Gaa n'Isiokwu

Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1

Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1

‘Olee otú m ga-esi na-agwa ndị mụrụ m okwu?’ ‘Olee otú m ga-esi emeta ndị enyi?’ ‘Ọ̀ dị njọ ma ndị na-abụghị di na nwunye nwee mmekọ nwoke na nwaanyị?’ ‘Gịnị mere obi ji ajọkarị m njọ?’

Ọ bụrụ na ị jụtụla onwe gị ụdị ajụjụ ndị ahụ, echekwala na ị jụwaala ọnụ. Ị jụọ ha ndị mmadụ, ihe onye nke mbụ ga-agwa gị nwere ike ịdị iche n’ihe onye nke abụọ ga-agwa gị. Ị ga-amata azịza ajụjụ ndị ahụ ma ị gụọ akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1. Ndụmọdụ ndị dị na ya si na Baịbụl, ha ga-abakwara gị ezigbo uru ná ndụ. Baịbụl enyerela ọtụtụ ndị aka imeri nsogbu ndị na-abịara ha. Gụọ akwụkwọ a ka ị hụ aka ọ ga-enyere gị.

Nkebi ndị dị n’akwụkwọ a bụ:

  • Gị na Ndị Ezinụlọ Unu

  • Ihe Gbasara Naanị Gị

  • N’Ụlọ Akwụkwọ na n’Ụlọ

  • Mmekọahụ, Omume Ọma, na Ịhụnanya

  • Àgwà Ndị Ga-akpatara Gị Nsogbu

  • Oge I Ji Ezu Ike

  • Ofufe Ị Na-efe Chineke

  • Isiokwu Ndị Ọzọ Maka Ndị Nne na Nna

I nwere ike ịdanlodu nke PDF ya, ma ọ bụkwanụ gị edetara alaka ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ka ha zitere gị nke e biri ebi.

Ihe Ị Ga-eburu n’Obi: PDF akwụkwọ a nwere ebe mmadụ nwere ike ide ihe. Ọ bụrụ na ị ga-ejili ekwentị gị ma ọ bụ kọmpụta gị mepee PDF ahụ ma dee ihe na ya, i nwere ike idenye ihe ọ bụla masịrị gị n’ime ya.