Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

E Nwere Ike Ijide Ha

E Nwere Ike Ijide Ha

‘Anyị Dị Akọ Ka Agwọ, ma Anyị Adịghị Aghụghọ Ka Nduru’

Ịga ọmụmụ ihe dị Ndịàmà Jehova nọ na Dọminikan Ripọblik ezigbo mkpa mgbe ahụ a machiri ha iwu. Ma, ịga ya nwere ike ime ka ha baa ná nsogbu. N’afọ ndị ahụ a machiri anyị iwu, e jidere ọtụtụ ụmụnna anyị tụọ ha mkpọrọ.

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Juanita Borges kwuru, sị: “Mgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova n’afọ 1953, o doro m anya na e nwere ike ijide m. Ọ bụkwa ihe mechara mee. Mgbe m gara na nke Nwanna Nwaanyị Eneida Suárez na Nọvemba afọ 1958, ndị uwe ojii nzuzo bịara ebe ahụ sị na anyị na-enwe ọmụmụ ihe. Ha nwụchiri anyị, tụọ anyị mkpọrọ ọnwa atọ. A gwakwara anyị kwụọ ihe dị ka puku naịra iri na isii.”

Ihe a bụ akwụkwọ ndị uwe ojii nzuzo depụtasiri aha ụmụnna anyị na ihe ụfọdụ gbasara ha.

Ndị ọchịchị mere ihe niile ha nwere ike ime ka ha kwụsị ụmụnna anyị ịna-enwe ọmụmụ ihe, ma ha akwụsịghị. Ma, ha ‘dị akọ ka agwọ, ha adịghịkwa aghụghọ ka nduru.’ (Mat. 10:16) Nwanna Andrea Almánzar kwuru otú ha na-esi aga ọmụmụ ihe. Ọ sịrị: “Anyị anaghị abịa ọmụmụ ihe n’otu oge. Anyị anaghịkwa alakarị n’oge. Anyị lawa, anyị anaghịkwa ala n’otu oge ka ndị mmadụ ghara ịmata na anyị si ọmụmụ ihe.”

A mụrụ Nwanna Nwaanyị Jeremías Glass mgbe papa ya León nọ na mkpọrọ. Ọ ghọrọ onye nkwusa n’afọ 1957, mgbe ọ dị afọ asaa. O kwuru otú ha na-esi amụ ihe n’oge ahụ n’ụlọ ha nakwa ihe ndị ha na-eme ka ndị uwe ojii ghara ijide ha. Ọ sịrị: “A na-enye mmadụ niile bịara ọmụmụ ihe mpempe akwụkwọ e dere mgbe onye nke ọ bụla ga-ala ma a gbasaa ọmụmụ ihe. Ọ na-abụ anyị gbasaa, papa m na-agwa m nọrọ n’ọnụ ụzọ na-ele nọmba e dere na mpempe akwụkwọ nke onye ọ bụla. Ọ na-agwakwa m ka m gwa ndị na-alanụ ka ha na-ala abụọ abụọ nakwa ka ha ghara isi otu ụzọ.”

Ihe ọzọ ụmụnna anyị na-eme bụ itinye oge ọmụmụ ihe ha mgbe a na-enwechaghị ndị ga-ejide ha. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mercedes García. Ọ bụ nwanne mama ya aha ya bụ Pablo González mụụrụ ya Baịbụl. Mama nwanna nwaanyị a nwụrụ mgbe ọ dị naanị afọ asaa. N’oge ahụ, papa ya nọ na mkpọrọ. Ọ bụzi ya na ụmụnne ya itoolu na-elekọta onwe ha. E mere Nwanna Nwaanyị Mercedes baptizim mgbe ọ dị afọ itoolu, ya bụ, n’afọ 1959. E kwuru okwu baptizim ya mgbe o ji ọkara gafee elekere atọ nke ụtụtụ ka ndị mmadụ ghara ịma. Ọ bụ n’ụlọ otu nwanna ka a nọ kwuo ya, e mekwara ya baptizim n’osimiri a na-akpọ Ozama. Mmiri a gafere isi obodo Dọminikan Ripọblik. Nwanna Nwaanyị Mercedes sịrị: “Mgbe ọ na-ejila ọkara gafee elekere ise nke ụtụtụ, anyị nọzi n’ụzọ na-alọta. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ka na-eteta eteta.”