Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Ndịàmà Jehova Na-eso Ma A Bịa n’Ihe Mmadụ Gwara Ha Gbasara Onwe Ya
Ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile anaghị akọsasị ihe mmadụ gwara ha gbasara onwe ya ma ọ bụ ihe onye ahụ na-achọghị ka ndị ọzọ mara. Ha ma na ọ dị mkpa ka ha gwa mmadụ hoo haa ihe ha chọrọ iji ihe ọ gwara ha eme nakwa ka onye ahụ kwuo ihe bụ́ eziokwu banyere onwe ya ka o nyere ha aka n’ọrụ ha na-arụ iji lekọta ụmụnna ha nakwa iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Ma, ha makwa na ha ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ ihe mmadụ gwara ha nakwa na ha kwesịrị ichekwa ihe ndị ahụ nke ọma ka ndị ọzọ ghara ịhụ ha. (Ilu 15:22; 25:9) Anyị anaghị anwa anwa kọsasịwa ihe mmadụ gwara anyị banyere onwe ya.—Ilu 20:19.
Mba dị iche iche emeela iwu ndị kwuru na e kwesịghị ịkọsara ọhaneze ihe mmadụ kwuru gbasara onwe ya n’anataghị onye ahụ ikike. Mana, tupudị e mee iwu ndị a, a ma Ndịàmà Jehova na alaka ụlọ ọrụ ha dị iche iche ama na ha anaghị akọrọ onye ọzọ ihe mmadụ kwuru gbasara onwe ya n’anataghị onye ahụ ikike. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova ga-anọgidekwa na-echekwa ihe ọ bụla mmadụ gwara ha ka ndị ọzọ ghara ịma banyere ya dị ka ha na-eme kemgbe ụwa.
Iwu Ndị Ahụ Anyị Na-eso. Ihe ndị e dere n’okpuru ebe a bụ ihe ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-eso ma a bịa n’ihe gbasara ihe mmadụ kwuru gbasara onwe ya:
Anyị lebawa anya n’ihe mmadụ gwara anyị gbasara onwe ya, anyị ga-eme ya n’ụzọ iwu kwadoro.
Anyị agaghị eji ihe mmadụ gwara anyị mee ihe ọzọ na-abụghị ihe ndị dị mkpa anyị na-eme n’ọgbakọ anyị nakwa ihe ndị anyị na-eme iji nyere ndị mmadụ aka.
Anyị agaghị agbanwe ihe ọ bụla n’ihe mmadụ gwara anyị gbasara onwe ya. Anyị ga-etinyekwa ihe ọhụrụ ọ bụla onye ahụ gwara anyị. E nwee ihe ọ bụla anyị dehiere, anyị ga-edezi ya ozugbo anyị matara banyere ya.
Ọ bụrụ na ihe mmadụ kwuru banyere onwe ya adịghịzi anyị mkpa, anyị ga-ewepụ ya.
Anyị ga-akpachapụ anya ka anyị ghara ime ihe ọ bụla onye gwara anyị gbasara onwe ya na-achọghị ka anyị jiri ihe ndị ọ gwara anyị mee.
Anyị ga-eme ihe niile anyị kwesịrị ime ka anyị chekwaa ihe mmadụ gwara anyị banyere onwe ya ka onye na-ekwesịghị ịhụ ya ghara ịhụ ya. Kọmputa ọ bụla anyị tinyere ihe mmadụ gwara anyị na-enwe paswọd e ji akpọchi ya. Ọ bụkwa naanị ndị e nyere ikike ịbanye na kọmputa ndị ahụ ka e nyere paswọd ndị ahụ. A na-agbachikwa ọfịs anyị dị iche iche agbachi ma ọrụ gbasaa. Ọ gwụla ndị e nyere ikike nwere ike ịbanye na ha.
Anyị agaghị ezigara alaka ụlọ ọrụ anyị ọzọ ihe mmadụ gwara anyị gbasara onwe ya, ọ gwụkwala ma ọ̀ dị mkpa iji mee ihe ndị anyị na-eme n’ọgbakọ anyị nakwa iji nyere ndị mmadụ aka. Ndịàmà Jehova niile kwetara ihe a n’ihi na ha ji obi ha niile kpebie ịbụ Ndịàmà Jehova.
Ihe asaa ndị a ka anyị na-eburu n’obi ma e nwee ihe anyị chọrọ iji ihe mmadụ gwara anyị gbasara onwe ya mee. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka e kwuru n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova. A na-enye ya Onyeàmà Jehova ọ bụla mgbe ọ ghọrọ onye nkwusa. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, gụọ akwụkwọ ahụ aha ya bụ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.
Ndịàmà Jehova kwetara na mmadụ nwere ikike ikwu na ọ chọghị ka ndị ọzọ mara banyere ihe ọ gwara anyị gbasara onwe ya, ma ọ bụ na ọ chọrọ ka e dezigharịa ihe ahụ, ma ọ bụkwanụ na ọ chọrọ ka e wepụ ihe ahụ kpamkpam. Ọ bụ ya bụ ihe e kwuru n’isiokwu a na-akpọ Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Banyere Ihe A Ga-eji Ihe Mmadụ Kwuru Gbasara Onwe Ya Mee, n’okpuru ebe e dere Ihe Ndị I Nwere Ikike Ime.
Ihe niile e kwuru ebe a bụ ihe Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-eme ma a bịa n’ihe mmadụ gwara ha banyere onwe ya.