Gịnị Mere Ụmụ Agbọghọ Ji Agbara M Ọsọ?
ISI NKE 28
Gịnị Mere Ụmụ Agbọghọ Ji Agbara M Ọsọ?
Akọjuola m nwa agbọghọ a isi. Agwala m ya ihe niile banyere onwe m, ma ihe ndị m nwere ma ebe ndị m garala ma ndị m ma. Ama m na ọ chọsiri ike ka mụ na ya kpawa!
Ọ dị m ka ala mepee ka m daba! Ọ̀ bụ na nwa okorobịa a enweghị ike ịghọta na ihe ya amasịghị m? Olee otú m ga-esi kwụsị mkparịta ụka a n’akparịghị ya?
1 Ndị Kọrịnt 7:39) Ma n’oge gara aga, mgbe ọ bụla ị chọrọ ka gị na nwa agbọghọ kpawa, ị naghị ama ihe ị ga-ekwu. Gịnị mere? Ụmụ agbọghọ hà na-achọ naanị ụmụ okorobịa kacha maa mma? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lisa kwuru, sị: “Achọrọ m nwa okorobịa nwere akpụ obi.” Ma, ọ bụghị naanị ụdị ihe ahụ ka ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-achọ. Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Carrie kwuru, sị: “Ọ bụghị ụmụ okorobịa niile mara mma na-akpa ezi àgwà.”
KA E were ya na i toruola inwe nwa agbọghọ gị na ya ga na-akpa. Obi ga-adị gị mma ma ị hụ onye dị gị mma gị na ya na-ekpe otu okpukpe. (Gịnị bụ ezi àgwà ụmụ agbọghọ na-achọ? Ị chọọ ka gị na nwa agbọghọ dịkwuo ná mma, olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche? Oleekwa ihe ndị Baịbụl kwuru i kwesịrị icheta?
Ihe I Kwesịrị Ibu Ụzọ Mee
Tupu i kpebie ịgwa nwa agbọghọ na ị chọrọ ka gị na ya kpawa, e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa i kwesịrị ịmụta, bụ́ ihe ndị ga-enyere gị aka imeta onye ọ bụla enyi. Chebara ihe ndị a echiche.
● Mụta ịkpa ezi àgwà. Baịbụl kwuru na ‘ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:5) Ịkpa ezi àgwà ga-egosi na ị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù nakwa na ị ghọwala Onye Kraịst tozuru okè. Ma ezi àgwà adịghị ka kootu ị na-eyiri ka ndị ọzọ jaa gị mma, ma ị laruo, gị eyipụ ya. Jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m akpaso ndị ezinụlọ anyị ezi àgwà?’ Ọ bụrụ na ị naghị akpa ezi àgwà n’ụlọ, ọ ga-esiri gị ike ịkpaso ndị ọzọ ezi àgwà. Cheta na nwa agbọghọ ma ihe chọọ ịmata ụdị onye ị bụ, ọ ga-eleru anya n’otú i si emeso ndị ezinụlọ unu.—Ndị Efesọs 6:1, 2.
Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Nwa okorobịa ihe ya na-amasị m bụ onye na-akpa ezigbo
àgwà ma n’obere ihe ma ná nnukwu ihe, dị ka imepere m ọnụ ụzọ, imere mụ na ndị ezinụlọ anyị obiọma na ichebara anyị echiche.”—Tina.“Ọ na-ewe m iwe ma nwa okorobịa hụhaala m jụwa m ajụjụ ụfọdụ na-agbasaghị ya, dị ka ‘È nwere nwa okorobịa gị na ya na-akpa?’ na ‘Olee ihe ị ga-eji ndụ gị mee?’ Ọ bụ mkparị, ọ na-emekwa ka ahụ́ ghara iru m ala!”—Kathy.
“M na-ewere ya na ọ bụ mkparị ma ụmụ okorobịa chee na ha nwere ike iji obi anyị na-egwuri egwu ka à ga-asị na otú obi dị anyị enweghị ihe o mere nakwa na ịlụ di na-agba anyị niile ara nke na anyị chọrọ ka ha na-emetara anyị ebere.”—Alexis.
● Na-adị ọcha. Ịdị ọcha ga-egosi na ị na-akwanyere onwe gị nakwa ndị ọzọ ùgwù. (Matiu 7:12) Ịkwanyere onwe gị ùgwù nwere ike ime ka ndị ọzọ na-akwanyere gị ùgwù. Ma, ọ bụrụ na ị naghị adị ọcha, ọ ga-eme ka mbọ ị na-agba inweta nwa agbọghọ kụọ afọ n’ala.
Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Ọnụ otu nwa okorobịa ihe m masịrị ya na-esi ezigbo ísì. O kweghị m odidi.”—Kelly.
● Mụta otú e si akparịta ụka. Ihe ga-eme ka gị na mmadụ na-adị ná mma bụ ịna-ekwurịta okwu nke ọma. Unu ga na-ekwurịta ma ihe na-amasị gị ma ihe na-amasị ya. (Ndị Filipaị 2:3, 4) I kwesịrị ige ntị n’ihe ọ na-ekwu ma jiri ihe o kwuru kpọrọ ihe.
Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Ọ na-atọ m ụtọ ma nwa okorobịa wetuo obi mgbe mụ na ya na-akparịta ụka, na-echeta ihe ndị m gwara ya ma na-ajụ m ajụjụ ndị ga-eme ka mkparịta ụka anyị ghara ịkwụsị n’ike.”—Christine.
“Echere m na ihe na-amasị ụmụ okorobịa bụ ihe ha hụrụ, ma ihe na-amasịkarị ụmụ agbọghọ bụ ihe ha nụrụ.”—Laura.
“Onyinye dị mma. Ma, nwa okorobịa nke ma otú e si akparịta ụka na otú e si akasi mmadụ obi nakwa otú e si agba mmadụ ume na-atọgbu m atọgbu.”—Amy.
“Ama m otu nwa okorobịa na-akpa àgwà ọma. Ọ naghịkwa egwusa mmadụ egwuregwu na-adịghị mma. Anyị na-akparịta ụka nke ọma, ma ọ naghị agwa m ihe dị ka, ‘Ị na-esi isi ọma’ ma ọ bụ ‘Ị mara ezigbo mma taa.’ Ọ na-ege m ntị nke ọma. Ụdị ihe ahụ ga-eme ka obi dị nwa agbọghọ ọ bụla mma.”—Beth.
“Ụdị nwa okorobịa m chọrọ ka mụ na ya na-akpa bụ onye ihu na-atọ ọchị na onye nwekwara ike ikwu ihe ndị dị mkpa n’egwughị egwu.”—Kelly.
● Jiri ihe dị mkpa kpọrọ ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” (Ndị Galeshia 6:5) Ụmụ agbọghọ anaghị achọ nwa okorobịa a na-achụkarị n’ọrụ n’ihi na ọ dị umengwụ ma ọ bụ na ọ na-egwukarị egwu.
Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Achọrọ m ka ụmụ okorobịa ghara ịna-agbara ọrụ ọsọ. Ndị na-eme otú ahụ na-akpasu m iwe. Ọ na-enye ha aha ọjọọ.”—Carrie.
“Ụfọdụ ụmụ okorobịa amaghị ihe ha chọrọ iji ndụ ha eme. Ha hụ nwa agbọghọ ihe ya masịrị ha, ma chọpụta ihe ọ chọrọ iji ndụ ya eme, ha asị ya, ‘Ọ bụ ihe m chọkwara ime!’ Ma ihe ha na-eme dị iche n’ihe ha kwuru.”—Beth.
Ọ bụrụ na ị na-eji ihe dị mkpa akpọrọ ihe dị ka e kwuru n’ebe a, ọ ga-enyere gị aka imeta ezigbo ndị enyi. Ma, ozugbo i kpebiri na gị na nwaanyị ga na-akpachikwu anya ma hụ onye dị gị mma, gịnị ka i kwesịrị ime?
Ihe Ọzọ Ị Ga-eme
● Gwa ya. E nwee nwa agbọghọ gị na ya dị ná mma nke i chere na ọ ga-abụ ezigbo nwunye, gwa ya na ihe ya masịrị gị. Gwa ya hoo haa otú ọ dị gị n’obi. N’eziokwu, ikwu ụdị ihe ahụ nwere ike isiri gị ezigbo ike. Ụjọ na-atụ gị ma ọ̀ ga-ekwekwa. Ma, ịkata obi gwa ya ihe i bu n’obi ga-egosi na i toola. Ma ihe ị ga-eburu n’uche bụ: Ihe ị bịara abụghị ịgwa ya na ị chọrọ ịlụ ya. N’ihi ya, mara ihe. I mee ka onye ihu na-anaghị atọ ọchị ma ọ bụ onye ọ dị ọkụ n’ahụ́, o nwere ike ịtụwa gị ụjọ kama ihe gị ịmasịwa ya.
Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Anaghị m enyocha obi. N’ihi ya, nwa okorobịa chọọ ka mụ na ya kpawa, o kwesịrị ịgwa m ihe ọ chọrọ hoo haa.”—Nina.
“O nwere otú ọ na-adịcha ma ọ bụrụ onye gị na ya dị ná mma kemgbe. Ma m ga-akwanyere nwa okorobịa ùgwù ma ọ gwa m na ya chọrọ ka mụ na ya kpachiwekwuo anya.”—Helen.
● Kweta ihe ọ bụla nwa agbọghọ ahụ kpebiri. Ọ́ bụrụkwanụ na nwa agbọghọ ahụ agwa gị na ya achọghị ka gị na ya kpachiwekwuo anya? Kwanyere ya ùgwù ma kweta na ọ ma ihe ọ chọrọ nakwa na ihe ọ gwara gị si ya n’obi. Inyewe ya nsogbu ka o kweta ga-egosi na ị ka na-eme ka ụmụaka. Nwa agbọghọ gwa gị hoo haa na ya achọghị gị, gị esie ọnwụ na-achụ ya ma ọ bụdị wewa iwe na ọ jụrụ, ọ̀ ga-egosi n’eziokwu na ị na-eche banyere ọdịmma ya ka ọ̀ bụ ọdịmma nke gị?—1 Ndị Kọrịnt 13:11.
Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Ọ na-ewe m iwe ma m sị nwa okorobịa ‘mba,’ ya aka na-enye m nsogbu.”—Colleen.
“Agwara m otu nwa okorobịa na ihe ya amasịghị m, ya ana-enye m nsogbu ka m nye ya nọmba ekwe ntị m. Ma achọghị m ịkparị ya. A sị ka e kwuwe, ọ dịghịrị ya mfe ịkata obi bịa gwa m ihe o bu n’obi. Ma emechara m gwa ya hoo haa ka ọ kwụsị inye m nsogbu.”—Sera.
Ihe Ị Na-ekwesịghị Ime
Ụfọdụ ụmụ okorobịa na-ekwu na ọ naghị esiri ha ike imeta ụmụ agbọghọ enyi. Ha na ụmụ okorobịa ibe ha nwedịrị ike ịna-ama aka onye ga-akacha emeta ụmụ agbọghọ enyi. Ma ụdị ịma aka ahụ adịghị mma. Ọ ga-emebi aha gị. (Ilu 20:11) Ụdị ihe ahụ agaghị eme gị ma i buru ihe ndị a n’obi.
● Achụla nwaanyị. Onye na-achụ nwaanyị na-eji ihe dị iche iche achọ ịrata ụmụ nwaanyị, ma ire ụtọ ma otú o si ele anya ma otú o si eme. Ma o bughị n’obi ịlụ nke ọ bụla. 1 Timoti 5:2) Ndị na-achụ nwaanyị anaghị abụ ezigbo enyi, ma ya fọdụzie ịbụ ezigbo di. Ụmụ agbọghọ ndị ma ihe ma na ọ bụ eziokwu.
Onye na-eme otú ahụ na-eleghara ihe Baịbụl kwuru anya, nke bụ́ ka ‘a na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.’ (Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Ọ na-ewe m iwe ma nwa okorobịa gwa m okwu ga-eme ka isi kopụ m, ma ya abụrụ na m ma na ọ gwara enyi m nwaanyị ụdị okwu ahụ n’ọnwa gara aga.”—Helen.
“Otu nwa okorobịa mara mma malitere ịchụ m, ma ihe ọ na-ekwu bụ naanị banyere onwe ya. Mgbe nwa agbọghọ ọzọ bịara n’ebe anyị nọ, nwa okorobịa ahụ gwawara ya otu ihe ahụ. Mgbe onye nke atọ bịakwara, ya agwawakwa ya otu ihe ahụ. O were m iwe!”—Tina.
● Ejila obi nwa agbọghọ egwuri egwu. Echela na ị ga na-emeso ụmụ agbọghọ gị na ha dị ná mma otú i si emeso ụmụ okorobịa gị na ha dị ná mma. Maka gịnị? Chegodị echiche: Ị gwa enyi gị nwoke na uwe ọhụrụ o yi mara mma
ma ọ bụkwanụ gị na ya kparịtawa ụka mgbe niile, gị ana-akọkwara ihe ị na-anaghị akọrọ onye ọzọ, ọ gaghị echewe na ị chọrọ ịlụ ya. Ma, ị gwa nwa agbọghọ na ọ mara mma ma ọ bụkwanụ gị na ya kparịtawa ụka mgbe niile, gị ana-akọkwara ya ihe ị na-anaghị akọrọ onye ọzọ, o nwere ike ichewe na ị chọrọ ịlụ ya.Ihe ụmụ agbọghọ kwuru: “Echeghị m na ụmụ okorobịa ma na ha ekwesịghị ịna-emeso ụmụ agbọghọ otú ha si emeso ndị enyi ha bụ́ ụmụ nwoke.”—Sheryl.
“Nwa okorobịa nwere ike ịnara m nọmba ekwe ntị m, ya edee ozi n’ekwe ntị ya zitere m. N’ihi ya, mụ ana-eche ihe o bu n’obi. Mgbe ụfọdụ, gị na nwa okorobịa nwere ike ịdị ná mma n’ihi na unu na-ede ozi n’ekwe ntị na-ezigara ibe unu, onye ahụ esi otú ahụ rie gị obi. Ihe ole ka i nwekwaranụ ike ikwu n’ozi i dere n’ekwe ntị?”—Mallory.
“Echeghị m na ụmụ okorobịa ma na ọ naghị esi ike nwa okorobịa erie nwa agbọghọ obi, nke ka nke, ma ọ bụrụ na nwa okorobịa ahụ dị obiọma, na-egekwa mmadụ ntị. Ọ bụghị n’ihi na ọ dị nwa agbọghọ ahụ ọkụ n’ahụ́. Ọ dị m ka ọ̀ bụ n’ihi na ọtụtụ ụmụ agbọghọ chọrọ onye ga-ahụ ha n’anya, anya ha na-adịkwa n’ịchọta onye ọ ga-adabara ha na ya.”—Alison.
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 3 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2
Gịnị ka i chere dị iche n’ezi ịhụnanya na ịhụnanya nzuzu?
AMAOKWU BAỊBỤL
‘Yiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’—Ndị Efesọs 4:24.
NDỤMỌDỤ
Jụọ ụfọdụ ndị torola eto, bụ́ ndị ma nke a na-akọ, àgwà ha chere kacha mkpa nwa okorobịa kwesịrị ịmụta, chọpụtakwa ma ì kwesịrị ịna-emekwu nke ọma na ya.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ụdị onye ị bụ dị mkpa karịa otú ị dị n’anya.
IHE M GA-EME!
Àgwà ọma m nwere ike ịna-emekwu nke ọma na ya bụ ․․․․․
Ihe m ga-eme ka mụ na ndị mmadụ nwee ike ịna-akparịta ụka nke ọma bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-akwanyere onwe gị ùgwù?
● Olee otú ị ga-esi gosi na ị naghị eji ihe nwa agbọghọ chere na otú obi dị ya egwuri egwu?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 198]
“Ụmụ okorobịa chere na o nwere ụdị ejiji ha ga-eji ma ọ bụ otú ha ga-adị n’anya, ihe ha amasịwa ụmụ agbọghọ. Ọ bụ eziokwu na iji ejiji dị mma nwere ike ịmasị ụmụ agbọghọ, echere m na ihe na-akacha amasị ha bụ àgwà ọma.”—Kate
[Foto dị na peeji nke 197]
Ezi àgwà adịghị ka kootu ị na-eyiri ka ndị ọzọ jaa gị mma, ma ị laruo, gị eyipụ ya