NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Ime Anwansi Ọ̀ Dị Njọ?
Gịnị ka i chere?
È nwere ihe dị njọ n’ịgụ kpakpando, iji bọọdụ e ji agba afa na-agba afa, ma ọ bụ ime anwansi?
Ime anwansi ọ̀ bụ naanị akụkọ gbasara ihe ọma na ihe ọjọọ ka ọ̀ bụ ihe dị njọ mmadụ na-ekwesịghị itinye aka na ya?
Isiokwu a ga-atụle ihe mere ime mgbaasị ji amasị ndị mmadụ, nakwa ihe mere anyị ji kwesị ịkpachara anya.
Gịnị mere o ji amasị ndị mmadụ?
Ndị na-eme egwuregwu na-enweta nnukwu ego n’imepụta fim, egwuregwu tiivi, egwuregwu kọmputa na akwụkwọ ndị na-ekwu banyere anwansi. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji enwe mmasị n’ịgụ kpakpando, ịma gbasara ndị mmụọ ọjọọ, ndị nwụrụ anwụ a sị na ha pụtara na-emenye ndị mmadụ ụjọ. Gịnị mere o ji amasị ndị na-eto eto? Ụfọdụ ihe kpatara ya bụ:
Ịchọ ịmata ihe: Ha na-achọ ịma ma ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ hà dị adị n’eziokwu
Ịchọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu: Ha na-achọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu
Mkpakọrita: Ha na-agbalị iso ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ kwurịta okwu
O nwere ike ihe ndị a mere anwansi ji amasị ha adịghị njọ n’onwe ha. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị njọ mmadụ iche banyere ihe ọdịnihu ya ga-abụ ma ọ bụ agụụ ịhụ onye ya nwụrụ anwụ anya ọzọ ịgụ ya. Ma, e nwere nsogbu mmadụ kwesịrị ịma gbasara ya.
Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya?
Baịbụl dọsiri anyị aka ná ntị ike gbasara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ anyị na mgbaasị. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị:
“A gaghị ahụ n’etiti unu . . . onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.”—Diuterọnọmi 18:10-12.
Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ime mgbaasị adịghị mma?
Ọ bụrụ na anyị na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọrịta ihe, anyị na-akwado ha. Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị mmụọ ozị nupụụrụ Chineke isi ma mee onwe ha ndị iro Chineke. (Jenesis 6:2; Jud 6) A kpọrọ ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi, ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-ejikwa ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, ndị dibịa afa, ndị na-agba afa na ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu eduhie ndị mmadụ. Ime ihe ndị ahụ ga-eme ka anyị na ndị iro Chineke bụrụ enyi.
Ime mgbaasị na-eme ka ndị mmadụ kwere na nkwenkwe ụgha bụ́ na ụfọdụ mmadụ nwere ike ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ọ bụ naanị Chineke nwere ike ikwuli, sị: ‘M na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.’—Aịzaya 46:10; Jems 4:13, 14.
Ime mgbaasị na-eme ka ndị mmadụ kwere na nkwenkwe ụgha bụ́ na ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ nwere ike ikwurịta okwu. Ma, Baịbụl kwuru sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị . . . Ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol.”—Ekliziastis 9:5, 10.
Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova ji agbara ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị ọsọ. Ha anaghịkwa eme egwuregwu ma ọ bụ na-ele fim ndị kwuru gbasara ndị amusu na ndị nwụrụ anwụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria kwuru, sị: “Ọ bụrụ na fim m ji atụrụ ndụ nwere ihe ndị jikọrọ ya na mgbaasị, ekwesịghị m ile ya.” a
Ihe i nwere ike ime
Kpebisie ike na ị ‘ga-enwe akọ na uche dị ọcha’ n’ihu Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ izere ihe ọ bụla ma ọ bụ ihe e ji atụrụ ndụ ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na anwansi.—Ọrụ Ndịozi 24:16.
Bibie ihe ọ bụla i nwere nke nwere ihe jikọrọ ya na anwansi. Gụọ Ọrụ Ndịozi 19:19, 20 ma chọpụta ihe Ndị Kraịst dịrị ndụ n’oge ndịozi mere, nke anyị kwesịkwara ime.
Cheta: Ọ bụrụ na i zere ime anwansi na ihe e ji atụrụndụ nwere ihe jikọrọ ya na anwansi, ọ na-egosi na ị na-akwado Jehova. Nke a na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.
a Nke a apụtaghị na akụkọ ifo niile nwere ihe jikọrọ ha na ime mgbaasị. Ma, Ndị Kraịst na-eji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ ezere ime ihe ọ bụla ma ọ bụ ntụrụndụ ọ bụla nwere ihe jikọrọ ha na mgbaasị.—2 Ndị Kọrịnt 6:17; Ndị Hibru 5:14.