DỌMINIKAN RIPỌBLIK
E Mesiri Ha Ike
‘Anyị Ga-emechi Àmà Jehova n’Obodo A’
E mere otu nwanna aha ya bụ Borbonio Aybar baptizim n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Jenụwarị, afọ 1955. N’oge ahụ, a ka machiri anyị iwu ikwusa ozi ọma. Mgbe e mechara ya baptizim, ọ mụụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl n’obodo Mọnti Adentro nakwa na Santiago. N’afọ 1956, mgbe e wepụrụ iwu ahụ a machiri anyị, e mere nwunye ya na ụfọdụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl baptizim.
N’ihe dị ka abalị iri na ise n’ọnwa Julaị, afọ 1957, ndị isi na gọọmenti nwere nnọkọ na Salkedo ka ha mara otú ha ga-esi memilaa Ndịàmà Jehova. Nwanna Aybar kwuru na ọ bụ Francisco Prats-Ramírez kacha kwuo okwu ná nnọkọ ahụ. Prats-Ramírez sịrị na n’ime ụbọchị ole na ole, ha ga-emechi Àmà Jehova n’obodo ha. Abalị ole na ole o kwuchara ihe a, ya bụ, n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Julaị, afọ 1957, ndị uwe ojii nwụkọọrọ Ndịàmà Jehova niile nọ na Blanko Arịba, El Jobo, Lọs Kakaọs, nakwa na Mọnti Adentro.
Nwanna Aybar kọrọ, sị: “Eso m ná ndị a nwụchiri. E bugakwara anyị n’isi ụlọ ọrụ ndị agha dị na Salkedo. Ozugbo anyị rutere, otu onyeisi ndị agha aha ya bụ Saladín kụrụ m ihe. Ezigbo iwe ji ya mgbe ọ na-agwa anyị ihe ọ ga-eme anyị. Anyị kwụ n’ahịrị abụọ. Otu bụ maka ụmụnna nwoke, nke ọzọ abụrụ maka ụmụnna nwaanyị. Ndị na-eche onyeisi ahụ nche bidoro gbawa anyịnwa bụ́ ndị nwoke ụkwụ, na-akụkwa anyị ihe. Ha jikwa osisi na-akụ ndị nke nwaanyị. Ha na-akụ anyị ihe, ha ana-asị: ‘Anyị bụ ndị Katọlik, anyị ga-egbu unu.’”
“Agụọla m Baịbụl, amakwa m na Jehova bụ Chineke”
E riri Nwanna Aybar nhá, tụọkwa ya mkpọrọ ọnwa atọ. Nwanna Aybar kwuru, sị: “N’oge ahụ a tụrụ anyị mkpọrọ, otu onyeisi ndị agha aha ya bụ Santos Mélido Marte bịara
hụ anyị. Ọ gwara anyị, sị: ‘Agụọla m Baịbụl, amakwa m na Jehova bụ Chineke. O nweghị ihe ọ bụla unu mere a ga-eji tụọ unu mkpọrọ. Ma, o nweghị ihe m ga-emeliri unu n’ihi na ndị mere e ji tụọ unu mkpọrọ bụ ndị bishọp Chọọchị Katọlik. Ọ bụ naanị ha na onyeisi ala anyị, bụ́ Trujillo, nwere ike ime ka unu ghara ịnọzu oge unu ga-anọ ná mkpọrọ.’”“Ọ̀ Kwa Gị Bụ Onyeisi Ha?”
Ụfọdụ n’ime ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ bụ nwa Nwanna Nwaanyị Fidelia Jiménez nakwa ụmụ nwanne Fidelia. Ọ bụ Nwanna Nwaanyị Fidelia mụụrụ ha Baịbụl. Fidelia ji aka ya gakwuru ndị uwe ojii ka ha tụọ ya mkpọrọ, ọ bụ eziokwu na o soghị ná ndị e jidere. Ihe mere o ji mee ya bụ ka o nwee ike ịna-agba ụmụnna ndị a tụrụ mkpọrọ ume. N’oge ahụ, otu onyeisi ndị agha a na-eze eze bịara ịhụ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ. Aha ya bụ Ludovino Fernández. A ma ya ama na ọ bụ onye obi tara mmiri na onye mpako. Ọ sịrị ka a kpọtara ya Nwanna Nwaanyị Fidelia. Mgbe ọ bịara, ọ jụrụ ya, sị, “Ọ̀ kwa gị bụ onyeisi ha?”
Nwanna Nwaanyị Fidelia gwara ya, sị, “Abụghị m onyeisi ha. Ọ bụ unu bụ ndị isi.”
Fernández gwara ya, sị, “Ọ dị mma, ma ị́ bụghịnụ onyeisi ha, gị abụrụnụ pastọ ha.”
Fidelia sịrị ya, “Abụghị m pastọ ha. Ọ bụ Jizọs bụ pastọ ha.”
Fernández jụrụ ya, sị, “Ọ́ bụghị gị mere e ji tụọ ndị a niile mkpọrọ? Ọ́ bụghị gị kụziiri ha ihe?”
Nwanna Nwaanyị Fidelia sịrị ya, “Ọ bụghị m mere e ji tụọ ha mkpọrọ, ọ bụ Baịbụl. Ha na-eme ihe ha mụtara na Baịbụl.”
N’oge ahụ ha na-akparịta ụka, ụmụnna nwoke abụọ ndị uwe ojii kpọchikwara gafere. Aha ha bụ Pedro Germán na nwa nwanne papa Fidelia aha ya bụ Negro Jiménez. E si n’ebe a kpọchiri naanị ha na-akpọga ha n’ebe ndị mkpọrọ
na-anọ. Ọbara gbukwara uwe Negro yi. Anya ya zakwara aza. Mgbe Fidelia hụrụ na a kụọla ha ọ̀ dị ndụ ọnwụ ka mma, ọ jụrụ onyeisi ndị agha ahụ, sị, “Ihe a i mere ezigbo ụmụ amaala a na-atụ egwu Chineke, ọ̀ dị mma?” Mgbe Fernández hụrụ na ọ gaghị emenyeli Fidelia ụjọ, o kwuru ka a kpọghachi ya n’ebe a kpọchiri ya.Ndị na-efe Jehova ekwesịghị ịtụ ụjọ ma ụdị ọnwụnwa a bịara ha. Ọ bụ ya mere na ụmụnna anyị ndị a atụghị ụjọ. Ndị ọchịchị chọpụtadịrị na ha anaghị atụ ụjọ. Dị ka ihe atụ, n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Julaị, afọ 1957, onye na-arụrụ onyeisi ala ọrụ aha ya bụ Luis Arzeno Colón, degaara otu onye nọ n’ọkwá ukwu na gọọmenti akwụkwọ ozi. Ọ sịrị ya: “N’agbanyeghị na ndị omeiwu anyị emeela iwu na a machiela Ndịàmà Jehova ikwusa ozi ọma, ọtụtụ n’ime ha ka na-ekwusa ozi ọma.”