Nkà na Ụzụ
Ọ bụrụ na i nwere ekwentị na-aga n’Ịntanet ma ọ bụ ihe ndị yiri ya, i nwere ike ị nọ na-apị ha ọtụtụ awa nke na ị gaghị ama mgbe oge gara. Olee otú ị ga-esi na-ekpebi awa ole ị ga na-apị ya?
Electronic Devices
Egwuregwu Ndị M Na-egwu na Kọmputa Na n’Ekwentị
Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịma ma egwuregwu ndị ị na-egwu na kọmputa na n’ekwentị hà dị mma.
Gị na Egwuregwu Vidio, Ònye Na-emeri Ibe Ya?
Egwuregwu vidio nwere ike ịna-atọ gị ụtọ. Ma, o nwekwara ike ịkpatara gị nsogbu. Olee otú ị ga-esi zere nsogbu ndị o nwere ike ịkpata ma ghọọ onye mmeri n’ìhè?
Gị na Ekwentị Gị Ònye Nwe Ibe Ya?
N’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa nkà na ụzụ, i kwesịghị ikwe ka ekwentị na-achị gị. Olee otú ị ga-esi ama ma ò riela gị ahụ́? Oleekwa ihe ị ga-eme maka ya?
Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ ma M Jiri Ekwentị Zigara Mmadụ Ozi?
Chọpụta otú ozi i zigaara mmadụ nwere ike isi mee ka gị na ya see, na otú o nwere ike isi mee ka i nwee aha ọjọọ.
Ihe Ị Ga-eme ma E Zitere Gị Ozi n’Ekwentị
Ị sị mmadụ ya chere ka ị gụọ ozi e ziteere gị, ọ̀ dị njọ? Ọ bụrụ na ị hapụ ozi ahụ, gị na enyi gị ana-ekwu ihe unu na-ekwu, ọ̀ dị njọ?
Social Media
Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet
Lee katuun a ka ị mata otú ị ga-esi zere nsogbu ma ị nọrọ n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet.
Mmadụ Ịna-agba Mbọ Ka A Mara Ya Amara n’Ịntanet Ọ̀ Bara Uru?
Ụfọdụ ndị na-eme ihe nwere ike ịta isi ha naanị ka ha nwee ọtụtụ ndị na-achọ ịhụ ihe ndị ha na-etinye n’Ịntanet ma ọ bụ ọtụtụ ndị ihe ha tinyere na-amasị. Ịbụ onye a ma ama n’Ịntanet ò ruru ịgbara ụdị mbọ a?
Hidden Dangers
Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?
Ọ̀ bụ eziokwu na ị ga-emeli ọtụtụ ihe n’otu oge ma tinyechaa uche na nke ọ bụla?
Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?
Lee ebe atọ ekwentị na ihe ndị yiri ya nwere ike isi mee ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme. Mụtakwa ihe ị ga-eme ka uche gị nwee ike ịna-adị n’otu ihe.
Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị
Ekwetela ihe ọ bụla ị nụrụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ị gụrụ. Mụta otú ị ga-esi na-amata nke bụ́ akụkọ ụgha.