Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Mụ na Ndị Mụrụ M Ji Esekarị Okwu?

Gịnị Mere Mụ na Ndị Mụrụ M Ji Esekarị Okwu?

ISI NKE 2

Gịnị Mere Mụ na Ndị Mụrụ M Ji Esekarị Okwu?

N’ihe a kọrọ ná mbido isiokwu a, e nwere ihe atọ Rechel mere nke mere ka ya na mama ya sewe okwu. Ì nwere ike ịchọpụta ha? Dee ihe atọ ị chọpụtara n’okpuru ebe a. Gazie n’igbe e dere  Azịza, nke dị na peeji nke 20, lee ma ị̀ zatara ha.

․․․․․

N’otu abalị Wenezdee, otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Rechel rụchara ọrụ o kwesịrị ịrụ n’ụlọ, gazie na palọ ha ka o zurutụ ike! Ọ gbanyere tiivi, nọdụ n’otu oche na-amasịkarị ya.

Ozugbo ahụ, mama ya batara gbarụọ ihu. Ihe Rechel nụziri bụ: “Rechel! Gịnị mere i ji nọrọ ebe ahụ na-ele tiivi mgbe i kwesịrị inyere nwanne gị nwaanyị aka rụọ ihe onye nkụzi ha nyere ya ka ọ rụọ n’ụlọ? O nweghị mgbe ị na-eme ihe a gwara gị!”

Rechel amalite ịtamu, “Ọ bịakwala ọzọ.” O kwuru ya otú mama ya ga-anụ ya.

Mama ya abịa ya nso, sị ya, “Bịa, ị̀ sịrị gịnị?”

Rechel arọọ mama ya anya, maa ọsụ, sị, “O nweghị.”

Ugbu a, ezigbo iwe abịala mama ya. Ya asị Rechel, “Esikwala otú ahụ agwa m okwu!”

Rechel asị ya: “Otú ahụ gịnwa si gwa m okwu ọ̀ dị mma?”

Esemokwu ebirila ọkụ . . . Rechel ezughịzi ike ọ chọrọ izu.

ỤDỊ ihe a a kọrọ ò metụla gị? Gị na ndị mụrụ gị ùnu na-esekarị okwu? Ọ bụrụ na unu na-esekarị okwu, chebara ihe ndị na-akpata ya echiche. Olee ihe ndị na-esekarịrị unu okwu? Kanye ✔ n’ihe ndị na-esekarịrị unu okwu, ma ọ bụkwanụ gị edee ihe ọzọ na-esere unu okwu n’ebe ahụ e dere “Ihe ọzọ.”

□ Àgwà m

□ Ọrụ ụlọ

□ Ejiji m

□ Oge a gwara m m ga-eji alọta n’abalị

□ Ihe ntụrụndụ

□ Ndị enyi m

□ Onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Esemokwu agaghị adị gị na ndị mụrụ gị mma n’ahụ́, n’agbanyeghị ihe kpatara ya. N’eziokwu, i nwere ike ịgbachi nkịtị ma mee ka à ga-asị na i kwetara ihe niile ndị mụrụ gị kwuru. Ma, Chineke ọ̀ chọrọ ka ị na-eme otú ahụ? Mba. Baịbụl kwuru ka ị ‘na-asọpụrụ nna gị na nne gị.’ (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ma, o kwukwara na i kwesịrị ịzụ “ikike iche echiche” gị, jirikwa ya na-arụ ọrụ. (Ilu 1:1-4; Ndị Rom 12:1) I mee otú ahụ, a ga-enwe ihe ndị ị ga-ekwetasi ike na ha dị mma. Ndị mụrụ gị nwere ike ikwu na ụfọdụ n’ime ha adịghị mma. Ma, n’ezinụlọ ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru, ndị nne na nna na ụmụ ha ndị na-eto eto na-eji obiọma ekwurịta ihe ha chọrọ ikwu, ọ bụrụgodị na obi ha abụghị otu n’ihe niile.—Ndị Kọlọsi 3:13.

Olee otú i nwere ike isi kwuo uche gị ka ọ ghara isere unu okwu? I nwere ike ikwu ozugbo, sị: “Ọ bụ ndị mụrụ m ka o si n’aka. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ha bụ ndị na-anaghị ekwe m ṅụọ mmiri tọgbọ iko!” Ma chegodị echiche: Ì nwere ike ime ka papa gị na mama gị nakwa ndị ọzọ gbanwee otú ha si akpa àgwà? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ naanị onwe gị ka i nwere ike ịgbanwe. Ma, gị na ndị mụrụ gị nwee nghọtahie, ka obi sie gị ike na i mee ihe i kwesịrị ime ka gị na ha ghara ise okwu, iwe ha nwere ike ịdajụ, ha egee ntị n’ihe ị chọrọ ikwu.

Ugbu a, ka anyị chọpụta ihe nwere ike ime ka gị na ndị mụrụ gị ghara ise okwu. I mee ihe ndị a anyị na-aga ikwu ugbu a, o nwere ike ime ka otú gị na ndị mụrụ gị si akparịta ụka ka mma nke na ọ ga-eju gị na ha anya.

Chee echiche tupu ị saa ha okwu. A gwa gị ihe were gị iwe, ekwupụla ihe mbụ batara gị n’obi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mama gị asị gị: “Gịnị mere na ị saghị efere ndị ahụ? O nweghị mgbe ị na-eme ihe a gwara gị!” Ihe nwere ike ịbata gị n’obi ikwu ozugbo bụ, “Ị̀ ga-ekwekwa m zuru ike?” Kama ikwu ya, buru ụzọ chee echiche. Gbalịa ka ị chọpụta ihe mere mama gị ji gwa gị okwu otú ahụ. Ọ bụrụ na mama gị ekwuo ihe dị ka, “ị na-eme ihe a mgbe niile” ma ọ bụ “o nweghị mgbe ị na-eme ihe a gwara gị,” ọ pụtaghị na ị na-eme ihe ahụ mgbe niile ma ọ bụ na ị na-eme ihe ọjọọ mgbe niile, kama, ọ pụtara na e nwere ihe na-ewe ya iwe. Gịnị ka o nwere ike ịbụ?

Ọ ga-abụ na obi adịghị mama gị mma n’ihi na ọ dị ya ka à hapụụrụ ya ọrụ niile dị n’ụlọ. O nwere ike, naanị ihe ọ chọrọ bụ ka i mesie ya obi ike na ị ga na-enyere ya aka. Ọ bụrụ otú ahụ, ịsị mama gị, “Ị̀ ga-ekwekwa m zuru ike?” agaghị abara gị uru ọ bụla. Naanị ihe o nwere ike ịkpata bụ esemokwu. Kama ikwu ụdị ihe ahụ, ọ́ gaghị aka mma ka i mee ka obi ruo mama gị ala? Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịsị: “Mama, biko, ewela iwe. Ka m gaa saa efere ndị ahụ ozugbo.” Ihe ị na-ekwesịghị ime: Ekwula okwu ka ị̀ na-akparị ya. Kwuo ihe ga-egosi na ị ghọtara otú obi dị ya. O nwere ike ime ka iwe ya dajụọ, ya agwa gị ihe na-echegbu ya. *

N’okpuru ebe a, dee ihe ọ ga-abụ mama gị ma ọ bụ papa gị kwuo, ya ewee gị iwe ma ọ bụrụ na i kwe ka ọ kpasuo gị iwe.

․․․․․

Ugbu a, chee okwu ọma i nwere ike ịgwa ya nke ga-eme ka obi dajụọ ya.

․․․․․

Kwanyere ha ùgwù mgbe ị na-agwa ha okwu. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Michelle si n’ihe mere n’oge gara aga mụta na ya kwesịrị ịkpachara anya n’otú o si agwa mama ya okwu. Ọ sịrị: “E nwee ihe ọ bụla seere mụ na mama m, ọ na-agwakarị m na otú m si saa ya okwu adịghị ya mma.” Ọ bụrụ na mama gị na-agwakarị gị ụdị ihe a, mụta iji nwayọọ agwa ya okwu. Wetuo olu mgbe ị na-agwa ya okwu. Arọkwala ya anya ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-egosi na iwe na-ewe gị. (Ilu 30:17) Ọ bụrụ na iwe achọọ iwe gị, kpee ekpere n’obi gị. (Nehemaya 2:4) Ma, ihe ị ga-arịọ Chineke abụghị ka o mee ka ndị mụrụ gị kwụsị inye gị nsogbu, kama ọ bụ ka o nye gị ike ijide onwe gị ka ị ghara ime ka okwu ka njọ.—Jems 1:26.

N’okpuru ebe a, dee ihe ụfọdụ ị na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụ mee ma a kpasuo gị iwe.

Ihe ndị m na-ekwesịghị ikwu:

․․․․․

Ihe ndị m na-ekwesịghị ime:

․․․․․

Gee ntị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ekwu okwu mgbe o kwesịrị imechi ọnụ ga-adaba na mmehie.” (Ilu 10:19, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) N’ihi ya, gbachi nkịtị ka mama gị ma ọ bụ papa gị kwuo okwu, geekwa ya ntị nke ọma. Anapụla ya okwu n’ọnụ iji gwa ha na ihe i mere adịghị njọ. Gee ntị. Ya kwuchaa, ọ bụ mgbe ahụ ka i nwere ike ịjụ ajụjụ ma ọ bụ kwuo ihe i chere. Ma, ọ bụrụ na i sie ọnwụ kwuwe otú ọ dị gị n’obi ozugbo ahụ, o nwere ike ime ka ihe ka njọ. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ị ka chọrọ ikwu, oge ahụ yiri ka ọ̀ bụ “oge ịgbachi nkịtị.”—Ekliziastis 3:7.

Rịọ mgbaghara. Ọ dị mma ịsị “ewela iwe” mgbe ọ bụla i mere ihe kpatara esemokwu. (Ndị Rom 14:19) I nwedịrị ike ikwu na nghọtahie ahụ unu nwere wutere gị. Ọ bụrụ na o siiri gị ike ịgakwuru ha rịọ ha mgbaghara, i nwere ike ide ihe ị chọrọ ikwu ede nye ha. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịkwụsị ihe ọ bụla i mere nke kpataara gị na ha esemokwu ahụ. (Matiu 5:41) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe mere unu ji see okwu bụ na ị rụghị ọrụ dị n’ụlọ, ọ́ gaghị adị mma ka ị rụọ ọrụ ahụ, mee ka obi dị ndị mụrụ gị mma? Ọ bụrụgodị na ị naghị achọ ịrụ ụdị ọrụ ahụ, ọ́ gaghị aka mma ịrụ ya kama inweta ntaramahụhụ ha ga-enye gị n’ihi na ị rụghị ya? (Matiu 21:28-31) Cheta uru ndị ị ga-erite ma i mee ihe ndị i kwesịrị ime ka gị na ndị mụrụ gị ghara ịna-ese okwu.

Ezinụlọ ndị na-enwe obi ụtọ na-enwe nghọtahie, ma ha na-ama otú e si eji obiọma edozi ya. Mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a, o nwere ike ime ka gị na ndị mụrụ gị na-ekwurịta banyere nsogbu unu n’eseghị okwu!

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ì chere na ndị mụrụ gị kwesịrị ịhapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 26 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 21 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Onye eziomume na-eche eche tupu o kwuo.”—Ilu 15:28, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

NDỤMỌDỤ

Mgbe ndị mụrụ gị na-agwa gị okwu, gbanyụọ egwú ị na-ege, dewe akwụkwọ ọ bụla ị na-agụ, na-elekwa ha anya.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ịgbalị idozi esemokwu ma ọ bụ ime ka unu ghara ise okwu ga-eme ka ihe kara gị mma. N’ezie, Baịbụl kwuru, sị: “Onye obiọma na-emeso mkpụrụ obi ya mmeso ọma.”—Ilu 11:17.

IHE M GA-EME!

Aro a tụrụ n’isiokwu a m kwesịrị ilebara anya karịchaa bụ ․․․․․

Ụbọchị m ga-amalite ime ihe a e kwuru bụ (denye ụbọchị) ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị ji chee na ọ dị mma imeri n’arụmụka?

● Gịnị mere Jehova Chineke ji were onye na-esekarị okwu ka onye nzuzu?—Ilu 20:3.

● Olee uru ị ga-erite ma i mee ka gị na ndị mụrụ gị ghara ịna-ese okwu?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

“Oge ụfọdụ, mama m na-asị m, ‘Biko, ewela iwe,’ makụọkwa m, ọ na-emekwa ka obi dị m mma. Anyị na-echezọkwa ihe merenụ. M na-emekwa otú ahụ. M na-ewetu onwe m ala, sị, ‘Biko, ewela iwe.’ Ọ bara ezigbo uru, ma ọ naghị adị mfe.”—Lauren

 [Igbe dị na peeji nke 20]

Azịza

1. Ịgwa mama ya okwu mkparị (dị ka, “Ọ bịakwala ọzọ”) mere ka iwe wekwuo mama ya.

2. Ịrọ mama ya anya na ịma ọsụ bụ ịchọ nsogbu.

3. Ịsa mama ya okwu (dị ka ịsị, “Otú ahụ gịnwa si gwa m okwu ọ̀ dị mma?”) mere ka mama ya wekwuo iwe.

[Foto dị na peeji nke 19]

Isesa mama gị ma ọ bụ papa gị okwu dị ka ịnọ otu ebe na-agba ọsọ, ike ga-agwụ gị ma o nweghị ebe i ji azụ aga