Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere Papa M na Mama M Anaghị Ekwe M Kporie Ndụ?

Gịnị Mere Papa M na Mama M Anaghị Ekwe M Kporie Ndụ?

 Ndị enyi gị kpọrọ gị ka unu gaa oriri na nkwari ná ngwụcha izu a. Gị ajụọ papa gị na mama gị ma ì nwere ike ịga, ha asị gị “Mba.” Ihe a ha zara gị ejughị gị anya maka na ọ bụ ihe ha zakwara gị n’oge gara aga.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Gịnị mere papa m na mama m anaghị ekwekarị m mee ihe m chọrọ ime?

 Ọ bụrụ na ọ dị gị ka papa gị na mama gị anaghị ekwe gị mee ihe ị chọro ime, i nwere ike ịna-eche na ha achọghị ka ị na-ekpori ndụ.

 Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na-asaa aha ya bụ Marie nọ na-eche otú ahụ mgbe a zụtaara ya ekwentị ọhụrụ. Ọ sịrị: “Papa m nyere m ọtụtụ iwu. Ọ gwara m ihe ndị m ga-etinye n’ekwentị m, ndị mụ na ha ga-eji ya na-akparịta, nakwa awa ole mụ na ha ga na-akparịta. Ma, ndị enyi m nwere ike iji ekwentị nke ha eme ihe ọ bụla dị ha mma.”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ̀ bụ eziokwu na papa Marie achọghị ka o kporie ndụ? Olee ihe ndị nwere ike ịbụ ihe ndị na-echegbu ya?

Ihe a na-edewe n’ụzọ iji gosi kilomita ndị na-agba n’ụzọ na-agaghị agbafe nwere ike igbochi mmadụ ife ọsọ otú ọ chọrọ, ma o nwere ike ime ka mmadụ ghara inwe ihe mberede; otú ahụ ka iwu nne na nna na-enye dị, ha nwere ike igbochi mmadụ ime ihe ụfọdụ, ma ha na-eme ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu

 Megodị ihe a: Weregodị ya na bụ nne ma ọ bụ nna nakwa na nwa gị na-eto eto ka nwetara ekwentị ọhụrụ. Gịnị ga na-echegbu gị? Olee iwu ndị ga-enye ya ka o wee ghara ịbanye ná nsogbu? Gịnị ka ga-ekwu ma nwa gị kwuo na ị chọghị ka ọ kporie ndụ?

 “Papa m na-agwakarị m, sị, ‘Were ya na ị bụ nne ma ọ bụ nna.’ Ime ihe a nyeere m aka ịghọta uru iwu ndị ọ na-enye m bara nakwa ihe mere o ji enye ha. M mụta ụmụ, m ga-achọ ka ha debe iwu ndị ahụ papa m chọrọ ka mụnwa debe.”​—Tanya.

 Olee ihe m ga-eme ka ha kweta ka m mee ihe m chọrọ ime?

 Emela ihe a: Ewewala ime, na-eme mkpesa, ma ọ bụ na-arụ ha ụka.

 “O nweghị uru ịbawa mba bara, ọ ga-emekwa ka ike gwụ ma gịnwa ma ndị mụrụ gị. Ị rụwa ụka, ndị mụrụ gị ga-ewere ya na ị ka bụ nwata, ha ga-echekwa na i rubeghị ka ha hapụ gị ka ị na-apụ apụ.”​—Richard.

 Mee ihe a: Azaghachila ha ozugbo. Kama, gbalịa ghọta otú obi dị papa gị na mama gị. Jụọ onwe gị ma nsogbu ọ̀ bụ na ha atụkwasịghị gị obi, ka ọ̀ bụ na ha amaghị ihe ga-eme n’ebe ị chọrọ ịga, ka ọ̀ bụkwanụ na ha amaghị ndị ị na-agakwuru? Ọ ga-aka mma ka i wetuo obi gaa ka gị na ha kwuo banyere ya, ka i nwee ike ịghọta ihe mere ha ji jụ na ị gaghị aga.

 “A na-enwerịrị ezigbo ihe mere papa m na mama m ji enye m iwu. Ha anaghị enye m iwu iji gbochie m ikpori ndụ, kama, ha chọrọ ka m kporie ndụ otú kacha mma, ya bụ, mkpori ndụ na-agaghị akpatara m nsogbu.”​—Ivy.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Onye nzuzu na-ewe iwe ruo n’isi, ma onye ma ihe na-ejide onwe ya.”​—Ilu 29:11.

 Emela ihe a: Enupụrụla papa gị na mama gị isi ma zoro ezoro gaa.

 “M na-ezoro ezoro mee ihe ndị papa m gwara m ejila ekwentị m eme. M na-ezigara ndị enyi m ozi n’ime abalị, na-etinyekwa ihe ndị papa gwara m etinyela n’ekwentị m. Ma e mechaa, ọ na-amata ihe m mere, ya enyekwuo m ọtụtụ iwu ọzọ maka na ọ tụkwasịzịghị m obi. Mmadụ izoro ezoro na-eme ihe a gwara ya emela abaghị uru.”​—Marie.

 Mee ihe a: Gosi ndị mụrụ gị na ị ga-edebli iwu ha nyere gị ka ha wee tụkwasị gị obi.

 “Nwee ndidi. O nwere ike iwetụ oge tupu papa gị na mama gị agbanwetụ iwu ha nyere gị, ma ọ bụrụ na ha hụ na ị na-edebe iwu ha nyere gị, ha nwere ike ịhapụ gị ka ị na-eme ihe ụfọdụ ị chọrọ ime.”​—Melinda.

 Ihe Baịbụl kwuru: ‘Na-erubere ndị mụrụ gị isi n’ihe niile.’​—Ndị Kọlọsi 3:20.

 Emela ihe a: Amanyela ndị mụrụ gị ikweta ka i mee ihe ị chọrọ, dị ka ịgwawa ha ihe a na-ekwe ụmụaka ibe gị ndị ọzọ ka ha mee.

 “Isi ọnwụ agaghị abara gị uru, ọ gaghịkwa eme ka i nweta ihe ị chọrọ.”​—Natalie.

 Mee ihe a: Dejuo akwụkwọ e ji edetu ihe bụ́ “Chebara Iwu E Nyere Gị Echiche” ka o nyere gị aka ịma otú gị na ndị mụrụ gị ga-esi ekwurịta ihe ị chọrọ ime.

 “Nne na nna ọ bụla chọrọ ka nwa ha na-eche echiche ọfụma. N’ihi ya, m gwawa papa m na mama m okwu, m na-agbalị ịgwa ha ihe mere m ji chọọ ime ihe ahụ kama ikwuwe otú obi ga-adị m ma m mee ya. Oge ụfọdụ m mere ihe a, ha na-ekwe m mee ihe ahụ m chọrọ.”​—Joseph.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Sọpụrụ nne gị na nna gị.”​—Ndị Efesọs 6:2.