Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Kọwaa Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Nwaanyị Idina Nwaanyị?

Olee Otú M Ga-esi Kọwaa Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Nwaanyị Idina Nwaanyị?

ISI NKE 23

Olee Otú M Ga-esi Kọwaa Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Nwaanyị Idina Nwaanyị?

N’otu ememme e ji nye ndị mere nke ọma onyinye, ụmụ nwaanyị abụọ a ma ama, bụ́ ndị na-eme ihe nkiri, mịrị ibe ha ọnụ n’ihu ọha! Mmadụ niile kụjara, ma kụọrọ ha aka. Ụmụ nwaanyị ndị na-edina nwaanyị ibe ha ṅụrịrị ọṅụ na ndị mmadụ anabatawala ụdị ndụ a ha na-ebi. Ụfọdụ ndị kwuru na ihe ahụ ha mere bụ ka ndị mmadụ kwuwe maka ya. A ga na-egosi ihe a ha mere na tiivi. Ọtụtụ nde mmadụ ga na-ekwukwa ihe ha chere banyere ya n’Ịntanet ruo ọtụtụ ụbọchị.

IHE a a kọrọ gosiri na onye a ma ama pụta n’ihu ọha mee ka a mara na ya na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya, ma ọ bụ na ya na-edina ma nwoke ma nwaanyị, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ejikarị ya emere isi akụkọ. Ụfọdụ na-aja ụdị ndị ahụ mma na ha nwere obi ike; ma ndị ọzọ na-akatọ ha na ihe ha na-eme adịghị mma. Ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwu na e kwesịghị inye ha nsogbu n’ihi na ọ bụ otú ha kpebiri isi bie ndụ ha. Daniel, dị afọ iri abụọ na otu, sịrị: “Mgbe m ka na-aga ụlọ akwụkwọ, ụmụ akwụkwọ na-anaghị edina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha weere na onye ụdị omume a na-ewe iwe bụ onye na-akpọ ndị ọzọ asị ma na-ekpe ha ikpe.”

Otú e si ele nwaanyị idina nwaanyị anya n’otu obodo nwere ike ịdị iche n’otú e si ele ya anya n’obodo ọzọ, otú e sikwa ele ya anya ugbu a nwere ike ịdị iche n’otú e si elebu ya anya. * Ma Ndị Kraịst anaghị ekwe ka “ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị” ha. (Ndị Efesọs 4:14) Kama nke ahụ, ha na-eme ihe ọ bụla Baịbụl kwuru.

Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere nwaanyị idina nwaanyị? Ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru, gịnị ka ị ga-agwa mmadụ ma o kwuo na ị kpọrọ ndị na-eme ụdị omume ahụ asị ma ọ bụ na ị na-ekpe ha ikpe? Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị e nwere ike ịjụ gị ma ọ bụ ihe e nwere ike ịgwa gị nakwa ihe i nwere ike ịza.

“Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere nwaanyị idina nwaanyị?”

“Baịbụl kwuru hoo haa na Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị nwoke na nwaanyị bụ́ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 1:27, 28; Levitikọs 18:22; Ilu 5:18, 19) Mgbe Baịbụl kwuru na ịkwa iko adịghị mma, ọ na-ekwu banyere nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị nakwa nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye idina.” *Ndị Galeshia 5:19-21.

“Gịnị ka gịnwa chere banyere nwaanyị idina nwaanyị?”

“Akpọghị m ndị na-eme ụdị omume ahụ asị, ma enweghị m ike ịnabata ụdị omume ahụ.”

Ihe ị ga-eburu n’uche: Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, ọ bụ ihe i kpebiri ime. Ọ bụ gị kwesịrị ikpebi otú ị ga-esi na-ebi ndụ. (Jọshụa 24:15) Ya emela gị ihere.—Abụ Ọma 119:46.

“Ọ̀ bụ na Ndị Kraịst ekwesịghị ịkwanyere mmadụ niile ùgwù, n’agbanyeghị otú ha kpebiri isi na-enwe mmekọahụ?”

“Ee, ha kwesịrị. Baịbụl kwuru, sị: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.” (1 Pita 2:17) N’ihi ya, Ndị Kraịst anaghị akpọ ndị na-edina nwaanyị ibe ha asị. Ha na-egosi mmadụ niile obiọma, ma ndị na-edina nwaanyị ibe ha.—Matiu 7:12.

“Í cheghị na otú a i si ele omume a anya ga-eme ka ndị ọzọ kpọwa ndị na-eme ya asị?”

“Mbanụ. Ihe m kpọrọ asị bụ omume ahụ, ọ bụghị ndị na-eme ya.”

I nwekwara ike ikwu, sị: “Dị ka ihe atụ, ekpebiri m na agaghị m aṅụ sịga. N’eziokwu, ịṅụ sịga na-asọ m oyi. Ma ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga, agaghị m akpọ gị asị n’ihi ya, otú ahụ gịnwa na-agaghịkwa akpọ m asị n’ihi na anaghị m aṅụ sịga. Ọ́ bụghị eziokwu? Otú ahụ ka ọ dịkwa n’otú mụ na gị si ele nwaanyị idina nwaanyị anya.”

“Ọ̀ kwa Jizọs sịrị onye ekpela ibe ya ikpe? N’ihi ya, ọ̀ bụ na Ndị Kraịst ekwesịghị ịhapụ ndị na-eme omume a ka ha biwe ndụ otú o si sọ ha?”

“Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ebi ndụ otú masịrị ha. Kama, ọ kụziri na ọ bụ “onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya” ka a ga-azọpụta. (Jọn 3:16) Inwe okwukwe na Jizọs pụtara irubere iwu Chineke isi. Iwu Chineke kwuru na e nwere omume ndị na-adịghị mma, dị ka nwaanyị idina nwaanyị.—Ndị Rom 1:26, 27.

“Ndị na-eme ụdị omume ahụ agaghị akwụsịli ya; o si ha n’ọbara.”

“Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla banyere otú ahụ́ ndị na-eme ụdị omume a si arụ ọrụ, ma o kwuru na e nwere àgwà ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’obi ndị mmadụ. (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5) Ọ bụrụgodị na ụdị omume ahụ na-agụ ụfọdụ ndị agụụ, Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha zere ya.”

Aro: Kama ịrụwa ụka banyere ihe mere o ji agụ ụfọdụ ndị agụụ idina nwaanyị ibe ha, mee ka o doo anya na Baịbụl kwuru na ụdị omume ahụ adịghị mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịsị ya: “Ọ̀ kwa ị ma na e nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe mere ụfọdụ ndị ji ewe iwe ọkụ bụ na o si ha n’ọbara? (Ilu 29:22) Ka anyị were ya na ihe ahụ ha kwuru bụ eziokwu. O nwere ike ịbụ na ị ma na Baịbụl kwuru na iwe iwe ọkụ adịghị mma. (Abụ Ọma 37:8; Ndị Efesọs 4:31) À ga-asị na ihe ahụ Baịbụl kwuru adịghị mma naanị n’ihi na e nwere ndị na-ewe iwe ọkụ?”

“Gịnị mere Chineke ga-eji gwa onye ọ na-agụ agụụ idina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ka ọ ghara ime otú ahụ? Ọ́ naghị egosi na Chineke dị obi ọjọọ?”

“Ndị na-eche echiche otú ahụ bụ ndị chere na ndị mmadụ ga-emerịrị ihe ọ bụla na-agụ anụ ahụ́ ha. Baịbụl kwuru na Chineke kwanyeere ndị mmadụ ùgwù n’ihi na o kere ha ka ha nwee ike ikpebi na ha agaghị eme ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ ma ọ bụrụ eziokwu na ha chọrọ izere ya.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

“Ọ bụrụgodị na ị naghị eme omume ahụ, i kwesịrị ịgbanwe otú i si ele ya anya.”

“Ka e were ya na ịgba chaa chaa anaghị amasị m, ma ọ na-amasị gị. Ọ̀ ga-adị mma ka i siwe ọnwụ ka m gbanwee otú m si ele ịgba chaa chaa anya naanị n’ihi na ọtụtụ nde mmadụ na-agba chaa chaa?”

Ihe ị ga-eburu n’uche: Ndị na-edina nwaanyị ibe ha kpọrọ ihe ndị dị ka igwu wayo, ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ agha asị, dịkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ kpọrọ ya. Baịbụl kpọkwara ihe ndị ahụ asị; o kwukwara na ụdị mmekọahụ ndị dị ka nwoke idina nwoke adịghị mma.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

Baịbụl anaghị ekwu ihe na-abaghị uru, o kwughịkwa ka anyị kpọọ ndị mmadụ asị. Ihe o kwuru bụ na ndị ọ na-agụ agụụ idina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha kwesịrị ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ,’ otú ahụ ụmụ nwoke ọ na-agụ agụụ idina ụmụ nwaanyị kwesịkwara ime.—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ nde ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-ejide onwe ha n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara ha. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-anaghịzi atụcha anya ịlụ di ma ọ bụ nwunye nakwa ọtụtụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwere nkwarụ, nke mere na ha na ha anaghịzi enwe mmekọahụ. Ndị a niile ka na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha anaghị enwe mmekọahụ na-agụ ha. Ndị ọ na-agụ agụụ idina nwaanyị ibe ha nwere ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ime uche Chineke n’eziokwu.—Diuterọnọmi 30:19.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 28 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ụfọdụ ụmụ agbọghọ chere na ha na nwa okorobịa ha na ya na-akpa nwee mmekọahụ, ọ ga-eme ka ha dịkwuo ná mma. Chọpụta ihe mere o ji ghara ịbụ eziokwu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 N’isiokwu a, ihe anyị ga na-ekwukarị bụ ‘ụmụ nwaanyị ndị na-edina nwaanyị ibe ha.’ Ma ihe e kwuru gbasara ụmụ nwoke ndị na-edina nwoke ibe ha.

^ par. 8 Na Baịbụl, “ịkwa iko” apụtaghị naanị inwe mmekọahụ, kama ọ pụtakwara mmadụ ịdịda ibe ya aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ n’ihe o ji bụrụ nwaanyị, ma ọ bụ iji ọnụ amị ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị, ma ọ bụ isi n’ikè enwe mmekọahụ.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.” —Ndị Kọlọsi 3:5.

NDỤMỌDỤ

N’agbanyeghị na àgwà ndị ọzọ nwere ike ịna-ewe gị iwe, emela ka ị̀ bụ onye oké ezi omume. Nke bụ́ eziokwu bụ na ha nwere ike iji aka ha kpebie ihe ha chọrọ ikweta otú ahụ gịnwa na-eme.

Ị̀ MA NA . . . ?

Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha tupu ha aghọọ Ndị Kraịst gbanwere ndụ ọjọọ ha, ‘a sachaa ha’ n’anya Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

IHE M GA-EME!

Mmadụ kwuo na ihe Baịbụl kwuru banyere nwaanyị idina nwaanyị bụ ihe ndị mgbe ochie, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Iji gosi na ihe m kpọrọ asị bụ mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya, ọ bụghị ndị na-eme ya, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere o ji bụrụ na ọ bụ Chineke kwesịrị inye ndị mmadụ iwu banyere otú ha ga-esi na-ebi ndụ?

● Olee uru ị na-erite n’ihi ibi ndụ otú Baịbụl kwuru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 170]

“N’ụlọ akwụkwọ, otu nwa okorobịa chere na m kpọrọ ya asị n’ihi na otú o si ebi ndụ adịghị mụ mma. Ma mgbe m kọwaara ya na ọ bụghị yanwa ka m kpọrọ asị, ya aghọtakwa na ọ bụghị naanị nwoke idina nwoke ka m kpọrọ asị, kamakwa na ọ bụ omume rụrụ arụ niile, ọ malitere ịkwanyere m ùgwù ma na-agbachitere m mgbe ndị ọzọ kwuru na ihe m na-eme adịghị mma.”—Aubrey

[Igbe dị na peeji nke 168]

Ọ́ Bụrụkwanụ Idina Ma Nwoke Ma Nwaanyị?

Ọ bụ eziokwu na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eme ya, ọ dị ka ọ̀ bụ ụmụ agbọghọ na-akacha eme ya. Ụfọdụ na-eme ya n’ihi na ha chọrọ ịma otú ọ na-adị. Lisa bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na isii kwuru, sị: “A na-egosikarị ebe nwa agbọghọ na-esusu nwa agbọghọ ibe ya ọnụ ma na fim ma na tiivi, a na-agụkwa ya n’egwú. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji achọ ime ya ka ha mara otú ọ na-adị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha echeghị na ọ bụ ihe ọjọọ.”

Ụfọdụ ndị na-eto eto chere na ihe na-akpata ya bụ mmasị si ha n’obi. Vicky bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na atọ kwuru, sị: “N’ebe anyị gara oriri, m hụrụ ụmụ agbọghọ abụọ na-edina ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Otu enyi m mechara gwa m na ihe m masịrị ha. Emechara m malite ide ozi n’ekwe ntị na-ezigara otu n’ime ha. Ka oge na-aga, ọ malitere iri obi m.”

È nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ ọ dị Vicky? Ọtụtụ ndị ga-agwa gị ka ọ ghara ime gị ihere igosi ọhaneze na idina ma nwoke ma nwaanyị ibe gị na-amasị gị. Ma, i kwesịrị iburu n’obi na ọ bụrụ na ọ na-agụ mmadụ agụụ ka ya na nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ, agụụ ahụ nwere ike ịkwụsị ka oge na-aga. Vicky chọpụtara na ọ bụ eziokwu. Otú ahụ ka Lisette bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na isii mekwara. Ọ sịrị: “Ịgwa ndị mụrụ m ihe na-agụ m agụụ mere ka obi ruo m ala. Ihe a kụziiri anyị n’ụlọ akwụkwọ mekwara ka m ghọta na mgbe mmadụ na-eto eto, ahụ́ ya na-agbanwe nke ukwuu. Obi siri m ike na ndị na-eto eto mata ihe ndị na-eme n’ahụ́ ha, ha ga-aghọta na ọ bụrụ na ọ na-agụ mmadụ agụụ ka ya na nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ, o nwere ike imecha tofee ya. Ọ ga-emekwa ka ha ghara inwewe ụdị mmekọahụ ahụ.”

Ọ bụrụgodị na agụụ ahụ ekweghị akwụsị, cheta na Baịbụl kwuru otu ihe ị ga-emeli: I nwere ike ikpebi na ị gaghị eme ihe ọjọọ na-agụ gị, ihe ọ sọrọ ya bụrụ.

[Foto dị na peeji nke 169]

E nwegodị ebe ọtụtụ ndị tinyere isi, Ndị Kraịst na-akata obi ghara iso ha