Papa Gị na Mama Gị
NKEBI NKE 6
Papa Gị na Mama Gị
Papa gị na mama gị ahụla ihe ná ndụ. Ha enwetụla nsogbu ụmụ okoro na agbọghọ na-enwe, marakwa otú mgbanwe niile ha na-ahụ n’ahụ́ ha na-adị. N’eziokwu, ọ bụ ha ga-akacha enyere gị aka ugbu a ị na-eto eto. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi ka ọ̀ bụ ha so na-akpatara gị nsogbu, kama inyere gị aka. Dị ka ihe atụ, i nwere ike inwe otu n’ime nsogbu ndị a:
□ Papa m na mama m na-abara m mba mgbe niile.
□ Ọgwụ ike ma ọ bụ mmanya eriela papa m ma ọ bụ mama m ahụ́.
□ Papa m na mama m na-ese okwu mgbe niile.
□ Papa m na mama m ebikwaghị.
Isi nke 21 ruo nke 25 ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị a na ndị ọzọ.
[Foto juru ihu peeji nke 172 na nke 173]