ụdị egwú ndị na-adịghị mma.”​—Linda. Ọ dị afọ 23.

 Jụọ onwe gị, sị: Nwa m ò toola nke na ọ ga na-eme ihe dị mma n’Ịntanet? Ọ̀ ga-akatali obi zere ihe ọ bụla na-adịghị mma n’Ịntanet?

 Ihe Baịbụl kwuru: ‘Unu ekwesịghịdị ịna-ekwurịta gbasara ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha niile ma ọ bụ anyaukwu. Unu emekwala omume na-eme ihere ma ọ bụ kwuo okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ.’​—Ndị Efesọs 5:3, 4.

 Ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ọ̀ dị mkpa nke otú ahụ?

 Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ịga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet esoghị n’ihe na-eme ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ bụ na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọtụtụ ndị na-eto eto ekpebiela na ha agaghị na-aga ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Ụfọdụ n’ime ndị a na-agabu na ya ma mechaa kpebie na ha agaghịzi na-aga na ya.

 “Mgbe m hụrụ otú ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet si kpaa nwanne m nwaanyị aka ọjọọ, m kpebiri na agaghịzi m na-aga na ya. Kemgbe ahụ, m na-enwezi obi ụtọ karịa otú m na-enwebu, ndụ m enweekwala isi.”​—Nathan. Ọ dị afọ 17.

 Ihe i kwesịrị iburu n’obi: Tupu gị ahapụ nwa gị ka ọ na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, jide n’aka na ọ ga-erubeli isi n’iwu ị ga-enye ya gbasara awa ole ọ ga na-anọ na ya, na ọ ga-emeta ezigbo ndị enyi ebe ahụ, nakwa na ọ ga-ezere ihe ndị na-adịghị mma.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”​—Ilu 14:15.