Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Jekọb

Onye M Ga-eṅomi—Jekọb

Onye M Ga-eṅomi​—Jekọb

Jekọb na Isọ nwanne ya ahụbeghị anya kemgbe ọtụtụ afọ. Isọ kpọrọ Jekọb asị. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe ọjọọ Jekọb mere Isọ, ọ gakwuuru Isọ ka ha kpezie. O sighị ọnwụ. Ihe bụ́ mkpa ya abụghị ka o merie n’esemokwu ahụ kama ọ bụ ime ka nwanne ya hụ ya n’anya. Jekọb emebighị iwu Chineke, ma o sighị ọnwụ na nwanne ya ga-arịọrịrị ya mgbaghara tupu ha ekpezie.—Jenesis 25:27-34; 27:30-41; 32:3-22; 33:1-9.

Gịnị ka ị na-eme ma e nwee ihe seere gị na onye ezinụlọ unu? I nwere ike iche mgbe ụfọdụ na o nweghị ihe i mejọrọ, nakwa na ọ bụ nwanne gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụ mama gị mejọrọ. Ụdị ihe ahụ mee, ị̀ ga-echere ka onye ahụ buru ụzọ bịakwute gị? Ka ị̀ ga-eme otú ahụ Jekọb mere? Ị̀ ga-ahapụ isi ọnwụ, ka udo wee dị, ma ọ bụrụ na ime otú ahụ agaghị emebi iwu Baịbụl? (1 Pita 3:8, 9) Jekọb ekweghị ka mpako kewaa ezinụlọ ha. O wedara onwe ya ala ma mee ka ya na nwanne ya dị ná mma. Ị̀ ga-eme otú ahụ ma e nwee ihe seere gị na ndị ezinụlọ unu?