Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Chebe Onwe M n’Ụlọ Akwụkwọ?

Olee Otú M Ga-esi Chebe Onwe M n’Ụlọ Akwụkwọ?

ISI NKE 14

Olee Otú M Ga-esi Chebe Onwe M n’Ụlọ Akwụkwọ?

Kanye akara n’eziokwu ma ọ bụ n’ụgha n’okwu ndị a:

1. Naanị otú e si achọ mmadụ okwu bụ imetụ onye ahụ aka.

□ Eziokwu

□ Ụgha

2. Naanị otú e si egwusa mmadụ egwuregwu iberiibe bụ imetụ onye ahụ aka.

□ Eziokwu

□ Ụgha

3. Ụmụ agbọghọ nwekwara ike ịchọ mmadụ okwu ma ọ bụ gwusa mmadụ egwuregwu iberiibe.

□ Eziokwu

□ Ụgha

4. Ọ bụrụ na a na-achọ gị okwu ma ọ bụ na-egwusa gị egwuregwu iberiibe, ọ dịghị ihe ị ga-emeli.

□ Eziokwu

□ Ụgha

KWA ụbọchị, ụjọ na-atụ ọtụtụ nde ụmụ akwụkwọ a na-achọ okwu n’ụlọ akwụkwọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ryan kwuru, sị: “Ahụ́ a na-emekpa m na-eme ka nkeji iri na ise m na-anọ n’ụgbọala yie ọtụtụ awa. Ndị na-achọ m okwu kparịkata m, ha arụsawa m arụrụala.” A na-egwusa ndị na-eto eto ndị ọzọ egwuregwu iberiibe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anita kwuru, sị: “Otu nwa okorobịa a ma ama bịakwutere m na paseeji malite ibigharị m aka n’ahụ́. Emedara m obi gwa ya ka ọ kwụsị ibi m aka n’ahụ́, ya akpọchie ntị. O chere na ihe m gwara ya esighị m n’obi.”

E nwere ndị na-eto eto ụmụ klas ha na-enye nsogbu mgbe ha nọ n’Ịntanet. È nyetụla gị nsogbu? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe ị ga-eme? E nwere ọtụtụ ihe ị ga-eme! Ma, ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ndị ahụ e kwuru ná mmalite isiokwu a, mata nke bụ́ eziokwu ma ọ bụ ụgha.

1. Ụgha. Ọtụtụ ndị na-eji ọnụ achọ ndị mmadụ okwu, ọ bụghị aka. Iyi egwu, mkparị, na ịkwa emo socha n’ịchọ okwu.

2. Ụgha. Ọbụna ịja mmadụ mma iji kpalie agụụ mmekọahụ, okwu njakịrị rụrụ arụ, mmadụ ile onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya anya ọjọọ socha n’igwusa mmadụ egwuregwu iberiibe.

3. Eziokwu. Ma nwoke ma nwaanyị nwere ike ịchọ mmadụ okwu ma ọ bụ gwusa mmadụ egwuregwu iberiibe.

4. Ụgha. E nwere ihe ị ga-emeli ka ị kwụsị nsogbu ahụ. Ka anyị tụlee otú i nwere ike isi mee ya.

Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu —N’Emetụghị Ya Aka

Ụfọdụ ndị na-achọ okwu nwere ike ịkpachara anya kpasuo gị iwe ka ha hụ ihe ị ga-eme. Ma Baịbụl nyere ezi ndụmọdụ, sị: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe.” (Ekliziastis 7:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na ‘iji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ’ nwere ike ime ka ihe ka njọ, ma kpatakwuo nsogbu. (Ndị Rom 12:17) Oleezi otú ị ga-esi emeri onye na-achọ gị okwu n’emetụghị ya aka?

Chịfuo okwu ya n’ọchị. Ọ bụrụ na ihe mere onye ahụ ji gwa gị okwu ọjọọ bụ ka a chịa ọchị, gbalịa chịfuo ya n’ọchị kama iwe iwe. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Eliu kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ihe ị ga-eme mgbe a gwara gị okwu ọjọọ bụ ileghara ya anya.” Ọ bụrụ na ọchọ okwu achọpụta na ọ dịghị ihe i ji okwu ya kpọrọ, o nwere ike ịkwụsị inye gị nsogbu.

Na-adị nwayọọ. Baịbụl kwuru, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.” (Ilu 15:1) Ọchọ okwu anaghị atụ anya ka a gwa ya okwu dị nro. Okwu dị nro nwekwara ike ime ka ike gwụ ya. N’eziokwu, njide onwe onye ga-enyere mmadụ aka ịgba nkịtị mgbe a na-agwa ya okwu ọjọọ. Ma, ọ ka mma ime otú ahụ mgbe niile. Ilu 29:11 kwuru, sị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.” Ịdị nwayọọ bụ ihe e ji ama dimkpa. Onye dị nwayọọ anaghị atụ ụjọ, ma ọchọ okwu na-atụkarị ụjọ, na-ewekarị iwe ma na-eme ka ò siri ike. N’ihi ya, Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”—Ilu 16:32.

Chebe onwe gị. Ọ bụrụ na ihe esie ike, i nwere ike isi ebe ahụ pụọ. Ilu 17:14 kwuru, sị: “Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.” N’ihi ya, ọ bụrụ na ị hụ na a ga-emerụ gị ahụ́, si ebe ahụ pụọ. Ọ bụrụ na i nweghị ike isi ebe ahụ pụọ, i nwere ike ịgbalị ka a ghara imerụ gị ahụ́.

Kọọrọ ya ndị ọzọ. Papa gị na mama gị kwesịrị ịma ihe na-emenụ. Ha nwere ike inye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa gị ka ị kọọrọ ya onye nkụzi gị ma ọ bụ onye na-enye ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ. Obi kwesịrị isi gị ike na papa gị na mama gị na ndị nkụzi nwere ike iji amamihe dozie okwu ahụ, ka ị ghara ịbanyekwu ná nsogbu.

Gịnị bụ isi ihe anyị na-ekwu? Ọchọ okwu agaghị emeri gị ma ọ bụrụ na i meghị ihe ọ tụrụ anya ya. N’ihi ya, ekwela ka ọ kpasuo gị iwe. Kama, merie ya site n’ime ihe ndị ahụ e kwuru.

Ihe I Kwesịrị Ime Mgbe A Na-egwusa Gị Egwuregwu Iberiibe

Ọ bụrụ na a na-egwusa gị egwuregwu iberiibe, i kwesịrị iwe iwe! Ma ajụjụ bụ, Olee ihe ị ga-eme? E nwere ọtụtụ ihe ị ga-eme! Lee ụfọdụ n’ime ha.

Gwa onye ahụ hoo haa na ị chọghị egwuregwu iberiibe ahụ. Ọ bụrụ na ị gwaghị ndị na-egwusa gị egwuregwu iberiibe hoo haa na ị chọghị ya, ha nwere ike iche na i kwela ma ọ bụkwanụ na i nwere ike ikwe. N’ihi ya, ka ee e i kwuru bụrụ ee e. (Matiu 5:37) Ọ bụrụ na ị chịtụ ọchị ma ọ bụ mee ka ị̀ na-eme ihere n’ihi egwuregwu iberiibe mmadụ gwusara gị, o nwere ike ime ka o chee na i nwere mmasị. Gwa ya hoo haa na ị chọghị ya. Ọ bụ otú kacha mma ị ga-esi chebe onwe gị!

Gosi na iwe na-ewe gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anita kwuru banyere onye na-enye ya nsogbu, sị: “Eji m olu ike baara ya mba n’ihu ndị enyi ya, gwa ya ka ọ GHARA igwusa m ụdị egwuregwu ahụ ọzọ!” Gịnị si n’ime ya pụta? “Ndị enyi ya niile chịrị ya ọchị. Ọ kwụsịtụrụ ịtụpụrụ m ọnụ, ma mgbe abalị ole na ole gachara, ọ rịọrọ m arịrịọ n’ihi ihe ahụ o mere. O mechadịrị nyere m aka mgbe onye ọzọ gbalịrị inye m nsogbu.”

Ọ bụrụ na ị gwa ya ma o kweghị, si ebe ahụ pụọ. O nwedịrị ike ịka mma ka ị gbaa ọsọ. Ọ bụrụ na i nweghị ike isi ebe ahụ pụọ, i kwesịrị ichebe onwe gị ka ọ ghara ịbagide gị. (Diuterọnọmi 22:25-27) Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst kwuru, sị: “Mgbe otu nwa okorobịa chọrọ ijide m, esuru m ya ezigbo aka ma si ebe ahụ gbapụ!”

Kọọrọ ya onye ọzọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Adrienne kwuru, sị: “Ọ bụ ihe m mechara mee. Mgbe otu nwa okorobịa m chere na ọ bụ ezigbo enyi m nyegidere m nsogbu ka mụ na ya nwee mmekọahụ, agwara m papa m na mama m ka ha gwa m ihe m ga-eme. Ka m na-asị ya mba, otú ahụ ka ọ nọgidere na-enye m nsogbu, dị ka à ga-asị na ọ bụ egwuregwu.” Papa na mama Adrienne nyere ya ndụmọdụ bara uru, nke nyeere ya aka imeri nsogbu ahụ. O doro anya na papa gị na mama gị nwekwara ike inyere gị aka.

Ime ihe i kwesịrị ime mgbe a na-achọ gị okwu ma ọ bụ na-egwusa gị egwuregwu iberiibe adịghị mfe. Ma cheta mgbe niile na ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst nwere ihe ha ga-eme mgbe a na-achọ ha okwu; ha ekwesịghị ikwe ka e gwusa ha egwuregwu iberiibe ma ọ bụ ka e jiri ya rata ha. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị ahụ e kwuru, ị ga-emeri nsogbu ndị ahụ.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 19

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị bụ otu n’ime nsogbu kacha sie ike i kwesịrị imeri. Mụta otú ị ga-esi jiri obi ike merie ya.

AMAOKWU BAỊBỤL

Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.Ndị Rom 12:18.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na mmadụ na-achọ gị okwu, ụjọ atụla gị, ma alụla ọgụ. Gwa onye ahụ hoo haa ka ọ kwụsị ịchọ gị okwu. Jiri nwayọọ si ebe ahụ pụọ. Ọ bụrụ na ọ kwụsịghị, kọọrọ ya ndị ọzọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Iyi uwe òtù ọjọọ ma ọ bụ uwe bú akara ha nwere ike ime ka e merụọ gị ahụ́. Otu nwa okorobịa nọbu n’òtù ọjọọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ejiji anyị, ma ọ bụghị onye òtù anyị, o nwere ike ime ka ọ baa ná nsogbu. Ihe ọ ga-eme bụ ịbata n’òtù anyị, ma ọ bụ e merụọ ya ahụ́.”

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịkparị m ma ọ bụ ịkpasu m iwe, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Iji gbaara nsogbu ọsọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị ka ị ga-eme ka i nwekwuo obi ike na ùgwù, nke nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara ịchọ gị okwu?

● Gịnị ka ị ga-eme ma e gwusa gị egwuregwu iberiibe? (Chee echiche ihe ndị nwere ike ime eme na ihe ị ga-eme.)

● Gịnị mere i kwesịghị ịgba nkịtị ma e gwusawa gị egwuregwu iberiibe?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 123]

“Ọ bụrụ na ị ma na ọgụ ga-ada, etinyela aka, kama lawa. Ụfọdụ na-anọ ka ha hụ ihe ga-eme, ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-aba ná nsogbu.”—Jairo

Igbe dị na peeji nke 125]

Ihe Ị Ga-eme Ka A Ghara Igwusa Gị Egwuregwu Iberiibe

Achụla nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ọ bụrụ na ị na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ị na-akpọ ndị mmadụ òkù igwusa gị egwuregwu iberiibe. Baịbụl jụrụ, sị: “Mmadụ ọ̀ pụrụ ịgụnye ọkụ n’obi ya, uwe ya aghara ire ọkụ?” (Ilu 6:27) N’eziokwu, ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị bụ iji ọkụ egwuri egwu.

Kpachara anya ná ndị gị na ha na-akpa. Ndị mmadụ ga-ewere ya na àgwà ndị enyi gị na-akpa ka ị na-akpa. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Carla kwuru, sị, “Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-akpa bụ ndị ụdị okwu ahụ na-adị mma ma ọ bụ ndị na-achọ ka a na-ahụ ha, a ga na-egwusa gị egwuregwu iberiibe.”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

Kpachara anya n’otú i si eji ejiji. Iyi uwe na-adịghị mma na-egosi na ị chọrọ ka onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị chụwa gị—ha ga-achụwa gị.—Ndị Galeshia 6:7.

Mee ka ha mata na ị bụ Onye Kraịst. I mee otú ahụ, ha ga-atụ anya ka ị na-akpa àgwà Onye Kraịst.—Matiu 5:15, 16.

[Foto dị na peeji nke 124]

Iwe iwe mgbe a na-achọ gị okwu yiri ịwụnye mmanụ ọkụ n’ọkụ

[Foto dị na peeji nke 127]

Gwa onye na-egwusa gị egwuregwu iberiibe ka ọ hapụ gị aka!