Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme ma Nnukwu Nsogbu Bịara M?

Gịnị Ka M Ga-eme ma Nnukwu Nsogbu Bịara M?

 Nsogbu nwere ike ịbịara onye ọ bụla. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha.” Ọ sịrị na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” (Ekliziastis 9:11) Ndị na-eto eto sokwa ná ndị nnukwu nsogbu bịarala. Olee ihe nyeere ụfọdụ n’ime ha aka idi nsogbu ndị ahụ? Ka anyị tụlee ihe mmadụ abụọ kwuru.

 REBEKAH

 Mama m na papa m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ iri na anọ.

 M gwara onwe m na ọ bụghị alụkwaghịm ka ha gbara, kama na papa m chọrọ ịnọtụ naanị ya obere oge. Ọ hụrụ mama m n’anya, gịnịkwanụ mere ọ ga-eji hapụ ya, hapụkwa mụnwa?

 O siiri m ike ịkọrọ onye ọ bụla ihe na-emenụ. Achọghị m ịna-eche banyere ya. Iwe nọ na-ewe m, ma amaghị. O meziri ka m na-echegbu onwe m, anaghịkwa m ehi ụra nke ọma.

 Mgbe m dị afọ iri na itoolu, ọrịa kansa gburu mama m. Ọ bụ ezigbo enyi m.

 Alụkwaghịm mama m na papa m gbara wutere m nke ukwuu, ma ọnwụ mama m gbawara m obi. Ọ pụchabeghị m n’ahụ́. Ọ na-esiziri m ike ihi ụra, m ka na-echegbukwa onwe m.

 Ma, e nweela ụfọdụ ihe ndị nyeerela m aka. Dị ka ihe atụ, Ilu 18:1 gwara anyị ka anyị ghara ịna-akpa iche. N’ihi ya, m na-agbalị ịkpa ndị ọzọ nso.

 Ebe m bụ Onyeàmà Jehova, m na-agba mbọ agụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl bụ́ ndị na-agba m ume. Otu n’ime akwụkwọ ndị nyeere m aka mgbe mama m na papa m gbara alụkwaghịm bụ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. M chetara na m gụrụ isiokwu bụ́ “M̀ Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụrụ na M Si n’Ezinụlọ Nwere Naanị Nne Ma Ọ Bụ Nna?” nke dị n’akwụkwọ ahụ Nke 2.

 Otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị kacha nyere m aka ịkwụsị ichegbu onwe m bụ Matiu 6:​25-34. N’amaokwu nke 27, Jizọs jụrụ, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit a n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?”

 O nweghị mgbe nsogbu na-agaghị na-abịara anyị, ma m mụtara n’aka mama m na ihe ka mkpa bụ otú anyị si edi nsogbu ndị ahụ. Ọtụtụ nsogbu bịaara ya. A gbara ya alụkwaghịm, ya adaakwa ajọ ọrịa, ma ọ daghị mbà. Okwukwe ya n’ebe Chineke nọ siri ike ruokwa mgbe ọ nwụrụ. Agaghị m echefu ihe ndị ọ kụziiri m banyere Jehova.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ga-esi nyere gị aka idi nsogbu ndị bịaara gị?​—Abụ Ọma 94:19.

 CORDELL

 Mgbe m gbara afọ iri na asaa, anọ m na-ele papa m anya ya ekubie ume. Ọnwụ ya bụ ihe ọjọọ kacha mee m. Obi gbawara m.

 Ọ dị m ka ọ nwụghị anwụ, nakwa na ọ bụghị papa m ka e kpuchiri ákwà. M gwara onwe m na ọ ga-eteta n’echi ya. Ike ụwa gwụrụ m.

 Mụ na ndị ezinụlọ anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ndị ọgbakọ anyị nyeere anyị ezigbo aka n’oge ahụ papa m nwụrụ. Ha nyere anyị nri, nọnyekwara anyị ruo ogologo oge. Otú ha si nyere anyị aka mere ka obi sie mụ ike na Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst.​—Jọn 13:35.

 Ebe gbara m ezigbo ume na Baịbụl bụ 2 Ndị Kọrịnt 4:​17, 18. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ ezie na mkpagbu ahụ na-adịru nwa oge, dịkwa mfe, ọ na-arụpụtara anyị ebube nke na-adịwanye ukwuu, nke na-adịrukwa mgbe ebighị ebi; ebe anyị lekwasịrị anya, ọ bụghị n’ihe a na-ahụ anya, kama n’ihe a na-adịghị ahụ anya. N’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge, ma ihe a na-adịghị ahụ anya na-adịru mgbe ebighị ebi.”

 Amaokwu nke ikpeazụ ruru m n’obi. Papa m tara ahụhụ naanị nwa oge, ma ihe ndị Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọnwụ papa m mere ka m chebara ihe m ji ndụ m eme echiche, mezie ka m kpebie ihe bara uru m ga-eji ndụ m mee.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú nsogbu bịaara gị nwere ike isi nyere gị aka ichebara ihe ndị i kpebiri iji ndụ gị eme echiche?​—1 Jọn 2:17.

a Otu kubit dị ihe dị ka sentimita iri anọ na ise ma ọ bụ inch iri na asaa na ọkara.