Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Devid

Onye M Ga-eṅomi—Devid

Onye M Ga-eṅomi—Devid

Egwú na-atọ Devid ụtọ. O nwere nkà n’ịkụ egwú na n’ide abụ. Ọ na-ejidị aka ya arụ ngwá egwú nke ya. (2 Ihe E Mere 7:6) Ịkụ egwú doro Devid anya nke na eze Izrel kpọọrọ ya ka ọ na-akụrụ ya egwú n’obí ya. (1 Samuel 16:15-23) Devid kwetara. Ma o bulighị onwe ya elu, o kweghịkwa ka egwú rie ya isi. Kama, o ji nkà ya too Jehova.

Egwú ọ̀ na-atọ gị ụtọ? O nwere ike ịbụ na ị bụghị aka ochie n’ịkụ egwú, ma i nwere ike iṅomi ihe nlereanya Devid. Olee otú ị ga-esi eṅomi ya? Ọ bụ ime ka egwú ghara iri gị isi ma ọ bụ mee ka i chewe ma mewe ihe ga-emebi aha Chineke. Kama nke ahụ, jiri egwú mee ka i nwekwuo obi ụtọ. Ịkụ egwú na ịnụ ụtọ egwú bụ onyinye Chineke nyere mmadụ. (Jems 1:17) Devid ji onyinye ahụ mee Jehova obi ụtọ. Ị̀ ga-eme otú ahụ?