Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ịṅụ Sịga?
ISI NKE 33
Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ịṅụ Sịga?
Legodị anya n’ihe ndị e dere ebe a ma kanye ✔ n’igbe nke ọ bụla kwuru otú ọ dị gị.
□ M chọrọ ịma otú ọ na-adị
□ M chọrọ ime ka obi dị mụ mma
□ M chọrọ ime ka ụmụaka ibe m
□ Achọghị m ibu ibu
* Dị ka ihe atụ:
Ọ BỤRỤ na e nwere igbe ị kanyere ihe na ya na peeji nke 237, ọ pụtara na e nwere ihe jikọrọ gị na ndị na-eto eto ibe gị ndị na-aṅụ sịga ma ọ bụ ndị chetụrụla echiche ịṅụ ya.Ịma otú ọ na-adị. “Anọ m na-eche otú ịṅụ sịga na-adị. N’ihi ya, otu ụbọchị, anaara m otu nwa agbọghọ n’ụlọ akwụkwọ anyị sịga o nyere m ma zoro ezoro ṅụọ ya.”—Tracy.
Ime ka obi dị gị mma na ime ka ụmụaka ibe gị. “Ụmụ akwụkwọ ibe m na-asịkarị, ‘Ahụ́ m chọrọ sịga.’ Ha ṅụchaa, ha asị, ‘Ehee, enwetala m onwe m!’ N’ihi ya, ọ bụrụ na obi adịghị mụ mma, ịṅụ sịga agụwa m.”—Nikki.
Ị chọghị ibu ibu. “Ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-aṅụ sịga ka ha ghara ibu ibu. Ọ dịịrị ha mfe ịṅụ sịga karịa iri nri ga-eme ka ha ghara ibu ibu!”—Samantha.
Ma tupu i bido ịṅụ sịga ma ọ bụ tupu ị ṅụọ sịga ọzọ, chegodị echiche. Emela ka azụ̀ nke na-atụrụ nri dị na nkò e ji egbute azụ̀. N’eziokwu, azụ̀ ahụ nwere ike iri nri ahụ, ma ọ ga-ata isi ya! Kama ime ka azụ̀ ahụ, mee ihe Baịbụl kwuru, jirikwa ‘ezi ikike iche echiche gị’ mee ihe i kwesịrị ime. (2 Pita 3:1) Zaa ajụjụ ndị a.
Gịnị Ka Ị Ma Banyere Ịṅụ Sịga?
Dee eziokwu ma ọ bụ ụgha na nke ọ bụla n’ahịrịokwu ndị a.
a. Ịṅụ sịga ga-eme ka m ghara ịna-eche oké echiche.
□ Eziokwu □ Ụgha
b. M ṅụọ sịga, ọ na-afọ obere ka m kupụchaa anwụrụ ọkụ ya niile.
□ Eziokwu □ Ụgha
ch. Ọ bụ mgbe m mere agadi ka sịga ga-eme m ihe, ọ bụghị ugbu a.
□ Eziokwu □ Ụgha
d. Ọ ga-eme ka ihe m masịwa ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m.
□ Eziokwu □ Ụgha
e. M ṅụọ sịga, ọ gaghị akpatara onye ọzọ nsogbu.
□ Eziokwu □ Ụgha
f. Chineke achọghị ịma ma m̀ na-aṅụ sịga ma ọ bụ na anaghị m aṅụ.
□ Eziokwu □ Ụgha
Azịza
a. Ụgha. Onye na-aṅụ sịga chọọ ịkwụsị ya, e nwere otú ahụ́ ga na-eme ya. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike inwetatụ onwe ya mgbe ọ bụla ọ ṅụrụ sịga, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na nikotin, bụ́ ihe na-adị na sịga, na-eme ka onye ahụ chegbuwekwuo onwe ya.
b. Ụgha. Ihe ụfọdụ a chọpụtara gosiri na e kee ihe na-akpata ọrịa dị n’anwụrụ ọkụ sịga mmadụ kuuru ụzọ iri, naanị ihe na-erughị ụzọ abụọ ka ọ na-ekupụ.
ch. Ụgha. Sịga ọ bụla mmadụ ṅụrụ ga-akpatara ya nsogbu n’ọdịnihu, ma e nwere nsogbu ndị ọ na-akpatara onye ahụ ozugbo. Naanị otu mkpụrụ sịga ụfọdụ ndị ṅụrụ nwere ike ime ka ịṅụ sịga rie ha ahụ́. Ịṅụ sịga na-eme ka ikuku nke na-abanye n’akpa ume mmadụ dị obere, nweekwa ike ime ka onye ahụ na-akwa ụkwara mgbe niile, akpụkpọ ahụ́ ya adị ka nke onye kara nká. O nwekwara ike ime ka ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, obi ana-amapụkarị ya, na-ajọkarịkwa ya njọ.
d. Ụgha. Otu ọkachamara aha ya bụ Lloyd Johnston
chọpụtara na ‘ọtụtụ ụmụ agbọghọ anaghị enwe mmasị n’ụmụ okorobịa ndị na-aṅụ sịga. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ụmụ okorobịa.’e. Ụgha. Kwa afọ, anwụrụ ọkụ sịga ndị ọzọ na-aṅụ na-egbu ọtụtụ puku ndị na-anaghị aṅụ sịga; ọ ga-akpatara ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị nsogbu.
f. Ụgha. Ndị niile chọrọ ime ihe dị Chineke mma kwesịrị ịsachapụ onwe ha “mmerụ niile nke anụ ahụ́.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) O doro anya na sịga na-emerụ ahụ́ mmadụ. I kpebie ịna-emerụ onwe gị, ya bụ, iji sịga na-akpatara onwe gị na ndị ọzọ nsogbu, i nweghị ike ịbụ enyi Chineke.—Matiu 22:39; Ndị Galeshia 5:19-21.
Otú Ị Ga-esi Jụ Ya
Gịnịzi ka ị ga-eme ma mmadụ nye gị sịga ka ị ṅụọ? Onye ahụ nwere ike ịhapụ gị ma i kwusie okwu ike, sị ya, “Mba, anaghị m aṅụ sịga.” Onye ahụ siwe ọnwụ ma ọ bụ chịwa gị ọchị, cheta na ọ bụ gị kpebiri na ị gaghị aṅụ sịga. I nwere ike ịsị ya:
● “Achọpụtara m nsogbu sịga na-akpata, ma kpebie na achọghị m ya.”
● “Achọbeghị m ịnwụ, o nwere ihe ndị dị mkpa m ka chọrọ ime.”
● “Ị̀ na-ekwu na mụ enweghịzi ike ikpebi ihe m ga-eme?”
Dị ka ndị na-eto eto e dere ihe ha kwuru ná mmalite isiokwu a, i nwere ike ịchọpụta na ọ bụ obi gị kacha agwa gị ṅụọ sịga. Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike imeri nsogbu ahụ ma i chebara ajụjụ ndị a echiche:
● ‘Ò nwedịrị uru ịṅụ sịga ga-abara m? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mụ aṅụwa sịga n’ihi na m chọrọ ka mụ na ndị na-aṅụ sịga dị ná mma, ànyị ga-adị ná mma ma e nwee ihe ndị ọzọ ha na-eme mụnwa na-anaghị eme? Ndị m chọrọ ka mụ na ha dị ná mma ọ̀ bụ ndị ga-ahụ ka m na-eme ihe ga-akpatara m ọrịa, obi adị ha ụtọ?’
● ‘Ego ole ka ịṅụ sịga ga na-efu m? Olee ọrịa ndị o nwere ike
ịkpatara m? Ọ̀ ga-eme ka m ree ùgwù m?’● ‘Obi ọ̀ ga-adị m ụtọ ma ịṅụ sịga mee ka mụ na Chineke ghara ịdị ná mma?’
Ọ bụrụkwanụ na ịṅụ sịga eriela gị ahụ́, olee otú ị ga-esi akwụsị ya?
Otú Ị Ga-esi Akwụsị Ya
1. Ghọta ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ya. Dee ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ya, na-agụgharịkwa ihe ndị ahụ i dere mgbe niile. Ị chọọ ịdị ọcha n’anya Chineke, ị ga-agbalị kwụsị ya.—Ndị Rom 12:1; Ndị Efesọs 4:17-19.
2. Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga na nzuzo, ugbu a ka i kwesịrị ịgwa ya ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Gwa ndị ahụ ị na-ezoro ya na ị chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, gwakwa ha na ị chọrọ ka ha nyere gị aka. Ị chọọ ife Chineke, rịọ ya ka o nyere gị aka ịkwụsị ya.—1 Jọn 5:14.
3. Kpebie ụbọchị ị ga-akwụsị ya. Gwa onwe gị na ị ga-akwụsị ya n’ihe dị ka izu abụọ. Kanyezie ihe na kalenda gị n’ụbọchị i kpebiri na ị ga-akwụsị ya. Gwa ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị na ị ga-akwụsị ịṅụ sịga n’ụbọchị ahụ.
4. Chọọ sịga ndị fọrọnụ ma tụfuo ha. Tupu ụbọchị ahụ
i kpebiri ịkwụsị ya eruo, chọọ nke ọma ma è nwere sịga i dewere n’ime ụlọ gị, n’ụgbọala gị, nakwa n’akpa uwe gị. Tụfuo ha niile, tụfuokwa ihe i ji amụnye sịga ọkụ nakwa ihe i ji etinye ntụ sịga.5. Mata otú ị ga-esi die otú ahụ́ na-eme mmadụ ma ọ chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga. Na-aṅụ nnukwu mmiri ma ọ bụ juus, na-ehikwu ụra. Buru n’obi na otú ahụ ahụ́ na-eme gị agaghị adịte aka, ma uru ị ga-erite ga-adịte aka!
6. Zere ihe ndị nwere ike ime ka sịga gụwa gị. Agala ebe ga-eme ka sịga gụwa gị, zerekwa ihe ga-eme ka ọ gụwa gị. Gị na ndị na-aṅụ sịga kwụsị ịkpa.—Ilu 13:20.
Ekwela Ka A Ghọgbuo Gị
Kwa afọ, ndị na-emepụta sịga na-eji ọtụtụ ijeri naịra akpọsa ngwá ahịa ha. Olee ndị ha bụ n’obi emepụta ya? Otu ụlọ ọrụ na-emepụta sịga dere, sị: “Ọ bụ ndị na-eto eto taa ga na-azụ sịga n’ọdịnihu.”
Ekwela ka ndị na-emepụta sịga na-eri ego gị. Ì kwesịrị ikwe ka ha rata gị? Ha na ndị ọgbọ gị ndị na-aṅụ sịga anaghị echere gị echiche ọma. Kama ige ha ntị, gee ntị na ndụmọdụ Chineke nyere na Baịbụl ma “baara onwe gị uru.”—Aịzaya 48:17.
Ndị enyi gị hà na-agwa gị ka ị ṅụọ mmanya na-aba n’anya? Mụta ihe mere ị ga-eji mara ebe i kwesịrị ịṅụru ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Ọ bụ eziokwu na isiokwu a kwuru banyere ndị na-aṅụ sịga, nsogbu ndị e kwuru na sịga na-akpatara ndị na-aṅụ ya gbasakwara ndị na-ata ahịhịa anwụrụ ma ọ bụ na-akpọ ụtaba.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Zere ihe ọ bụla na-eme ka ahụ́ anyị . . . ghara ịdị ọcha.”—2 Ndị Kọrịnt 7:1, Contemporary English Version.
NDỤMỌDỤ
Echela echiche na-ezighị ezi, dị ka iche, sị, ‘M ga-aṅụrụtụ ya naanị otu ugboro.’ I chee otú ahụ, o nwere ike ime ka ị malitekwa ịṅụ sịga.—Jeremaya 17:9.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ahịhịa anwụrụ na ụtaba nwere nikotin karịa sịga, nweekwa ihe na-akpata ọrịa kansa akpịrị na ọrịa kansa ọnụ karịa sịga.
IHE M GA-EME!
Nwa akwụkwọ ibe m gwa m ka m ṅụọ sịga, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere sịga nwere ike iji na-agụ gị n’agbanyeghị na ị ma nsogbu o nwere ike ịkpatara gị?
● Gịnị mere i ji kwetasie ike na ịṅụ sịga adịghị mma?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 240]
“Mmadụ nye m sịga, m na-amụmụ ọnụ ọchị ma sị ya, ‘Mba, achọghị m ịrịa ọrịa kansa.’”—Alana
[Igbe/Foto dị na peeji nke 241]
Ịṅụ Wii Wii Ọ̀ Dịkwanụ Njọ Otú Ahụ?
Otu nwaanyị aha ya bụ Ellen nke bi n’Ayaland kwuru, sị: “Ụfọdụ sịrị na ịṅụ wii wii na-enyere ha aka idi nsogbu ha, nakwa na o nweghị ihe ọ na-eme mmadụ.” Ị̀ nụla ka e kwuru ụdị ihe ahụ? Tụlee ụfọdụ ihe ndị mmadụ chere banyere wii wii na ihe bụ́ eziokwu banyere ya.
Ụgha. O nweghị ihe wii wii na-eme mmadụ.
Eziokwu. Nsogbu wii wii nwere ike ịkpata bụ: ichefukarị ihe, amụtaghị ihe ngwa ngwa, ibute ọrịa n’egbughị oge, ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị agaghị na-arụ ọrụ nke ọma. O nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya, gbaa ara, ma na-atụ ụjọ na a ga-egbu ya. Nwaanyị na-aṅụ wii wii mụọ nwa, nwa ya nwere ike ịna-akpa àgwà ọjọọ, uche ya agaghị na-adịcha n’ihe a na-akụziri ya, ikpebi ihe ga na-esikwara ya ike.
Ụgha. Anwụrụ ọkụ wii wii adịghị njọ ka nke sịga.
Eziokwu. Nsí anwụrụ ọkụ wii wii na-ebunye mmadụ n’akpịrị ji okpukpu anọ karịa nke anwụrụ ọkụ sịga. Anwụrụ ọkụ ọjọọ dị na wii wii nwere ike ịbanye mmadụ n’ọbara okpukpu ise karịa nke sịga. Mmadụ ṅụọ wii wii ise, ihe na-akpata ọrịa kansa o nwere ike ibunye ya ga-eru nke otu mkpọ̀ sịga.
Ụgha. Wii wii anaghị eri mmadụ ahụ́.
Eziokwu. Ọ naghị esiri ụmụaka ndị ihe na-emetụ n’isi ma ọ bụ ndị obi na-anaghị adị mma ike ịghọ ndị wii wii riri ahụ́. Wii wii nwere ike iri ụmụaka ndị ọzọ ahụ́ ma ha ṅụọ ya ogologo oge. Ihe a chọpụtara bụ na ọ na-akara ụmụaka ndị na-aṅụ wii wii mfe ịmalite ịṅụ ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ na-eri mmadụ ahụ́, dị ka koken.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 244, 245]
Ihe Sịga Na-eme Ahụ́ Gị
Chegodị banyere ndị a na-egosi mgbe a na-akpọsa sịga; jirizie ha tụnyere ihe sịga na-eme ahụ́ gị.
Ọnụ na akpịrị O nwere ike ịkpata ọrịa kansa
[Foto]
Ire ọrịa kansa na-arịa
Obi Na-esi ike, akwara adị obere, obi agaghị enweta ezigbo ikuku, o nwere ike ịkpata ọrịa obi okpukpu anọ karịa nke onye na-anaghị aṅụ ya
[Foto]
Akwara sụchiri asụchi
Akpa ume Ọ na-emebi akpa ume, mee ka ebe ikuku si abanye zaa, o nwere ike ịkpata ọrịa kansa akpa ume okpukpu iri abụọ na atọ karịa nke onye na-anaghị aṅụ ya
[Foto]
Akpa ume onye na-aṅụ sịga
Ụbụrụ O nwere ike ịkpata ọrịa strok okpukpu anọ karịa nke onye na-anaghị aṅụ ya
Akpụkpọ ahụ́ O nwere ike ime ka mmadụ kaa nká ụsụ
Ezé Ga-achagharị
Afọ: Ọ na-akpatara ya kansa
Anyịnya: Ọ na-akpatara ya kansa
Akpa mamịrị: Ọ na-akpatara ya kansa
Akụrụ Ọ na-akpatara ya kansa
[Foto dị na peeji nke 239]
Onye na-aṅụ sịga yiri azụ̀ nke na-atụrụ nri dị na nkò e ji egbute azụ̀. E nwere obere ihe ọ ga-erite, ma ọ ga-ata isi ya