Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?
Ì chere na . . .
-
ọ ga-adịgide otú a ọ dị?
-
ọ ga-aka njọ?
-
ọ ga-aka mma?
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile dị ụmụ mmadụ n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.’—Mkpughe 21:3, 4.
OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?
Ị ga na-arụ ọrụ ị na-agaghị atakwute ájá, ị ga-arụpụtakwa ihe bara uru.—Aịzaya 65:21-23.
Ị gaghịzi na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-ata ahụhụ.—Aịzaya 25:8; 33:24.
Obi ga-adị gị na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ụtọ, unu agaghịkwa anwụ anwụ.—Abụ Ọma 37:11, 29.
Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?
Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:
-
Chineke ga-emezuli nkwa o kwere. Ọ bụ naanị Jehova ka Baịbụl kpọrọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 15:3) Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na ọ ga-emerịrị ka ụwa anyị a ka mma otú ahụ o kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile kwere Chineke omume.”—Matiu 19:26.
-
Ọ na-agụ Chineke agụụ imezu nkwa o kwere. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.—Job 14:14, 15.
Baịbụl kwukwara na mgbe Ọkpara Chineke bịara n’ụwa, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ chọrọ. (Mak 1:40, 41) Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. Otú ahụ ọ chọrọ inyere ndị ụwa na-ara ahụ́ aka ka Nna ya chọkwara.—Jọn 14:9.
Ọ bụ ya mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova na Jizọs chọrọ ime ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu.—Abụ Ọma 72:12-14; 145:16; 2 Pita 3:9.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Olee otú Chineke ga-esi eme ka ụwa anyị a ka mma?
Ị gụọ MATIU 6:9, 10 na DANIEL 2:44, ị ga-amata azịza ya.