Gaa n'Isiokwu

Olee Ihe M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ile Ndị Gba Ọtọ Eriela M Ahụ́?

Olee Ihe M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ile Ndị Gba Ọtọ Eriela M Ahụ́?

Ihe i nwere ike ime

 Ghọta otú Chineke si were ile ndị gba ọtọ. N’eziokwu, ile ndị gba ọtọ bụ iji ihe Chineke kere ka a na-akwanyere ùgwù mere ihe egwuregwu. Ọ bụrụ na ị ghọta ya otú a, ọ ga-enyere gị aka ịkpọ “ihe ọjọọ asị.”—Abụ Ọma 97:10.

 Chebara nsogbu ọ na-akpata echiche. Ndị a na-egosi na fim ndị gba ọtọ na-ere ùgwù ha. Onye na-ele ha na-erekwa ùgwù ya. Baịbụl kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.”—Ilu 22:3.

 Gị na anya gị gbaa ndụ. Job bụ́ nwoke ji obi ya niile fee Chineke, sịrị: “Mụ na anya m agbaala ndụ; na agaghị m ele nwa-agbọghọ na-amaghị nwoke anya ịkwa iko.” (Job 31:1, Bible Nsọ Ọhụụ) Lee ihe ụfọdụ i nwere ike ikpebi ime:

  •  Agaghị m aga n’Ịntanet mgbe naanị m nọ.

  •  M nọrọ n’Ịntanet ihe na-adịghị mma apụta, m ga-emechi ya ozugbo.

  •  Ọ bụrụ na mụ elee ndị gba ọtọ ọzọ, m ga-akọrọ ya dimkpa mụ na ya dị ná mma.

Ile foto ndị gba ọtọ na-eri mmadụ ahụ́. Ka mmadụ na-ele ya, otú ahụ ka ọ na-esikwuru ya ike ịkwụsị ya

 Rịọ Chineke ka o nyere gị aka. Otu ọbụ abụ rịọrọ Jehova Chineke arịrịọ, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.” (Abụ Ọma 119:37) Chineke achọghị ka ị na-ele ndị gba ọtọ. Ị rịọ ya, ọ ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ile ya!—Ndị Filipaị 4:13.

 Kọọrọ ya mmadụ. Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ ịkọsara ya onye ị ma na ọ ga-enyere gị aka ịkwụsị ile ya.—Ilu 17:17.

 Cheta na mgbe ọ bụla ị jụrụ ile ndị gba ọtọ, i meriela Ekwensu. Kelee Jehova maka otú o si nyere gị aka imeri Ekwensu. Ọ bụrụ na ị naghị ele ndị gba ọtọ, obi ga na-atọ Jehova ụtọ!—Ilu 27:11.