M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?
ISI NKE 19
M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?
Olee ebe i chere i kwesịrị ịgụru akwụkwọ? ․․․․․
Olee ebe ndị mụrụ gị chọrọ ka ị gụruo? ․․․․․
IHE i dere na ha abụọ ọ̀ bụ otu? Ọ bụrụgodị na ọ bụ otu, ya abụrụkwa na ị ka na-aga ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka ị kwụsị. È nwetụla mgbe ọ dị gị otú ọ dị ndị a e dere okwu ha n’okpuru ebe a?
“Mgbe ụfọdụ, ike ụlọ akwụkwọ na-agwụ m nke na ọ naghị adị m ka m si n’ebe m dina bilie. Ihe m na-eche bụ, ‘Oleedị uru ọ baara m ịga ụlọ akwụkwọ na-amụ ihe na-agaghị abara m uru?’”—Rechel.
“O nweela ọtụtụ mgbe ike ụlọ akwụkwọ gwụrụ m nke na
ọ dị m ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma gaa chọrọ ọrụ. Ọ na-adị m ka o nweghị uru ụlọ akwụkwọ m na-aga na-abara m nakwa na ọ ga-akara m mma imewe ihe ga na-enye m ego.”—Jọn.“M gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’obodo mepere emepe. O sikwaara m ike imeta ndị enyi. Ihe a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ esighịrị m ike, ma ndị mmadụ na-agbara m ọsọ, nke mere ka m na-anọkarị naanị m. Ndị ọzọ a kpọrọ asị anaghịdị atụpụrụ m ọnụ! Ọ dị m ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ.”—Ryan.
“E nwere mgbe ihe ndị nkụzi nyere m rụọ n’ụlọ na-ewe m awa anọ n’abalị ọ bụla! Ihe a ga-ede ede na ihe a ga-agụ agụ na ule a ga-ele ekweghị m kuru ume ndụ, nke mere ka m chee na ọ karịala, mụ achọọkwa ịkwụsị.”—Cindy.
“N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere mgbe anyị gbara ọsọ n’ihi ụjọ bọmbụ. E nweela mmadụ atọ chọrọ igbu onwe ha, nwee onye gburu onwe ya, nweekwa tigbuo zọgbuo ndị òtù ọjọọ kpatara. Mgbe ụfọdụ, o nwere ebe ọ na-eru, mụ achọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ.”—Rose.
Ì nwetụla ụdị nsogbu ndị a? Ọ bụrụ na i nwetụla, gịnị mere i ji chọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ?
․․․․․
O nwere ike, i chesiwela echiche ike ugbu a ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ. Ma olee otú ị ga-esi amata ma ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ọ̀ bụ na ị gụruola ebe i kwesịrị ịgụru ka ọ̀ bụ na ike ụlọ akwụkwọ agwụla gị?
Ọ̀ Dị Mma Ka M Kwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?
Ị̀ ma na ná mba ụfọdụ, gọọmenti chọrọ ka ndị na-eto eto gụọ akwụkwọ afọ ise ma ọ bụ afọ asatọ ma ọ dịkarịa ala? Ná mba ndị ọzọ, gọọmenti chọrọ ka nwa akwụkwọ ọ bụla gụọ akwụkwọ afọ iri ma ọ dịkarịa ala. N’ihi ya, afọ ole nwa akwụkwọ ga-adị tupu ya agụchaa akwụkwọ ma ọ bụ afọ ole ọ ga-agụru akwụkwọ abụghị otu n’ụwa niile.
Ihe ọzọ bụ na ná mba ụfọdụ, kama nwa akwụkwọ ịgawa ụlọ akwụkwọ, ndị nkụzi nwere ike ịna-aga n’ụlọ ha na-akụziri ya ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe niile a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ekpebie ka ndị nkụzi na-abịa n’ụlọ akụziri ụmụ ha ihe, a gaghị asị na ụmụaka ahụ akwụsịla ịga ụlọ akwụkwọ.
N’ihi ya, ma ndị nkụzi hà na-akụziri gị ihe n’ụlọ unu ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịkwụsị ịgụ akwụkwọ tupu oge ị ga-agụcha eruo, i kwesịrị ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a:
Gịnị ka iwu obodo anyị kwuru? Dị ka anyị kwuru ná mmalite, afọ ole gọọmenti kwuru nwa akwụkwọ ga-agụru akwụkwọ ma ọ́ dịkarịa ala abụghị otu n’obodo niile. Afọ ole ka iwu obodo unu kwuru ka nwa akwụkwọ gụruo akwụkwọ ma ọ́ dịkarịa ala? Ị̀ gụruola ebe ahụ? Ọ bụrụ ị gụrughị ebe ahụ, ọ gaghị adị mma ma ị kwụsị, n’ihi na ọ bụrụ na ị kwụsị, ọ pụtara na ị naghị ‘edo onwe gị n’okpuru ndị ọchịchị’ dị ka Baịbụl kwuru.—Ndị Rom 13:1.
Àmụtala m ihe ndị m chọrọ ịmụta? Olee ihe ndị ị chọrọ ịmụta n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụrụ na ị mabeghị ihe ị chọrọ, i kwesịrị ịchọpụta! Ma ọ́ bụghị ya, ị ga-adị ka onye banyere n’ụgbọ okporo ígwè ma ọ maghị ebe ọ chọrọ ịga. N’ihi ya, gakwuru ndị mụrụ gị ka ha nyere gị aka dejupụta igbe dị na peeji nke 139, nke isiokwu ya bụ, “Ihe Ndị M Chọrọ Ịmụta n’Ụlọ Akwụkwọ.” Ime otú ahụ ga-enyere gị aka izere ihe ga-emegharị gị anya, nyekwara gị na ndị mụrụ gị aka ikpebi ebe ị ga-agụru.—Ilu 21:5.
O doro anya na ndị nkụzi unu na ndị ọzọ nwere ike ịtụrụ gị aro ebe ị ga-agụru. Ma, ọ bụ ndị mụrụ gị ga-ekpebi ebe ị ga-agụru. (Ilu 1:8; Ndị Kọlọsi 3:20) Ọ gaghị adị mma ka ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ị gụrubeghị ebe gị na ndị mụrụ gị kpebiri na ị ga-agụru.
Jeremaya 17:9) Ndị mmadụ chọọ ime ihe na-enweghị isi, ha na-achọta ihe ha ga-asị na ọ bụ ya mere ha ji chọọ ime ya.—Jems 1:22.
Gịnị mere m ji chọọ ịkwụsị? Kpachara anya ka ị ghara ịghọgbu onwe gị. (Dee ezigbo ihe ndị nwere ike ime ka ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ n’agụchaghị agụcha.
․․․․․
Dee ihe ndị na-enweghị isi mere i ji chọọ ịkwụsị.
․․․․․
Olee ezigbo ihe ndị i dere? Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ka i nwee ike kpatawa ego ị ga-eji na-enyere ndị ezinụlọ unu aka ma ọ bụ ka i nyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke. Ihe ndị na-enweghị isi nwere ike ịbụ ka ị gbaara ule ọsọ ma ọ bụ ka ị kwụsị ịrụ ihe ndị nkụzi na-enye gị ka ị rụọ n’ụlọ. O nwere ike isiri gị ike ịchọpụta ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, nakwa ịchọpụta ma ọ̀ bụ ezigbo ihe ka ọ̀ bụ ihe na-enweghị isi.
Lee anya n’ihe ndị ahụ i dere. N’eziokwu gị niile, olee ihe kacha mkpa mere i ji chọọ ịkwụsị? Na nke ahụ kacha mkpa, dee 5. Na nke na-eso ya, dee 4. Derezie ya otú ahụ na-agbada. Ọ bụrụ na ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ iji gbaara nsogbu ọsọ, i nwere ike imecha kwaa mmakwaara.
Gịnị Mere na I Kwesịghị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?
Ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ yiri isi n’ụgbọ okporo ígwè wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga. O nwere ike ịbụ na ahụ́
erughị gị ala n’ime ụgbọ ahụ ma ọ bụ na ndị gị na ha nọ na-akpasu gị iwe. Ma i si n’ụgbọ ahụ wụpụ, ị gaghị eru ebe ị na-aga, i nwekwara ike imerụ ezigbo ahụ́. N’ihi ya, ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, ị gaghị amụta ihe ndị ị chọrọ ịmụta, i nwekwara ike ịkpatara onwe gị ọtụtụ nsogbu ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Nsogbu ndị ahụ nwere ike ịbụ:Nsogbu ndị ị ma na ị ga-enwe: O nwere ike isiri gị ike inweta ọrụ. I nwetagodị ọrụ, o nwere ike ịbụ na ego a ga na-akwụ gị agaghị aha ka nke a gaara na-akwụ gị ma a sị na ị gụchara. Tupu gị enweta ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị, i nwere ike ịna-arụ ọrụ ọtụtụ awa n’ebe nwedịrị ike ịka ụlọ akwụkwọ unu njọ.
Nsogbu ndị ị na-amaghị na ị ga-enwe: Nchọpụta e mere gosiri na ọtụtụ ndị kwụsịrị ịga ụlọ akwụkwọ na-arịakarị ọrịa, na-agakarị mkpọrọ. Ha na-achọkarị onye ga-enye ha ihe.
N’eziokwu, ịgụcha akwụkwọ apụtaghị na ị gaghị enwe nsogbu ndị ahụ. Ma, gịnị mere ị ga-eji kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, bụ́ ihe ga-akpatara gị nsogbu?
Uru Ịgụcha Akwụkwọ Bara
Ị daa ule ma ọ bụ nwee nsogbu n’ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ime ka ike akwụkwọ gwụ gị n’ihi na ọ dị gị ka e nweghị nsogbu
ị ga-enwe n’ọdịnihu ga-aka nke ị na-enwe ugbu a. Ma tupu i kpebie na ọ kaara gị mma ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, gụọ uru ụmụ akwụkwọ e dere ihe ha kwuru ná mmalite isiokwu a kwuru ha ritere n’ihi na ha akwụsịghị ịga ụlọ akwụkwọ.“Amụtala m inwe ndidi na ichebara ihe echiche, mụtakwa na onye chọrọ inwe obi ụtọ n’ihe ọ na-eme kwesịrị ịgbanwe otú o si ele ihe anya. Amụtara m ihe ga-enyere m aka inweta ọrụ n’ihi na akwụsịghị m ịga ụlọ akwụkwọ.”—Rechel.
“Aghọtala m na m gbaa mbọ, m nwere ike ịmụta ihe m chọrọ ịmụta. Ihe m na-amụ n’ụlọ akwụkwọ bụ otú e si arụzi ígwè e ji ebi akwụkwọ, nke ga-enyere m aka inweta ụdị ọrụ m chọrọ ịrụ.”—Jọn.
“Ịgụcha akwụkwọ mere ka m mụta otú e si ede ihe na otú e si agụ ihe. Ụlọ akwụkwọ kụziiri m otú e si erite uru na mba a baara m nakwa otú m ga-esi na-ekwu ihe m bu n’obi ka o doo anya, nke bụ́ ihe na-abara m uru n’ozi ọma.”—Ryan.
“Ụlọ akwụkwọ enyerela m aka ịma ihe m ga-eme ma m nwee nsogbu, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ebe ọzọ. Ịmụta otú m si emeri nsogbu n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ enyerela m aka ịna-eme ihe ka onye toro eto.”—Cindy.
“Ụlọ akwụkwọ enyerela m aka ịmụta otú m ga-esi emeri nsogbu ndị m ga-enwe n’ụlọ ọrụ. N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere ọtụtụ ihe mere ka m chebara ihe m kweere echiche. N’ihi ya, ịnọ n’ụlọ akwụkwọ mere ka okwukwe m sie ike.”—Rose.
Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya. Onye nwere ndidi ka onye mmụọ ya dị mpako mma.” (Ekliziastis 7:8) N’ihi ya, kama ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, jiri ndidi chọpụta otú ị ga-esi merie nsogbu ndị ị na-enwe. I mee otú ahụ, ị ga-achọpụta na ọ ga-aka baara gị uru n’ikpeazụ.
Ọ́ bụrụkwanụ na ihe mere ike ụlọ akwụkwọ ji gwụ gị bụ na ihe anaghị adabara gị na onye nkụzi unu?
AMAOKWU BAỊBỤL
“Onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.”—Ilu 21:5.
NDỤMỌDỤ
Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike imeri nsogbu ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, jụọ ndị mụrụ gị ihe i nwere ike ime ka ihe dịtụrụ gị mfe, nke ga-eme ka i nwee ike ịgụcha akwụkwọ.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ụmụ akwụkwọ ndị na-anaghị agachi ụlọ akwụkwọ anya na-akwụsịkarị ịga ụlọ akwụkwọ n’agụchaghị agụcha.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na ihe a na-akụzi na-esiri m ike, kama ịgbara ya ọsọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na ọ na-adị m ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ n’ihi na ike ya agwụla m, ihe m ga-eme iji die ya bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mụta ịgụ ihe, ide ihe, na mgbakọ na mwepụ nke ọma?
● I kpebie ihe ị chọrọ ịmụta ugbu a n’ụlọ akwụkwọ, olee otú ọ ga-esi nyere gị aka iji oge ị nọ n’ụlọ akwụkwọ na-eme ihe bara uru?
● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị matatụ ugbu a banyere ọrụ ị chọrọ ịrụ mgbe ị gụchara akwụkwọ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 140]
“Ị gaghị agbanahụ nsogbu niile. Ịga ụlọ akwụkwọ ga-enyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi na-eme ihe i kpebiri ime, nke bụ́ ihe ga-abara gị uru n’ụlọ ọrụ nakwa n’ebe ndị ọzọ.”—Ramona
[Igbe dị na peeji nke 139]
Ebe M Dere Ihe
Ihe Ndị M Chọrọ Ịmụta n’Ụlọ Akwụkwọ
Ihe kacha mkpa mere mmadụ ji aga ụlọ akwụkwọ bụ ka ọ mụta ihe ga-enyere ya aka inweta ọrụ ọ ga-eji na-egbo mkpa ya na nke ezinụlọ o nwere ike inwe. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12) Ì kpebiela ụdị ọrụ ị chọrọ ịrụ na otú ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ga-esi nyere gị aka ịmụta ya? Zaa ajụjụ ndị a, ka ha nyere gị aka ịmata ma ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ọ̀ ga-eme ka ị mụta ihe ị chọrọ ịmụta:
Gịnị ka m ma eme? (Dị ka ihe atụ, gị na ndị mmadụ ùnu na-adị ná mma? Ọrụ aka ò doro gị anya? E nwee nsogbu, ị̀ ma otú e si achọpụta ihe kpatara ya nakwa otú e si emeri ya?) ․․․․․
Olee ụdị ọrụ m ga-eji ihe m mụtara rụọ? ․․․․․
Olee ụdị ọrụ m nwere ike inweta n’ebe m bi? ․․․․․
Gịnị ka m na-amụ ugbu a ga-enyere m aka inweta ọrụ? ․․․․․
Olee ihe ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ m kwesịrị ịmụ ugbu a ga-enyere m aka ịrụ ụdị ọrụ m chọrọ ịrụ? ․․․․․
Cheta na ihe mere i ji aga ụlọ akwụkwọ bụ ka ị mụta ihe ga-abara gị uru. N’ihi ya, abụla nwa akwụkwọ na-anaghị agụcha agụcha, nke chọrọ ịgbara ihe onye toro eto kwesịrị ịrụ ọsọ. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 67 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 38 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.
[Foto dị na peeji nke 138, 139]
Ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ yiri isi n’ụgbọ okporo ígwè wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga