Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Mgbe Owu Na-ama M?

Gịnị Ka M Ga-eme Mgbe Owu Na-ama M?

ISI NKE 9

Gịnị Ka M Ga-eme Mgbe Owu Na-ama M?

Ka e were ya na ụbọchị taa mara mma, ọ dịghịkwanụ ihe i nwere ime. Ma, ndị enyi gị niile nwere ihe ha na-eme. Ha agaala ikpori ndụ. Na nke taa kwa, ha akpọghị gị! A kpọọ ndị ọzọ òkù, ma a kpọghị gị, ọ na-agbawa obi, nke ka nke, ma i cheta ihe o nwere ike ịpụta. I nwere ike ichewe, sị, ‘Ọ ga-abụkwa na m nwere nsogbu. Gịnị mere ndị mmadụ ji agbara m ọsọ?’

MA ELEGHỊ anya, ụdị ihe ahụ emetụla gị ọtụtụ ugboro. O nwere ike ịdị gị ka è nwere nnukwu nsogbu dị n’etiti gị na ndị ọgbọ gị. Mgbe ọ bụla ị chọrọ ka gị na ha kparịta ụka, gị asụwa nsụ. Mgbe ohere dapụtara ka gị na ha nọkọọ, gị emewe ihere. Gịnị mere o ji esiri gị ike ịgwa ha okwu?

Kama ịgbachi nkịtị ka nsogbu ahụ dịgide, i nwere ike ịgbalị imeri ya. Ka anyị leba anya n’otú ị ga-esi emeri ya.

Nsogbu nke mbụ: Ile onwe gị anya ọjọọ. Ụfọdụ ndị na-eto eto na-emenyekarị onwe ha ihere. Ha chere na ọ dịghị onye nwere mmasị n’ebe ha nọ, na ọ dịghịkwa ezigbo ihe ha ga-ekwu mgbe a na-akparịta ụka. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele onwe gị anya? Ya bụrụ otú ahụ, ile onwe gị anya ọjọọ ga-eme ka nsogbu nke dị n’etiti gị na ndị ọgbọ gị ka njọ.

Ihe ị ga-eme: Lekwasị anya n’àgwà ọma gị. (2 Ndị Kọrịnt 11:6) Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe m na-eme nke ọma?’ Cheta ebe ụfọdụ ị na-eme nke ọma ma ọ bụ àgwà ọma ndị i nwere, ma dee ha n’ebe a.

․․․․․

O doro anya na e nwere ebe ị na-adịghị eme nke ọma, ịma ebe ndị ahụ abụghịkwa ihe ọjọọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:12) Ma e nwere ọtụtụ ebe ị na-eme nke ọma. Ịmata ebe ndị ị na-eme nke ọma ga-eme ka obi sie gị ike na i kwesịghị ilewe onwe gị anya ọjọọ.

Nsogbu nke abụọ: Ime ihere. Ka e were ya na ị chọrọ ka gị na mmadụ kparịta ụka, ma mgbe o ruru n’omume, ya adị ka ị maghị ihe ị ga-ekwu. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Elizabeth kwara arịrị, sị: “M na-emekarị ihere. Ọ na-esiri m ezigbo ike ịgwa ndị mmadụ okwu mgbe a gara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ana m aja ndị na-eme ya ike.” Ọ bụrụ na ị na-eme ihere dị ka Elizabeth, o nwere ike ịdị gị ka ị gaghị emerili nsogbu ahụ.

Ihe ị ga-eme: Nwee ezigbo mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Enyela onwe gị nsogbu—ọ pụtaghị na ị ga-amalite ime ka ndị ọzọ hụ gị. Burugodị ụzọ gosi mmasị n’ebe naanị otu onye nọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jorge kwuru, sị: “Naanị ịjụ ha otú ha mere ma ọ bụ ịjụ ha banyere ọrụ ha ga-eme ka ị matakwuo ha.”

Otu aro bụ: Enwela mmasị naanị n’ebe ndị ọgbọ gị nọ. Ụfọdụ n’ime ndị kacha bụrụ ezigbo ndị enyi a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ ndị na-abụtụdịghị ọgbọ, dị ka Rut na Neomi, Devid na Jọnatan, nakwa Timoti na Pọl. (Rut 1:16, 17; 1 Samuel 18:1; 1 Ndị Kọrịnt 4:17) Chetakwa na naanị otu onye agaghị akparịtali ụka, ọ ga-abụrịrị mmadụ na ibe ya. Ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma e gee ha ntị nke ọma. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-emekarị ihere, cheta na ọ bụghị iwu na ị ga-ekwu okwu mgbe niile!

Dee aha mmadụ abụọ bụ́ ndị toro eto ị chọrọ ịmatakwu.

․․․․․

Ọ ga-adị mma ma ị gakwuru otu n’ime ndị ahụ i dere aha ha ma malite mkparịta ụka. Ka ị na-agbalịkwu ka gị na ndị so ‘n’òtù ụmụnna dum’ na-ekwurịta okwu, owu agachaghị na-ama gị.—1 Pita 2:17.

Nsogbu nke atọ: Àgwà ọjọọ. Onye bụ́ eze onye agwala m na-akparịkarị mmadụ, na-akọ mmadụ ọnụ, ma ọ bụ na-emenye mmadụ ihere. E nwekwara ụfọdụ ndị bụ́ ekwe ekwe, ndị na-amanye onye ọ bụla ikweta ihe ha chere. Ebe ụdị onye ahụ bụ “onye ezi omume gabiga ókè,” ọ na-akatọ onye ọ bụla na-emeghị ihe ọ chọrọ ozugbo. (Ekliziastis 7:16) O yiri ka ị chọghị ka gị na ndị dị otú ahụ na-anọ! Ma, ọ̀ ga-abụ na ị na-enwe nsogbu n’ihi na na-akpa ụdị àgwà ahụ? Baịbụl kwuru, sị: “Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.” O kwukwara na “n’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị.”—Ekliziastis 10:14; Ilu 10:19.

Ihe ị ga-eme: ‘Ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ gị n’obi.’ (1 Pita 3:8) Ọ bụrụgodị na i kwetaghị ihe mmadụ kwuru, chere ka o kwuchaa. Lekwasị anya n’ebe echiche unu abụọ bụ otu. Ọ bụrụ na i chere na i kwesịrị ikwu ihe dị iche n’ihe o kwuru, meda obi jiri akọ kwuo ya.

Na-agwa ndị ọzọ okwu otú ị chọrọ ka ha si na-agwa gị okwu. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị ‘na-eme ihe niile n’atamughị ntamu, n’arụghịkwa ụka.’ (Ndị Filipaị 2:14) Ịrụ ụka na-enweghị isi na ọdụ ma ọ bụ ịkwa ndị ọzọ emo, na ịkparị ha ma ọ bụ ịkatọkarị ha, ga-eme ka ha na-agbara gị ọsọ. Ihe gị ga-amasịkwu ha ma ọ bụrụ na i mee ‘ka okwu gị dịrị n’amara mgbe niile.’—Ndị Kọlọsi 4:6.

Imeta Ndị Enyi Ò Kwesịrị Ịbụ Ọnwụ na Ndụ?

Ugbu a i leruchara onwe gị anya, o nwere ike ịbụ na ị hụla ụzọ ụfọdụ ị ga-esi merie nsogbu ndị na-eme ka ndị mmadụ na-agbara gị ọsọ. N’eziokwu, i kwesịrị ile ihe anya n’ụzọ dị mma. I kwesịghị ịtụ anya ka mmadụ niile hụ gị n’anya. Jizọs sịrị na ụfọdụ ndị ga-akpọ ndị na-eme ihe ziri ezi asị. (Jọn 15:19) N’ihi ya, ọ baghị uru ka i chee na imeta ndị enyi bụ ọnwụ na ndụ.

Otú ọ dị, i kwesịrị itinye ezi mgbalị ka gị na ndị mmadụ dịrị ná mma n’emebighị iwu Baịbụl. Samuel a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl kpebisiri ike ime ihe dị Chineke mma. Gịnị bụ uru o ritere? Ọ ‘nọ na-eto, ihe ya wee na-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.’ (1 Samuel 2:26) Ị ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ị gbalịsie ike!

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BỤ ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 8 NA NKE 14

Ị chọọ ịmụtakwu ihe ndị ọzọ, lee ihe nkiri DVD bụ́ “Young People Ask—How Can I Make Real Friends?” E nwere ya n’ihe karịrị asụsụ iri anọ

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ka e were ya na ezigbo enyi gị nọkatara mewe ka ezigbo onye iro gị. Gịnị ka ị ga-eme?

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.’—Ilu 11:25.

NDỤMỌDỤ

Mee ka mkparịta ụka na-aga n’ihu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ma ihe ọ̀ gakwara nke ọma ná ngwụsị izu gara aga, asịla ya naanị ee. Gwa ya ihe i mere ná ngwụsị izu ahụ. Jụzie ya ihe o mere ná ngwụsị izu ahụ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Baịbụl gosiri na o nwere ike ịbụ na Mozis, Jeremaya, na Timoti na-eme ihere.—Ọpụpụ 3:11, 13; 4:1, 10; Jeremaya 1:6-8; 1 Timoti 4:12; 2 Timoti 1:6-8.

IHE M GA-EME!

Ihe na-akacha enye m nsogbu n’imeta ndị enyi bụ ․․․․․

Ihe m ga-agbalị ime iji merie nsogbu ahụ bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị nwere ike ime ka owu na-ama ụfọdụ Ndị Kraịst?

● Gịnị ga-eme ka ị na-ele onwe gị anya otú kwesịrị ekwesị, kama iche ihe na-adịghị mma banyere onwe gị mgbe niile?

● Ọ bụrụ na owu na-ama nwanne gị nke ị tọrọ, olee otú ị ga-esi akasi ya obi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 88]

“Otu nwanna nwaanyị nọ na-agbalị imeta m enyi, ma ekweghị m ná mmalite. Mgbe m mechara kweta, ọ dị m ka m̀ dị nzuzu! Ma o mechara bụrụ otu n’ime ezigbo ndị enyi m nwetụrụla, n’agbanyeghị na o ji afọ iri abụọ na ise tọọ m!”—Marie

[Foto dị na peeji nke 87]

I nwere ike imeri nsogbu ahụ mere ndị ọgbọ gị ji agbara gị ọsọ