Azịza Ndị Na-adị Irè!
OKWU MMALITE
Azịza Ndị Na-adị Irè!
‘Olee otú m ga-esi na-agwa ndị mụrụ m okwu?’ ‘Olee otú m ga-esi emeta ndị enyi?’ ‘Gịnị mere ịkwa iko ji dị njọ?’ ‘Gịnị mere obi ji ajọkarị m njọ?’
Ọ bụrụ na ị jụtụla onwe gị ụdị ajụjụ ndị ahụ, ghọta na ndị ọzọ na-ajụ ha. Ihe a zara gị nwere ike ọ gaghị abụ otu ihe n’ihi na ndị zara ya dị iche iche. Iji nyere ndị na-eto eto aka inweta ezigbo ndụmọdụ ga-abara ha uru, na Jenụwarị 1982, a malitere ibipụta isiokwu ndị si na Baịbụl na magazin bụ́ Teta! A kpọrọ isiokwu ndị ahụ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . . ” N’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala kemgbe ahụ, isiokwu ndị ahụ ka na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ. A na-eme nchọnchọ nke ọma tupu e bipụta nke ọ bụla. N’eziokwu, ndị na-ede Teta! gbara ọtụtụ ndị na-eto eto bi ná mba dị iche iche ajụjụ ọnụ iji mata ihe ndị na-eto eto na-eche na otú obi na-adị ha! Ma, ihe kacha mkpa bụ na ndụmọdụ ndị a na-ede n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” si n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl.
Mgbe mbụ e bipụtara akwụkwọ a bụ n’afọ 1989. Ma, e degharịrị isiokwu ndị dị na ya iji lebara ihe ndị na-eme n’oge anyị a anya. Ebe e si nweta ihe karịrị isiokwu iri atọ n’ime ha bụ ụfọdụ ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị,” bụ́ ndị gbara na Teta! malite n’afọ 2004 ruo 2011.
Akwụkwọ a bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ị ga-eme iji na-akpa àgwà ọma ma i too. Anyị bu n’obi na i mee ihe ị mụtara n’akwụkwọ a, ị ga-eso n’ọtụtụ nde mmadụ, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, bụ́ “ndị zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”—Ndị Hibru 5:14.
Ndị Bipụtara Ya