Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Mozis

Onye M Ga-eṅomi—Mozis

Onye M Ga-eṅomi​—Mozis

Mozis bụ onye ụwa ọma. A zụrụ ya n’ezinụlọ eze Fero, kụziekwara ya amamihe niile nke ndị Ijipt. (Ọrụ 7:22) Gịnị ka ọ ga-eji ihe a kụziiri ya mee? O nwere ike iji ya ghọọ onye a ma ama, onye ọchịchị na aka ji akụ̀. Ma o kweghị ka ihe ndị ọgbọ ya na-eme megharịa ya anya ma ọ bụ ka a rata ya ịchọ ọdịmma onwe ya naanị. Kama ime otú ahụ, o kpebiri iji ndụ ya mee ihe nwere ike iju ọtụtụ ndị anya. “Ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke.” (Ndị Hibru 11:25) Ihe ahụ Mozis mere ọ̀ ghọrọ ya ahịa? Mbanụ. O biri ezigbo ndụ nke tọrọ ya ụtọ n’ihi na o kpebiri ijere Chineke ozi na inyere ndị mmadụ aka.

Ọ bụrụ na ọ dabara na ị gụrụ ezigbo akwụkwọ, gịnị ka ị ga-eji ya eme? I nwere ike iji ya chụwa ego ma ọ bụ chọọ ịghọ onye ọchịchị, ma ọ bụkwanụ gị emee ka Mozis, jiri ndụ gị mee ihe bara ezigbo uru. I nwere ike iji ihe ị mụtara na ihe i nwere jeere Chineke na ndị agbata obi gị ozi. (Matiu 22:35-40) O nweghị ihe ọzọ ị ga-eji ndụ gị mee ga-abara gị uru otú ahụ!