Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ọjọọ Dị na Nwoke na Nwaanyị Ịkpa na Nzuzo?

Olee Ihe Ọjọọ Dị na Nwoke na Nwaanyị Ịkpa na Nzuzo?

ISI NKE 2

Olee Ihe Ọjọọ Dị na Nwoke na Nwaanyị Ịkpa na Nzuzo?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jessica amaghị ihe ọ ga-eme eme mgbe otu nwa klas ha aha ya bụ Jeremy malitere inwe mmasị n’ebe ọ nọ. Jessica sịrị, “Ọ mara mma nwoke. Ndị enyi m gwakwara m na o nweghị nwa okorobịa ọzọ m ga-enweta ga na-akpa ezi àgwà ka ya. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ agbalịala imeta ya enyi, ma o nweghị mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụ naanị m ka ọ chọrọ.”

Tupu Jessica amara ihe na-emenụ, Jeremy agwala ya ka ha kpawa. Jessica gwara ya na ebe ya bụ Onyeàmà Jehova, papa ya na mama ya agaghị ekwe ka ya na onye na-abụghị Onyeàmà na-akpa. Jessica kwuru, sị: “Ma, Jeremy kwuru na ya ma ihe anyị ga-eme. Ọ jụrụ m, sị, ‘Ọ́ bụrụkwanụ na anyị akpawa n’agwaghị papa gị na mama gị?’”

Ọ BỤRỤ na onye i nwere mmasị n’ebe ọ nọ agwa gị ụdị ihe ahụ, gịnị ka ị ga-eme? O nwere ike iju gị anya na Jessica kwetara n’ihe ahụ Jeremy kwuru. Jessica sịrị: “Obi siri m ike na ọ bụrụ na mụ na ya akpawa, m nwere ike ịkụziri ya ịhụ Jehova n’anya.” Oleezi otú ihe si gaa? Anyị ga-emecha chọpụta. Ma, ka anyị burugodị ụzọ hụ ihe mere ọnyà a ji ama ụfọdụ ndị.

Ihe Mere Ha Ji Eme Ya

Gịnị mere ụfọdụ ndị ji akpa na nzuzo? Otu nwa okorobịa aha ya bụ David kwuru ná nkenke, sị: “Ha ma na papa ha na mama ha agaghị ekwe. Ọ bụ ya mere ha anaghị agwa ha.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jane kwuru ihe ọzọ nwere ike ịkpata ya. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ana-akpa na nzuzo, ọ bụ nnupụisi. Ọ bụrụ na i chere na i toruola ogo mmadụ, ma a naghị eme gị ka onye torurula ogo mmadụ, o nwere ike mee ka i kpebie na ị ga na-eme ihe ọ bụla sọrọ gị n’agwaghị papa gị na mama gị.”

Ì chetara ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chọwa ka ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpa na nzuzo? Ọ bụrụ na i chetara, dee ya ebe a.

․․․․․

N’ezie, ị ma na Baịbụl nyere gị iwu ka ị na-erubere papa gị na mama gị isi. (Ndị Efesọs 6:1) Ọ bụrụ na ha ekweghị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, a ga-enwerịrị ezigbo ihe kpatara ya. Ma, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ị na-eche, sị:

 ● Ọ na-adị m ka ò nwere uru m na-anaghị erite n’ihi na onye ọ bụla nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ya na ya na-akpa ma e wezụga m.

● Enwere m mmasị n’onye na-abụghị Onyeàmà.

● Achọrọ m ka mụ na Onye Kraịst na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m kpawa, n’agbanyeghị na etorubeghị m ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

Ikekwe, ị ma ihe papa gị na mama gị ga-ekwu ma ị gwa ha ihe ndị ahụ. N’obi gị, ị makwa na ihe ha ga-ekwu bụ eziokwu. Ma, i nwere ike iche ụdị ihe a nwa agbọghọ aha ya bụ Manami chere, bụ́ onye sịrị: “Ọtụtụ ndị na-agwasi m ike ka mụ na nwoke kpawa, nke mere ka m na-eche mgbe ụfọdụ ma mkpebi m mere na mụ na nwoke agaghị akpa ọ̀ dịkwa mma. Ụmụ okoro na agbọghọ ugbu a na-eche na o nweghị otú mmadụ ga-esi nọrọ n’enweghị onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ya na ya na-akpa. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na enweghị m onye mụ na ya na-akpa, obi agaghị adị mụ mma.” Ụfọdụ ndị ọ dị otú ahụ na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha akpawala, ha ezochiere ya papa ha na mama ha. Olee otú ha si eme ya?

“A Gwara Anyị Ekwula”

Mgbe e kwuru na ‘nwoke na nwaanyị na-akpa na nzuzo,’ ọ pụtara na ha na-aghọ aghụghọ. Ọ bụ aghụghọ na-eme ka o nwee isi. Ụfọdụ anaghị ekwe ka a mara na e nwere onye ha na ya na-akpa. Ihe ha na-ejikarị ekwurịta okwu bụ ekwe ntị ma ọ bụ Ịntanet. Ha na ndị mmadụ nọrọ, ha abụrụ ndị enyi nkịtị. Ma ha jiri kọmputa ma ọ bụ ekwe ntị na-edere ibe ha ozi, ma ọ bụ jiri ekwe ntị na-akparịta ụka, egwú adagharịa.

Ụzọ aghụghọ ọzọ ha si eme ya bụ ịhazi ihe a ga-eme n’ìgwè, ha rute, ya abụrụ onye na nke ya onye na nke ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ James sịrị: “Ọ dị mgbe a kpọrọ anyị òkù ka anyị bịa n’otu ebe n’ìgwè. Mgbe anyị rutere, anyị chọpụtara na ihe mere e ji nwee nnọkọ ahụ bụ ka mmadụ abụọ nọ n’ebe ahụ nwee ike ịnọkọ ọnụ. A gwara anyị ekwula.”

Dị ka James kwuru, mgbe mmadụ abụọ na-akpa na nzuzo, ọ na-abụkarị ndị enyi ha na-enyere ha aka zochie ya. Carol sịrị, “Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a ga-enwerịrị otu enyi ha nke ma na ha abụọ na-akpa, ma ya ekpebie na ya agaghị ekwu, n’ihi na a gwara ya ekwula.” Mgbe ụfọdụ, a na-aghacha okpookpo ụgha na ya. Beth, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa, sịrị: “Ọtụtụ ndị ntorobịa na-aghara papa ha na mama ha ụgha ma a jụọ ha ebe ha gara n’ihi na ha achọghị ka ha mata na e nwere onye ha na ya na-akpa.” Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Misaki mere. Ọ sịrị: “Ana m achọta otu ihe kọọrọ ha. Ana m akpachara anya ka m ghara ịghara ha ụgha n’ihe ndị ọzọ ma e wezụga n’ihe gbasara nwa okorobịa mụ na ya na-akpa, ka ha ghara inyowe m enyo.”

Ọnyà Dị n’Ịkpa na Nzuzo

Ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa na nzuzo—ma ọ bụkwanụ na ị na-eme otú ahụ ugbu a—i kwesịrị ịjụ onwe gị ajụjụ abụọ a:

Olee uru ihe a m na-eme ga-abara m? Ì bu n’obi ịlụ onye ahụ n’oge na-adịghị anya? Evan, bụ́ nwa okorobịa dị iri afọ abụọ, sịrị: “Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị na-ebughị n’obi ịlụ ya, o yiri ịkpọsà ngwá ahịa ị na-achọghị ire ere.” Gịnị ga-esi na ya pụta? Ilu 13:12 sịrị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa.” Ị̀ chọrọ n’ezie ime ka obi gbawaa onye ị hụrụ n’anya? Ihe ọzọ dị na ya bụ: Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ana-akpa na nzuzo, ọ ga-eme ka ị ghara inweta ndụmọdụ papa gị na mama gị na ndị ọzọ toro eto, bụ́ ndị hụrụ gị n’anya, gaara enye gị. N’ihi ya, o nwere ike ime ka ị kwaa iko.—Ndị Galeshia 6:7.

Olee otú Jehova Chineke si ele ihe a m na-eme anya? Baịbụl kwuru na “ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Ya mere, ọ bụrụ na ị chọghị ka mmadụ mara na e nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya na-akpa—ma ọ bụkwanụ na ị chọghị ka a mara na e nwere onye ya na enyi gị na-akpa—Jehova ma ihe ị na-eme. Ọ bụrụkwa na ị na-aghọ aghụghọ, i kwesịrị ichebara onwe gị echiche. Jehova Chineke kpọrọ ịgha ụgha asị. N’eziokwu, “ire na-agha ụgha” bụ otu n’ime ihe Baịbụl kwuru hoo haa bụ́ ihe arụ n’anya Jehova!—Ilu 6:16-19.

Mee Ka A Mara Ihe ahụ Ị Na-ezo Ezo

N’eziokwu, ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa na nzuzo, ọ ga-adị mma ka ị gwa ya papa gị na mama gị ma ọ bụkwanụ Onye Kraịst tozuru okè. Ọ bụrụkwanụ na e nwere onye ya na enyi gị na-akpa na nzuzo, akwadola ihe ahụ ọ na-eme site n’inyere ya aka na-ezochi ya. (1 Timoti 5:22) A sị ka e kwuwe, olee otú obi ga-adị gị ma ya na onye ahụ mechaa baa ná nsogbu? Í cheghị na i so kpata nsogbu ahụ?

Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na i nwere enyi nke na-arịa ọrịa shuga, ya ana-ezo ezo aracha ihe na-atọ bịrịbịrị. Ọ́ bụrụkwanụ na ị chọpụta na ọ bụ ihe ọ na-eme, ma ya arịọ gị ka ị ghara ịgwa onye ọ bụla? Olee ihe ga-akacha dịrị gị mkpa—ọ̀ bụ izochi ihe ahụ enyi gị na-eme, ka ọ̀ bụ ime ihe nwere ike ichebe ndụ ya?

Otú ahụ ka ọ dị ma ọ bụrụ na ị ma na enyi gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo. Ụjọ atụla gị na ọ ga-emebi enyi gị na ya ma i kwuo! Ka oge na-aga, ọ bụrụ na onye ahụ bụ ezigbo enyi gị, ọ ga-achọpụta na ihe i mere bụ maka ọdịmma ya.—Abụ Ọma 141:5.

Ị̀ Na-eme Ya na Nzuzo, ka Ọ̀ Bụ na Ị Chọbeghị Ka Ndị Ọzọ Mara?

N’ezie, ọ bụghị mgbe niile nwoke na nwaanyị na-ezo mkpakọrịta ha ezo ka aghụghọ na-adị na ya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa chọrọ ịmata ibe ha nke ọma, ma ha achọbeghị ime ka ndị mmadụ mara. Ma eleghị anya, dị ka otu nwa okorobịa aha ya bụ Thomas kwuru, “ha achọghị ka ndị mmadụ na-ama ha njakịrị, na-ajụ ha ajụjụ ndị dị ka, ‘Oleekwanụ mgbe unu ga-alụ?’”

N’eziokwu, nsogbu ndị mmadụ na-enye ibe ha nwere ike imebi ihe. (Abụ nke Abụ 2:7) N’ihi ya, mgbe ụfọdụ ndị bidoro ịkpa, ha nwere ike ikpebi na ha agaghị eme ka ndị mmadụ mara. (Ilu 10:19) Anna, bụ́ nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ, sịrị: “Ọ ga-eme ka mmadụ abụọ ahụ nwee ike ikpebi ma hà ga-alụ. Ọ bụrụ na ha ekpebie na ha ga-alụ, ha nweziri ike ime ka ndị mmadụ mara.”

Ma, ọ dịghị mma ka i zochiere ya ndị kwesịrị ịma na unu na-akpa, dị ka ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị mụrụ onye ahụ gị na ya na-akpa. N’ezie, ọ bụrụ na ị chọghị ime ka ndị ọzọ mara, i kwesịrị ịjụ onwe gị ihe kpatara ya. Obi gị ọ̀ na-agwa gị na papa gị na mama gị ga-enwe ezigbo ihe mere ha ga-eji sị gị na onye ahụ akpala?

“Amatara M Ihe M Kwesịrị Ime”

Mgbe Jessica, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, nụrụ banyere nwa agbọghọ ọzọ bụ́ Onye Kraịst ya na nwa okorobịa kpara na nzuzo, ọ gbanwere otú o si ele ya na Jeremy ịkpa na nzuzo anya. Jessica sịrị: “Mgbe m nụchara otú o si hapụ onye ahụ ya na ya na-akpa, amatara m ihe m kwesịrị ime.” Ọ̀ dịịrị ya mfe ịhapụ Jeremy? Mbanụ! Jessica kwuru, sị: “Ọ bụ naanị ya bụ nwa okorobịa m nwetụrụla ezigbo mmasị n’ebe ọ nọ. Ebere m ákwá kwa ụbọchị ruo ọtụtụ izu.”

Ma, Jessica ma na ya hụrụ Jehova n’anya. N’agbanyeghị na o mere ihe na-adịghị mma, o ji obi ya dum chọọ ime ihe ziri ezi. Mwute ọ na-ewute ya na ọ hapụrụ onye ahụ mechara kwụsị. Jessica sịrị: “Ugbu a, o meela ka mmekọrịta mụ na Jehova ka mma. Obi dị m nnọọ ụtọ na ọ na-agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime n’oge kwesịrị ekwesị!”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ka e were ya na ị chọwala ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ya abụrụ na i nwetala onye dị gị mma. Olee otú ị ga-esi ama ma ihe ọ̀ ga-adabara gị na onye ahụ ma unu lụọ?

AMAOKWU BAỊBỤL

Anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.Ndị Hibru 13:18.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụghị iwu na ị ga-agwa ụwa niile na o nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya na-akpa. Ma, gwa ndị kwesịrị ịma. Nke ka nke, i kwesịrị ịgwa ndị mụrụ gị na ndị mụrụ onye ahụ gị na ya na-akpa.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ihe na-eme ka mmekọrịta dịtee aka bụ mmadụ ịtụkwasị ibe ya obi. Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-akpa na nzuzo, ọ ga-eme ka papa gị na mama gị ghara ịtụkwasị gị obi, meekwa ka mmekọrịta gị na onye ahụ ghara isi ike.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na mụ na Onye Kraịst na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m na-akpa na nzuzo, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na enyi m na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Tụgharịa uche n’ihe  atọ ahụ e ji mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dee na peeji nke 22. Ò nwere nke kọwara ihe na-eche mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ na o nwere, olee nke ọ bụ?

● Gịnị ka ị ga-eme banyere ya ma ghara inwe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya ga-akpawa na nzuzo?

● Ọ bụrụ na ị ma na enyi gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo, gịnị ka ị ga-eme, n’ihi gịnịkwa?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 27]

“Akwụsịrị m mụ na ya ịkpa. N’eziokwu, mgbe m laghachiri n’ụlọ akwụkwọ ma na-ahụ nwa okorobịa ahụ kwa ụbọchị, ọ na-ewute m. Ma Jehova Chineke nwere ike ịghọta ihe niile mere mgbe ahụ, ma anyị agaghị aghọtali ya. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi.”—Jessica

[Foto dị na peeji nke 25]

Inyere enyi gị aka zochie ọkpụkpa ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa yiri inyere onye na-arịa ọrịa shuga aka zochie nracha ọ na-aracha ihe na-atọ bịrịbịrị na nzuzo