Gịnị Mere Ịṅụ Oké Mmanya Ji Dị Njọ?
ISI NKE 34
Gịnị Mere Ịṅụ Oké Mmanya Ji Dị Njọ?
Gịnị ka i chere bụ́ azịza ajụjụ ndị a? Kanye ✔ n’igbe nke ọ bụla dị n’akụkụ ihe ị zara.
È nwere ndị ọgbọ gị na-aṅụ oké mmanya?
□ Ee □ Ee e
Ndị ọgbọ gị hà na-enye gị nsogbu ka ị ṅụọ mmanya na-aba n’anya?
□ Ee □ Ee e
Ị̀ ṅụtụla oké mmanya?
□ Ee □ Ee e
GỊNỊ bụ ịṅụ oké mmanya? Ụfọdụ kwuru na ọ pụtara mmadụ ịṅụgide mmanya mmanya egbuwe ya. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Aṅụrụma na Ịṅụbiga Mmanya Ókè n’Amerịka kọwakwuru ya. Ha kwuru na ịṅụ oké mmanya “pụtara nwoke ịṅụcha iko mmanya ise ma ọ bụ karịa n’otu oge, nakwa nwaanyị ịṅụcha iko mmanya anọ ma ọ bụ karịa n’otu oge.”
Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe ọ dị gị ka ị ṅụọ oké mmanya ma ọ bụ ka ị ṅụọ mmanya na-aba n’anya n’agbanyeghị na i torubeghị ịṅụ ya, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. * Ọtụtụ ndị na-eto eto na-aṅụbiga mmanya ókè. * Ma jụọ onwe gị, ‘M̀ ma ihe mere m ji chọọ ịna-aṅụ mmanya nakwa ihe mmanya nwere ike ime m?’ Dị ka ihe atụ, zaa eziokwu ma ọ bụ ụgha n’ihe ndị e kwuru n’ebe a. Kanye ✔ n’igbe nke ọ bụla dị n’akụkụ ihe ị zara, ma jiri ya tụnyere ihe a zara.
a. Naanị ihe mere ndị na-eto eto ji aṅụ mmanya bụ na ọ na-atọ ha ụtọ.
□ Eziokwu □ Ụgha
b. Ebe ọ bụ na ndị na-eto eto ka gbasiri ike, nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpatara ha anaghị eru ka nke ọ na-akpatara ndị torola eto.
□ Eziokwu □ Ụgha
ch. Ịṅụ oké mmanya enweghị ike igbu mmadụ.
□ Eziokwu □ Ụgha
d. Baịbụl kwuru na ịṅụ mmanya na-aba n’anya adịghị mma.
□ Eziokwu □ Ụgha
e. Naanị ihe ịṅụ oké mmanya na-eme mmadụ bụ ka ahụ́ ghara isi ya ike.
□ Eziokwu □ Ụgha
a. Naanị ihe mere ndị na-eto eto ji aṅụ mmanya bụ na ọ na-atọ ha ụtọ. Azịza—Ụgha. Ná nchọpụta e mere n’Ọstrelia banyere mmanya na-aba n’anya, e kee ndị na-eto eto a gbara ajụjụ ọnụ ụzọ iri, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụzọ anọ kwuru na
ihe mere ha ji aṅụ mmanya mgbe ha na ndị ọgbọ ha nọ bụ ka ha ghara ịgba iche. N’Amerịka, e kee ndị na-eto eto a gbara ajụjụ ọnụ ụzọ iri, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụzọ asaa kwuru na ha na-aṅụ mmanya n’ihi nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha. Ma, ihe karịrị ọkara n’ime ha kwuru na ha na-aṅụ mmanya ka ha chefuo nsogbu ha.b. Ebe ọ bụ na ndị na-eto eto ka gbasiri ike, nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpatara ha anaghị eru ka nke ọ na-akpatara ndị torola eto. Azịza—Ụgha. Otu magazin [a kpọrọ Discover] kwuru, sị: “Nchọpụta ọhụrụ e mere gosiri na ụmụaka ndị na-aṅụ oké mmanya ji aka ha na-akpatara onwe ha nsogbu.” N’ihi gịnị? “O nwere ike ime ka ụbụrụ ha ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma.”
Ịṅụ oké mmanya so n’ihe na-akpata pịmpụl, ịka nká ụsụ, ibu ibu, mmanya na ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ́. O nwekwara ike ime ka ahụ́ na-ama mmadụ jijiji, mebie imeju onye ahụ na obi ya.
ch. Ịṅụ oké mmanya enweghị ike igbu mmadụ. Azịza—Ụgha. Ịṅụbiga mmanya ókè na-eme ka ụbụrụ mmadụ ghara ịna-enweta ezigbo ikuku; ọ na-emekwa ka ihe ndị dị mmadụ n’ahụ́ jiri nwayọọ nwayọọ na-akwụsị ịrụ ọrụ. Ụfọdụ ihe ndị e ji amata ụdị nsogbu ahụ bụ ịgbọ agbọ, mmadụ amaghị onwe ya, na inwe nsogbu n’iku ume. O nwere ike igbu mmadụ.
d. Baịbụl kwuru na ịṅụ mmanya na-aba n’anya adịghị mma. Azịza—Ụgha. Baịbụl ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya adịghị mma ma ọ bụ na Abụ Ọma 104:15; Ekliziastis 10:19) N’eziokwu, i kwesịrị itoru etoru tupu ị ṅụwa mmanya na-aba n’anya.—Ndị Rom 13:1.
ndị na-eto eto ekwesịghị ikpori ndụ. (Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịna-aṅụbiga mmanya ókè. Ilu 20:1 kwuru, sị: “Onye na-akwa emo ka mmanya bụ, ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu bụ onye mkpọtụ, onye ọ bụla nke ọ na-eme ka ọ kpafuo amaghị ihe.” Mmanya na-aba n’anya nwere ike ime ka ị na-ezuzu ezuzu! N’eziokwu, o nwere ike ime ka obi dịtụ gị mma. Ma, ị ṅụbiga ya ókè, ‘ọ ga-ata gị nnọọ dị ka agwọ,’ kpatara gị ọtụtụ nsogbu.—Ilu 23:32.
e. Naanị ihe ịṅụ oké mmanya na-eme mmadụ bụ ka ahụ́ ghara isi ya ike. Azịza—Ụgha. Ị ṅụbiga mmanya ókè, e nwere ike idina gị n’ike ma ọ bụ rụsa gị Ilu 23:33, Today’s English Version) N’eziokwu, ị ga-eme onwe gị onye nzuzu! Nsogbu ndị ọzọ o nwere ike ịkpata bụ itisa enyi na enyi, emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ụlọ ọrụ, ime mpụ, na ịda ogbenye.—Ilu 23:21.
arụrụala ọzọ. I nwekwara ike ịkpatara ndị ọzọ nsogbu, meekwa ka i ree ùgwù gị. Baịbụl dọrọ aka ná ntị na ị ṅụbiga mmanya ókè, “ị gaghị enwe ike iche echiche ma ọ bụ ikwu okwu nke ọma.” (Ihe kacha mkpa i kwesịrị ichebara echiche bụ na ịṅụbiga mmanya ókè ga-eme ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma. Jehova Chineke chọrọ ka i jiri “uche gị dum” na-ejere ya ozi, ọ bụghị uche nke mmanya mebiri! (Matiu 22:37) Baịbụl kwuru na “ịṅụ oké mmanya” na “ịma aka n’ịṅụ mmanya” adịghị mma. (1 Pita 4:3) N’ihi ya, Onye kere anyị achọghị ka anyị na-aṅụ oké mmanya. Onye na-aṅụ oké mmanya agaghị abụ enyi Chineke.
Gịnị Ka Ị Ga-ekpebi Ime?
Ị̀ ga-eso ndị ọgbọ gị na-aṅụ oké mmanya? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu na-enyefe onwe unu n’aka onye ọ bụla ka unu bụrụ ndị ohu ya irubere ya isi, unu bụ Ndị Rom 6:16) Ị̀ chọrọ ịghọ ohu ndị ọgbọ gị ma ọ bụ ohu mmanya?
ndị ohu ya n’ihi na unu na-erubere ya isi?” (Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ịṅụ oké mmanya eriela gị ahụ́? Gwa mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụ enyi gị ma nke a na-akọ ka o nyere gị aka. Kpee ekpere, rịọ Jehova Chineke ka o nyere gị aka. A sị ka e kwuwe, ọ “dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.” (Abụ Ọma 46:1) Ebe ọ bụ na ihe mere ọtụtụ ndị ji aṅụ oké mmanya ma ọ bụ na-aṅụ mmanya mgbe ha na-etorubeghị bụ nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha, o nwere ike ịdị mkpa ka i meta ezigbo ndị enyi. * Ime otú ahụ agaghị adị mfe, ma ị ga-emeli ya ma Jehova nyere gị aka.
Chọpụta otú mmadụ nwere ike isi kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri ya ahụ́.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Ná mba ụfọdụ, e nwere afọ ole iwu kwuru na mmadụ ga-eru tupu ya enwee ike ịṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ịzụ ya.
^ par. 11 Gụọ igbe bụ́ “ Ole Ndị Na-eme Ya?” nke dị na peeji nke 249.
^ par. 32 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 8 na nke 9 n’akwụkwọ a nakwa Isi nke 15 na nwanne ya bụ́ Nke 2.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Onye aṅụrụma . . . ga-ada ogbenye.”—Ilu 23:21.
NDỤMỌDỤ
Chọpụta ihe mere i ji chọọ ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya. Gbalịa icheta otú ọzọ ka mma ị ga-esi kporie ndụ ma ọ bụ mee ka obi dị gị mma.
Ị̀ MA NA . . . ?
N’otu nchọpụta e mere n’Amerịka, “ụmụaka ndị na-aṅụ oké mmanya nwere nsogbu okpukpu asatọ karịa ndị na-anaghị aṅụ. Nsogbu ndị ahụ bụ anọghị na klas, emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, imerụkarị ahụ́, na imebi ihe ndị ọzọ.”
IHE M GA-EME!
Ndị ọgbọ m chọọ ka m soro ha ṅụbiga mmanya ókè, ihe m ga-agwa ha bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere ndị ọgbọ gị ji achọ ka ndị ọzọ soro ha na-aṅụbiga mmanya ókè?
● Ịnụbiga mmanya ókè ọ̀ ga-eme ka ihe gị masịwa ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 250]
“Ụmụ akwụkwọ ibe m nye m mmanya na-aba n’anya, m na-agwa ha na echeghị m na ọ bụ ịṅụ mmanya bụ ikpori ndụ.”—Mak
[Igbe dị na peeji nke 249]
Ole Ndị Na-eme Ya?
Ná nchọpụta e mere na Briten banyere ụmụaka sekọndrị, e kee ndị dị afọ iri na atọ na afọ iri na anọ ụzọ anọ, otu ụzọ “kwuru na ha aṅụọla iko mmanya na-aba n’anya ise n’otu oge.” Ihe dị ka ọkara n’ime ndị dị afọ iri na ise na afọ iri na isii kwuru na ha emeela otú ahụ. Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike n’Amerịka kwuru na “ihe karịrị nde ndị na-eto eto iri, bụ́ ndị dị n’agbata afọ iri na abụọ na afọ iri abụọ, na-aṅụ mmanya na-aba n’anya. Ihe karịrị nde ise n’ime ha na-aṅụ oké mmanya mgbe niile. Ihe karịrị nde abụọ n’ime ndị a na-aṅụ oké mmanya ọ dịkarịa ala ugboro ise n’ọnwa.” Nchọpụta e mere n’Ọstrelia gosiri na ụmụ agbọghọ na-aṅụ oké mmanya karịa ụmụ okorobịa ná mba ahụ. Ha na-aṅụru iko mmanya iri na atọ n’otu mgbe. Mgbe ụfọdụ, ha na-aṅụrukwa iko mmanya iri atọ!
[Foto dị na peeji nke 251]
Mmanya na-aba n’anya na-ata ka agwọ