Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndị Mụrụ M Anaghị Ekwe M Gaa Kporie Ndụ?

Gịnị Mere Ndị Mụrụ M Anaghị Ekwe M Gaa Kporie Ndụ?

ISI NKE 37

Gịnị Mere Ndị Mụrụ M Anaghị Ekwe M Gaa Kporie Ndụ?

Allison bụ nwa agbọghọ bi n’Ọstrelia. Ahụ́ anaghị eru ya ala n’ụbọchị Mọnde ọ bụla ọ gara ụlọ akwụkwọ.

Ọ sịrị: “Onye ọ bụla na-akọ ihe o mere ná ngwụcha izu. Ha na-akọ akụkọ ndị na-atọgbu onwe ha, dị ka oriri na nkwari ha gara, ụmụ okorobịa ole ha na ha susuru ọnụ, nakwa otú ha si gbanahụ ndị uwe ojii . . . Ihe ha na-akọ na-atụ ụjọ ma na-atọ ụtọ! Ha na-alọta n’elekere ise n’isi ụtụtụ, ma ọ naghị ewe ndị mụrụ ha iwe. Tupu ha agawadị ebe ndị ahụ, ndị mụrụ m agwala m gaa laba!

“Ma ọ na-abụ ha kọchaara m ihe ndị ha mere ná ngwụcha izu, ha ajụọ m ihe mụnwa mere. Agara m ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ọ na-adị m ka e kweghị m gaa kporie ndụ. N’ihi ya, m na-agwakarị ha na o nweghị ebe m gara. Ha ajụzie m ihe mere na esoghị m ha gaa.

“Ị ga-eche na ụbọchị Mọnde gafee, okwu ebie. N’ebeekwanụ! O ruhaala Tuzdee, onye ọ bụla ekwuwe ihe ọ ga-eme ná ngwụcha izu na-abịa abịa! Ihe m na-emekarị bụ ịna-egere ihe ha na-ekwu. Ọ na-adị m ka esoghị m biri!”

Ọ̀ NA-ADỊ gị otú ahụ n’ụlọ akwụkwọ unu n’ụtụtụ Mọnde ọ bụla? O nwere ike ịdị gị ka ndị na eto eto ibe gị hà nọ n’èzí na-egwuri egwu, ndị mụrụ gị akpọchibido gị ụzọ, ma ọ bụ ya adị gị ka à kpọ gị gaa oriri na nkwari, ma e kweghị gị detụ ihe ọ bụla ọnụ. Ọ bụghị na ị chọrọ ime ihe niile ndị na-eto eto ibe gị na-eme. Naanị ihe ị chọrọ bụ ka ị na-ekpori ndụ mgbe ụfọdụ! Dị ka ihe atụ, n’ime ihe ndị a e ji atụrụ ndụ, olee nke ị ga-achọ ime ná ngwụcha izu a?

□ ịgba egwú

□ ịga ebe a na-eti egwú

□ ihe ọzọ

□ ịga oriri na nkwari

□ ile fim ․․․․․

I kwesịrị ịna-atụrụ ndụ. N’eziokwu, Onye kere gị chọrọ ka i kporie ndụ n’oge ị na-eto eto. (Ekliziastis 3:1, 4) N’agbanyeghị na o nwere ike isiri gị ike ikweta mgbe ụfọdụ, ndị mụrụ gị chọkwara ka i kporie ndụ. Ma ihe abụọ nwere ike ịna-echu ndị mụrụ gị ụra bụ: (1) ihe ị ga-eme ma ị gaa na (2) ndị gị na ha ga-eso aga.

Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ndị enyi gị kpọọ gị ka unu gaa kporie ndụ ma ị maghị ihe ndị mụrụ gị ga-ekwu ma ị gwa ha? Tụlee ihe atọ i nwere ike ime na ihe nke ọ bụla ga-akpata.

NKE MBỤ AGWALA HA—GAWA

Ihe nwere ike ime ka ị chọọ ime ya: Ị chọrọ ime ka ndị enyi gị mata na ọ bụ gị na-ekpebi ihe ị ga-eme. I chere na ị ma ihe karịa ndị mụrụ gị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị naghị akwanyere ha ùgwù.—Ilu 14:18.

Ihe ọ ga-akpatara gị: O nwere ike ime ka obi dị ndị enyi gị ụtọ, ma ha ga-achọpụtakwa na ị dị aghụghọ. Ọ bụrụ na ị ghọgburu ndị mụrụ gị, i nwekwara ike ịghọgbu ndị enyi gị. Ndị mụrụ gị mechaa chọpụta, ọ ga-ewute ha, o nwekwara ike ime ka ha kwụsị gị ịga ebe ndị ọzọ ị chọrọ ịga! Inupụrụ ndị mụrụ gị isi ma gawa n’agwaghị ha bụ nzuzu.—Ilu 12:15.

NKE ABỤỌ AGWALA HA—AGALA

Ihe nwere ike ime ka ị chọọ ime ya: I chebarala ịga ebe ahụ echiche ma chọpụta na ihe a na-aga ime adịghị mma ma ọ bụkwanụ na ụfọdụ ndị ga-aga ya anaghị akpa àgwà ọma. (1 Ndị Kọrịnt 15:33; Ndị Filipaị 4:8) I nwekwara ike ịchọ ịga, ma obi akaghị gị ịgwa ndị mụrụ gị.

Ihe ọ ga-akpatara gị: Ọ bụrụ na ị gaghị n’ihi na ị ma na ọ dịghị mma ịga, obi ga-akakwu gị ịgwa ndị enyi gị na ị gaghị aga. Ma, ọ bụrụ na ihe mere na ị gaghị bụ na obi akaghị gị ịgwa ndị mụrụ gị, i nwere ike nọrọ n’ụlọ, obi ana-agbawa gị, gị ana-eche na ọ bụ naanị gị bụ onye na-anaghị ekpori ndụ.

NKE ATỌ GWA HA—MARA IHE HA GA-EKWU

Ihe nwere ike ime ka ị chọọ ime ya: Ị ghọtara na i kwesịrị irubere ndị mụrụ gị isi, ị na-akwanyekwara ha ùgwù. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ị hụrụ ndị mụrụ gị n’anya; ị chọghịkwa ịga n’agwaghị ha n’ihi na ọ ga-ewute ha. (Ilu 10:1) I nwekwara ike ịgwa ha ebe ị chọrọ ịga.

Ihe ọ ga-akpatara gị: Ndị mụrụ gị ga-ama na ị hụrụ ha n’anya, na ị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ha chọpụtakwa na ebe ị chọrọ ịga adịghị njọ, ha nwere ike ikwe gị gaa.

Ihe Nwere Ike Ime Ka Ndị Mụrụ Gị Sị Gị Agala

Ndị mụrụ gị sịkwanụ gị agala? O nwere ike iwe gị ezigbo iwe. Ma, ị ghọta ihe mere ha ji sị gị agala, o nwere ike ime ka ọ ghara iwe gị iwe. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịsị gị agala n’ihi ihe ụfọdụ e kwuru n’okpuru ebe a.

Ha ma ihe karịa gị. A sị gị họrọ ebe ị ga-aga gwuo mmiri, i nwere ike ịhọrọ ebe e nwere ndị na-agụpụta onye mmiri chọrọ iri. Maka gịnị? Maka na mmiri ị na-egwu tọwa gị ụtọ, ọ ga-esiri gị ike ịma mgbe ị banyewere ná nsogbu. Ma ndị ahụ na-agụpụta mmadụ na-anọ n’ebe ha ga-ahụ onye mmiri chọrọ iri.

Ndị mụrụ gị na-eme ụdị ihe ahụ. Ebe ọ bụ na ha ma ihe karịa gị, ha nwere ike ịhụ nsogbu ndị gịnwa na-ahụghị. Ha na-eme ka ndị na-agụpụta onye mmiri chọrọ iri. Ha ebughị n’obi igbochi gị ikpori ndụ, kama ha chọrọ inyere gị aka ka i zere nsogbu ndị nwere ike ime ka ị taa ahụhụ n’ọdịnihu.

Ha hụrụ gị n’anya. Ndị mụrụ gị achọghị ka ihe mee gị. Ị gwa ha ihe ị chọrọ ime, ọ bụ ịhụnanya ha mere ha ji ekwe mgbe ụfọdụ ma sị gị mba mgbe ụfọdụ. Ị rịọ ha ihe, ha na-ajụ onwe ha ma hà ga-edili nsogbu ọ ga-akpata ma ha kwe ka i mee ihe ahụ. Ha ga-ekwe ka i mee ihe ahụ ma o doo ha anya na o nweghị nsogbu ọ ga-akpatara gị na ha.

Ihe Ị Ga-eme Ka Ha Kwe Ka Ị Gaa

E nwere ihe anọ ị ga-eme.

Gwa ha eziokwu: Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịgwa onwe gị eziokwu. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji chọọ ịga ebe ahụ? Ọ̀ bụ ihe a ga-eme n’ebe ahụ na-atọ m ụtọ, ka m̀ na-aga n’ihi na m chọrọ ka ndị ọgbọ m na-ele m anya ọma? Ọ̀ bụ n’ihi na onye ihe ya masịrị m ga-abịa ebe ahụ?’ Gwazie ndị mụrụ gị eziokwu. E nwere mgbe ha hà ka gị, ha makwa gị nke ọma. N’ihi ya, ha nwere ike ịchọpụta ihe mere i ji chọọ ịga, ọ bụrụgodị na ị gwaghị ha. Obi ga-adị ha ụtọ ma ị gwa ha eziokwu. Ị ga-eritekwa uru n’amamihe ha. (Ilu 7:1, 2) Ma ọ bụrụ na ị gwaghị ha eziokwu, ị ga-eme ka ha ghara ịna-atụkwasị gị obi, meekwa ka o siere ha ike ịsị gị gawa.

Mgbe ị ga-agwa ha: Arịọkasịla ndị mụrụ gị ihe ahụ́ mgbe ha ka si ọrụ lọta ma ọ bụ mgbe ha na-eme ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Gakwuru ha mgbe ahụ́ ruru ha ala. Ma echela ka oge ị ga-aga ebe ahụ ruo tupu gị agwa ha, gị esiwezie ọnwụ ka ha zaa gị ozugbo. Ha agaghị achọ ikpebi ihe ha ga-agwa gị ọkụ ọkụ. Gwa ha ya n’oge ka ha nwee ike ichebara ya echiche. I mee otú ahụ, obi ga-adị ha mma.

Ihe ị ga-agwa ha: Gwa ha ihe niile ha kwesịrị ịma. Gwa ha ihe ị chọrọ ime. Obi anaghị adị ndị nne na nna mma ma nwa ha sị ha, “Amaghị m,” nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha jụrụ nwa ahụ, sị: “Olee ndị ga-abịa ebe ahụ?” “È nwere onye toro eto bụ́ ezigbo mmadụ ga-eso bịa?” ma ọ bụkwanụ “Olee mgbe unu ga-emecha?”

Otú ị ga-esi gwa ha: Echela na ndị mụrụ gị bụ ndị iro gị. Ghọta na gị na ha na-achụ otu ihe, n’ihi na ha bụ ndị nke gị n’eziokwu. Ị ghọta na gị na ha na-achụ otu ihe, ị gaghị eji olu ike arịọ ha ihe, ha nwekwara ike imere gị ihe ị rịọrọ. Ekwula ihe ndị dị ka, “Unu atụkwasịghị m obi,” “Ndị ọzọ niile ga-agacha,” ma ọ bụ “Nne na nna ndị enyi m kwetara ka ha gaa!” Gosi ha na i toola, na i kwetara ihe ha kpebiri, na ị ga-emekwa ya. I mee otú ahụ, ha ga na-akwanyere gị ùgwù. Ọ bụrụ na e nwee ebe ị chọrọ ịga mgbe ọzọ, o nwere ike imetụ ha n’obi, ha asị gị gaa.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 32 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

AMAOKWU BAỊBỤL

“Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa.”​—Ilu 27:11.

NDỤMỌDỤ

Ị gawa oriri, kpebie otú ị ga-esi pụọ ma e mewe ihe na-adịghị mma. Tupu ị gawa, mara ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme ka i nwee ike ịpụ mgbe ị na-emebibeghị akọnuche gị.

Ị̀ MA NA . . . ?

Nne na nna ndị hụrụ ụmụ ha n’anya na-akpachara anya ka ụmụ ha ghara ịbanye ná nsogbu. Ọ bụrụ na ha aghọtaghị ihe ị rịọrọ ha, ma ọ bụkwanụ ha chee na e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa ị na-agwabeghị ha, ha nwere ike ịjụ.

IHE M GA-EME!

A malite ime ma ọ bụ ikwu ihe na-enye akọnuche m nsogbu na fim m na-ele ma ọ bụ n’oriri m gara, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị nwere ike ime ka ị chọọ izochiri ndị mụrụ gị ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka ịma ihe ha kwesịrị ịza gị?

● Ndị mụrụ gị sị gị gawa n’ihi na i zochiiri ha ihe ụfọdụ ha kwesịrị ịma, olee nsogbu ndị o nwere ike ịkpata?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 268]

“Mgbe m bụ nwata, adị m iberiibe. M mechara chọpụta na ihe ụfọdụ m chere na ha bụ ikpori ndụ abụghị ikpori ndụ. Mmadụ ga-aghọrịrị mkpụrụ ọ kụrụ. Ọ na-ewute m na mụ egeghị ndị mụrụ m ntị.”​—Brian

[Foto dị na peeji nke 269]

Ndị mụrụ gị yiri ndị na-agụpụta onye mmiri chọrọ iri. Ha nwere ike ịhụ nsogbu gịnwa na-ahụghị