Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Anyị Bi n’Obodo Ọzọ?

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Anyị Bi n’Obodo Ọzọ?

ISI NKE 22

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Anyị Bi n’Obodo Ọzọ?

Gị na papa gị ma ọ bụ mama gị ùnu bi ná mba ọzọ?

□ Ee □ Ee e

Asụsụ a na-asụ ma ọ bụ otú e si eme ihe n’ụlọ akwụkwọ unu ọ̀ dị iche n’asụsụ a na-asụ ma ọ bụ otú e si eme ihe n’ụlọ unu?

□ Ee □ Ee e

“Anyị bụ ndị Ịtali. Ndị obodo anyị anaghị ezo ịhụnanya ha ezo. Ugbu a, anyị bi na Briten. N’ebe a, ọ dị ka ndị mmadụ anaghị eme ihe otú ọ sọrọ ha, onye ọ bụla na-anọrọ onwe ya. Ọ na-adị m ka e nweghị ebe m kwụ akwụ. Amaghị m ma à ga-akpọ m onye Ịtali ka à ga-akpọ m onye Briten.”—Giosuè, bi n’Ingland.

“N’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi anyị gwara m ka m na-ele ya anya mgbe ọ na-ekwu okwu. Ma n’ụlọ anyị, m lee papa m anya mgbe ọ na-agwa m okwu, ya asị na m na-akparị ya. Ọ dị m ka e nweghị ebe m kwụ akwụ n’omenala abụọ ahụ.”—Patrick, a mụrụ ya na Frans, ma, papa ya na mama ya bụ ndị Ọljirịa.

Ọ BỤRỤ na gị na ndị mụrụ gị bi ná mba ọzọ, o siiri ha ezigbo ike mgbe ha kwabatara. Ozugbo ahụ, ha chọpụtara na asụsụ ndị obodo ahụ, omenala ha, na ejiji ha dị iche. O doro anya na ha gbapụrụ iche. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ndị mmadụ na-akparị ha, kpọọkwa ha asị.

È metụla gị ụdị ihe ahụ? N’okpuru ebe a, e dere ụfọdụ nsogbu bịaara ndị na-eto eto e metụrụla ụdị ihe ahụ. Kanye ✔ na nke ọ bụla kacha esiri gị ike.

Ịkwa emo. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Noor dị obere mgbe ezinụlọ ha si n’obodo Jọdan kwaga Ebe Ugwu Amerịka. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ ji anyị mere ihe ọchị n’ihi na ejiji anyị dị iche. Anyị anaghịkwa aghọta ihe na-atọ ndị Amerịka ọchị.”

Amaghị m ebe m kwụ akwụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nadia kwuru, sị: “A mụrụ m na Jamanị. Ebe ndị mụrụ m bụ ndị Ịtali, m na-eji olu ndị Ịtali asụ asụsụ Jaman. Ụmụ akwụkwọ ibe m na-akpọ m ‘onye mbịarambịa bụ́ onye iberiibe.’ Ma m gaa Ịtali, m na-achọpụta na m na-eji olu Jaman asụ asụsụ Ịtali. N’ihi ya, ọ na-adị m ka e nweghị ebe m kwụ akwụ. M na-abụ onye mbịarambịa n’ebe ọ bụla m gara.”

Otú e si eme ihe n’ụlọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ana dị afọ asatọ mgbe ya na ndị ezinụlọ ha kwagara Ingland. O kwuru, sị: “O sighịrị mụ na nwanne m nwoke ike ịmụta ime ka ndị Lọndọn. Ma o siiri ndị mụrụ m ike, n’ihi na ha biri ọtụtụ afọ na Madera, bụ́ obere agwaetiti dị na Pọchụgal.”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Voeun dị afọ atọ mgbe ya na ndị mụrụ ya, bụ́ ndị Kambodia, kwagara Ọstrelia. O kwuru, sị: “Ndị mụrụ m amụtachabeghị ime ka ndị Ọstrelia. Iwe na-ewekarị papa m na anaghị m aghọta otú obi dị ya na otú o si eche echiche.”

Ịsụ asụsụ ọzọ n’ụlọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ian dị afọ asatọ mgbe ya na ndị ezinụlọ ha si Ekwedọọ kwaga Amerịka. Mgbe ha birila afọ isii n’ebe ahụ, o kwuru, sị: “Ana m asụ Bekee ugbu a karịa Spanish. Ndị nkụzi anyị n’ụlọ akwụkwọ na-asụ Bekee, ndị enyi m na-asụ Bekee, mụ na nwanne m nwoke na-asụkwa Bekee. Bekee eriela m isi, mee ka m na-echezọ Spanish.”

A mụrụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lee n’Ọstrelia, ma ndị mụrụ ya bụ ndị Kambodia. O kwuru, sị: “M chọọ ịkọwakwuru ndị mụrụ m ihe m na-ekwu mgbe mụ na ha na-akparịta ụka, m na-achọpụta na ọ na-esiri m ike ịsụ asụsụ ha.”

Noor, bụ́ onye e dere ihe o kwuru ná mmalite, sịrị: “Papa m siri ọnwụ na ọ bụ asụsụ anyị bụ́ Arabik ka a ga na-asụ n’ụlọ anyị, ma anyị achọghị ịna-asụ ya. Anyị chere na ịmụ Arabik bụ inyewe onwe anyị nsogbu na-enweghị isi. Ndị enyi anyị na-asụ Bekee. A na-asụ Bekee n’ihe niile anyị na-ele na tiivi. Ànyị jikwanụ Arabik eme gịnị?”

Gịnị Ka I Nwere Ike Ime?

Ihe ndị a e kwuru gosiri na ọ bụghị naanị gị na-enwe ụdị nsogbu ndị a siri ike. Kama ịgbalị imeri nsogbu ndị ahụ, i nwere ike ikpebi ichefu ihe ọ bụla gbasara obodo gị, mewezie ka ndị ebe ahụ unu bi. Ma, ime otú ahụ nwere ike iwe ndị mụrụ gị iwe, meekwa ka obi ghara izu gị ike. Kama ime otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ma ị gbalịa mụta otú ị ga-esi merie nsogbu ndị ahụ, jirikwa oge a mee ihe ga-akacha baara gị uru? Tụlee aro ndị a:

Otú ị ga-esi na-ele ịkwa emo anya. Ihe ọ sọkwara gị mee, ọ bụghị mmadụ niile ka ihe gị ga-amasị. Ndị ịkwa emo na-atọ ụtọ ga-ahụrịrị ihe ha ga-eji kwaa gị emo. (Ilu 18:24) N’ihi ya, agbalịla ime ka ha kwụsị ịkpọ gị asị. Ọ bụ igbu oge. Eze Sọlọmọn maara ihe chọpụtara na “onye na-akwa emo adịghị ahụ onye na-abara ya mba n’anya.” (Ilu 15:12) Onye kwuo ihe gosiri na ọ kpọrọ mmadụ asị, ihe o kwuru agaghị eme ka a mata ihe ọjọọ o chere na onye ahụ mere, kama ọ ga-egosi na yanwa amaghị ihe.

Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị maghị ebe ị kwụ akwụ. O nweghị onye chọrọ ka ọ nọrọ naanị ya n’enweghị ezinụlọ ma ọ bụ obodo ọ ga-akpọ nke ha. Ma i kwesịghị iche na ihe a ga-eji mata na ị bara uru bụ obodo ma ọ bụ ezinụlọ i si. Ndị mmadụ nwere ike ịkparị gị ma ọ bụ sọpụrụ gị n’ihi ụdị ihe ahụ, ma Chineke anaghị eme otú ahụ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ị gbalịsie ike ime uche Jehova Chineke, ọ ga-ewere gị ka onye ezinụlọ ya. (Aịzaya 43:10; Mak 10:29, 30) O nweghị ihe karịrị iso n’ezinụlọ Jehova!

Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na a na-asụ asụsụ ọzọ n’ụlọ unu. N’ezinụlọ ọ bụla, obi ndị nne na nna na ụmụ ha anaghị abụ otu mgbe niile. I nwere ike iche na nke ezinụlọ unu ka nke ndị ọzọ njọ n’ihi na ndị mụrụ gị chọrọ ka ị na-eme ka ndị obodo unu, ma gịnwa achọọ ịna-eme ka ndị obodo ebe unu bi ugbu a. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe gaziere gị, i kwesịrị ‘ịsọpụrụ nna gị na nne gị.’—Ndị Efesọs 6:2, 3.

Kama ịjụ omenala ndị mụrụ gị n’ihi na ọ dịghị gị mma, gbalịa chọpụta ihe mere ndị mụrụ gị ji jiri omenala ndị ahụ kpọrọ ihe. (Ilu 2:10, 11) Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Omenala ahụ ò megidere ihe Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na o megideghị ya, gịnị mere m ji kpọọ ya asị? Olee otú m ga-esi gwa ndị mụrụ m ihe m chere n’akparịghị ha?’ (Ọrụ 5:29) N’eziokwu, ị mụta asụsụ ndị mụrụ gị nke ọma, ọ ga-enyere gị aka ịna-asọpụrụ ha, ya bụ, ị ga na-aghọta otú ha si eche echiche ma na-agwa ha otú obi dị gị.

Otú unu ga-esi merie nsogbu gbasara asụsụ n’ụlọ unu. Ụfọdụ ezinụlọ achọpụtala na e nye iwu na naanị ihe a ga na-asụ n’ụlọ bụ asụsụ obodo ha, ụmụ ha ga-enwe ike ịmụta ya, mụtakwa asụsụ a na-asụ n’ebe ha bi. Ọ́ gaghị adị mma ma unu mee otú ahụ n’ụlọ unu? I nwekwara ike ịgwa ndị mụrụ gị ka ha kụziere gị otú e si ede asụsụ obodo unu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Stelios toro na Jamanị, ma asụsụ obodo ha bụ Grik. Ọ sịrị: “Ndị mụrụ m na-akọwara m otu amaokwu Baịbụl kwa ụbọchị. Ha na-agụpụtara m ya, mụ edee ya edee. Ugbu a, ana m agụ ma Grik ma Jaman, na-edekwa ha.”

Olee uru ọzọ ị ga-erite ma ị mụta asụsụ unu? Giosuè, bụ́ onye e dere ihe o kwuru ná mmalite, sịrị: “Amụtara m asụsụ obodo anyị n’ihi na m chọrọ ịna-aghọta ndị mụrụ m, otú obi dị ha, nakwa ihe ha na-eche banyere Jehova. O meela ka mụ na ha dị ná mma. O nyekwaara ha aka ịghọta m.”

Ò Yiri Àkwà Mmiri Ka Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi?

Ì chere na obodo ebe i si ga-eme ka gị na ndị ọzọ ghara ịdị ná mma, ka ò yiri àkwà mmiri ga-eme ka gị na ha na-emekọ ihe? Ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst achọpụtala na e nwere ezigbo ihe mere ha ga-eji gbalịa ime ka ha na ndị na-abụghị ndị obodo ha dị ná mma. Ha chọrọ ịgwa ndị si obodo ọzọ kwabata ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Otu nwa okorobịa aha ya Salomão si n’obodo ha kwaga Lọndọn mgbe ọ dị afọ ise. Ọ sịrị: “Ọ na-atọ m ezigbo ụtọ ịkọwa Baịbụl n’asụsụ abụọ. Ọ fọrọ obere ka m chefuo asụsụ anyị, ma ugbu a m nọ n’ọgbakọ na-asụ Pọchugiiz, m na-asụ ma Bekee ma Pọchugiiz nke ọma.”

Noor, bụ́ onye e deburu ihe o kwuru, chọpụtara na a chọrọ ndị ga-eji asụsụ Arabik zie ndị mmadụ ozi ọma. Ọ sịrị: “Ugbu a, m na-aga ebe a na-akụzi Arabik. Amụtawala m okwu ndị m chefuru echefu. Otú m si ele ihe anya agbanweela. Ugbu a, m chọrọ ka a na-agbazi m olu. M chọrọ ịmụta Arabik.”

N’eziokwu, ọ bụrụ na i si n’obodo unu kwaga obodo ọzọ, marakwa asụsụ abụọ ma ọ bụ karị, ọ ga-abara gị ezigbo uru. Ịma asụsụ abụọ ahụ ga-eme ka i nwekwuo ike ịghọta otú obi na-adị ndị mmadụ, nyekwara gị aka ịza ajụjụ ndị ha na-ajụ banyere Chineke. (Ilu 15:23) A mụrụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Preeti n’Ingland, ma nne ya na nna ya bụ ndị India. Ọ sịrị: “Obi na-esi m ezigbo ike mgbe m nọ n’ozi ọma n’ihi na m na-aghọta asụsụ abụọ. M na-aghọta ma ndị Ingland ma ndị India, ya bụ, ihe ha kweere na otú ha si eche echiche.”

Ì nwere ike ịghọta na ọnọdụ gị ga-abara gị uru kama ịbụrụ gị nsogbu? Cheta na Jehova hụrụ gị n’anya n’ihi ụdị onye ị bụ, ọ bụghị n’ihi obodo unu. Dị ka ndị na-eto eto e dere ihe ha kwuru n’isiokwu a, ì nwere ike iji amamihe gị na ihe ị mụtara nyere ndị si n’obodo unu aka ịmata Jehova, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya, onye na-adịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu? Ime otú ahụ ga-eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ!—Ọrụ 20:35.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.”—Ọrụ 10:34.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ndị ọgbọ gị na-achị gị ọchị n’ihi obodo ebe i si, ekwela ka o wee gị iwe kama gbachi ha nkịtị. I mee otú a, ha nwere ike ịkwụsị ịchị gị ọchị.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ị mụta asụsụ abụọ, o nwere ike ime ka ịchọta ọrụ dịrị gị mfe.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme iji mụtakwuo asụsụ obodo anyị bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee otú ịmata ihe gbasara obodo unu ga-esi enyere gị aka ịghọtakwu onwe gị?

● Ọ bụrụ na unu bi n’obodo ọzọ, olee uru ndị ị na-erite karịa ndị na-eto eto ibe gị, bụ́ ndị na-esighị n’obodo ọzọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 160]

“Inyere ndị ọzọ aka na-eme m obi ụtọ. M hụ ndị na-asụ Rọshịan, French, ma ọ bụ Moldovan, m nwere ike ịkọwara ha Baịbụl.”—Oleg

[Foto dị na peeji nke 161]

I nwere ike ile ihe gbasara obodo ebe i si anya dị ka àkwà mmiri ga-eme ka gị na ndị ọzọ na-emekọ ihe