Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

Mgbe Ala Ọma Jijiji Mere na Heiti

Mgbe Ala Ọma Jijiji Mere na Heiti

A Malitere Ọgbakọ Ndị Na-Eji Asụsụ Chaịniiz Amụ Ihe

E nwere otu nwanna aha ya bụ Tin Wa Ng na-eje ozi na Betel dị na Dọminikan Ripọblik. Ọ na-asụ Chaịniiz. N’afọ 2005, alaka ụlọ ọrụ mere ya ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ziga ya ka ọ na-ezi ndị na-asụ Chaịniiz nọ na Dọminikan Ripọblik ozi ọma. A mụrụ nwanna a na Dọminikan Ripọblik. Ọ nọkwa ebe ahụ too. Ndị mụrụ ya si Chaịna kwata Santo Domingo.

N’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị, afọ 2008, a malitere ọgbakọ na-eji asụsụ Chaịniiz amụ ihe na Santo Domingo, hiwekwa ìgwè na-eji asụsụ Chaịniiz amụ ihe na Santiago n’afọ 2011. Ndị nkwusa iri asaa, nke iri atọ na isii n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile, nakwa ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka, na-amụrụ ihe dị ka mmadụ iri asaa na isii Baịbụl kwa ọnwa.

Bidoro Izi Ndị Na-asụ Bekee Ozi Ọma

N’afọ 2007, ndị nkwusa nọ na Dọminikan Ripọblik dị puku iri abụọ na asaa, narị anọ na iri isii na isii. E nwekwara narị ọgbakọ atọ na iri asaa na isii. A na-amụkwara mmadụ dị puku iri anọ na itoolu, narị asaa na iri itoolu na ise Baịbụl. Ma e nweghị ọgbakọ Bekee ndị na-asụ Bekee ga-eso na-amụ ihe. N’ihi ya, n’Eprel afọ 2008, alaka ụlọ ọrụ zigara otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ ka ha gaa na Santo Domingo hiwe ìgwè na-eji asụsụ Bekee amụ ihe. Ha bụ Nwanna Donald Elwell na nwunye ya Jayne. Ndị nkwusa ole na ole e nwere n’ìgwè ahụ bu ụzọ chọpụta ebe ndị na-asụ Bekee bi ma hazie otú ha ga-esi na-arụ ha ka ha nwee ike izi ozi ọma nke ọma na ha.

Mbọ ndị a ụmụnna anyị gbara mere ka ọtụtụ ndị sonyere ìgwè ahụ na-eji Bekee amụ ihe na Santo Domingo na-amụ ihe. Ìgwè a mechara ghọọ ọgbakọ na Julaị afọ 2009. Ndị nkwusa nọ na ya dị iri atọ na itoolu. E hiwekwara ọgbakọ n’ebe ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere na Nọvemba afọ 2011, e nwere ọgbakọ asaa na otu ìgwè na-eji Bekee amụ ihe na Dọminikan Ripọblik.

Otu Nwaanyị Kpuru Ìsì ma Daa Ogbi Aghọọ Onyeàmà Jehova

Ihe a bụ ebe otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche ji asụsụ ndị ogbi na-agwa Lorys okwu

E nwere otu nwaanyị nne na nna ya nwụrụ mgbe ọ ka dị obere. Aha ya bụ Lorys. Ntị chiri ya mgbe a mụrụ ya. Mgbe ọ dị afọ iri na isii, o bidoro ikpu ìsì. Ọ na-ahụtụ ụzọ n’ehihie, ma ọ naghị ahụtụdị ụzọ n’abalị. Ọ na-abụ ọ chọọ ịgwa mmadụ okwu n’abalị, ya ejide mkpịsị aka onye ahụ ma jiri ya na-agwa ya okwu n’asụsụ ndị ogbi.

Otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche hụrụ Lorys mgbe ọ dị afọ iri abụọ na atọ ma zie ya ozi ọma. N’oge ahụ, ya na otu nwoke bi. Ha nwere otu nwa nwaanyị na-anụ ihe dị otu afọ. Di na nwunye a gwara Lorys ka ọ bịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya agaa. Ihe ndị ọ mụtara rukwara ya n’obi.

Lorys kwụsịrị ihe ọjọọ ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ mụtara na ya na nwoke ahụ ya na ya bi ekwesịghị ibi n’ihi na ọ lụbeghị ya, ọ gwara ya na ha kwesịrị ịlụ otú di na nwunye kwesịrị isi alụ. Ọ gwakwara ya na ya chọrọ ime ihe Baịbụl kwuru. Ihe a o kwuru juru nwoke ahụ anya, ya ekweta ka ha lụọ.

Mgbe ha lụchara, Lorys ghọrọ onye nkwusa. Obere oge, e mee ya baptizim. Ndịàmà Jehova kụziiri ya Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka mgbe ha na-amụrụ ya Baịbụl. Kemgbe ahụ, ọ na-akụziri ya nwa ya, jirikwa ya na-amụrụ ya Baịbụl.

Mgbe Ala Ọma Jijiji Kpara Ike na Heiti

Na Tuzdee, abalị iri na abụọ n’ọnwa Jenụwarị, afọ 2010, ala ọma jijiji kpara ike na Heiti. Ndị Dọminikan Ripọblik na ndị Heiti agaghị echefu ụbọchị ahụ echefu. Ozugbo ala ọma jijiji ahụ mechara, Òtù Na-achị Isi gwara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Dọminikan Ripọblik ka ha nye alaka ụlọ ọrụ dị na Heiti ego ha ga-eji zụta ihe ndị a ga-eji nyere ụmụnna anyị aka. Ebe ọ bụ na ego a buru ibu, a gwara otu dọkịta na-eje ozi na Betel ka o bugara ha ya. Aha ya bụ Evan Batista. O toro ogologo ma gbaa agbaa.

Mkpebi a e mere ziga Nwanna Batista bịara baa ezigbo uru n’ihi na mgbe o ruru, a gwara ya na a chọsiri ndị dọkịta ma ọrụ ike. E butere ọtụtụ ndị merụrụ ezigbo ahụ́ n’Ụlọ Mgbakọ dị n’akụkụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Heiti, ka a gwọọ ha. Mgbe ụmụnna matara na Nwanna Batista bụ dọkịta, ha kpọrọ alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Dọminikan Ripọblik rịọ ha ka ha kwe ka ọ nọtụkwuo na Heiti. Ha kwetakwara. Nwanna a bidoro gwọwa ụmụnna ndị merụrụ ahụ́. Otú a ka e si malite inyere ụmụnna nọ na Heiti aka, awa ole na ole ala ọma jijiji ahụ mechara.

Ụmụnna anyị gbataara ụmụnna ndị nọ na Heiti ọsọ enyemaka mgbe e nwechara ala ọma jijiji n’afọ 2010

Ngalaba Na-ahụ Maka Ịzụta Ihe n’alaka ụlọ ọrụ dị na Dọminikan Ripọblik zụtara ihe oriri ha ga-ebugara ụmụnna anyị. Ha zụtara osikapa, àgwà, na ihe oriri ndị ọzọ nwere ike iju otu nnukwu gwongworo bugara ụmụnna anyị nọ na Heiti. Ihe ndị ahụ rutere Heiti na Tọzdee, abalị iri na anọ n’ọnwa Jenụwarị, mgbe o ji ọkara gafee elekere anya abụọ n’isi ụtụtụ. Ọ ga-abụ ya bụ ihe mbụ e si mba ọzọ bute na Heiti maka ịgbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. N’otu ụbọchị ahụ, e si na Dọminikan Ripọblik zitekwuo dọkịta atọ ga-agwọ ụmụnna anyị merụrụ ahụ́. Ha gbara awa asaa n’ụzọ tupu ha eruo alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Heiti ná mgbede. Ozugbo ha rutere, ha gawara ebe ụmụnna anyị ndị merụrụ ahụ́ nọ gwọwa ha ruo ime abalị. N’echi ya, dọkịta anọ ọzọ na nọọsụ anọ sikwa na Dọminikan Ripọblik bịa. Ha ji ihe rụtatụ ebe ha nọ na-awa ndị mmadụ ahụ́ n’Ụlọ Mgbakọ, n’agbanyeghị na ọ dịcharaghị ha mfe ịnọ ebe ahụ eme otú ahụ. N’ime otu izu, ụmụnna anyị ndị dọkịta na ndị nọọsụ ndị ahụ gwọrọ ihe karịrị narị mmadụ atọ.

N’ụbọchị ọ bụla, a na-ebuga ụmụnna anyị ndị merụrụ ezigbo ahụ́ n’ụlọ ọgwụ dị iche iche na Dọminikan Ripọblik. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ụgbọala ndị e ji butere ụmụnna anyị ihe ka a na-eji ebuga ha. Alaka ụlọ ọrụ họpụtara ụmụnna ga na-aga eleta ndị ọrịa, ka ha na-agba ụmụnna ndị nọ n’ụlọ ọgwụ ume, hụkwa na e nyere ha ọgwụ na ihe ndị dị ha mkpa. Ọgbakọ ndị dị nso nyere ụmụnna ndị na-elekọta ndị ezinụlọ ha ahụ́ na-adịghị ụlọ na ihe oriri.

Ndịàmà Jehova tụkọtara ihe oriri na ihe ndị ọzọ juru ọtụtụ gwongworo zigara ụmụnna ha, kesaakwara ha ya

Mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara, otú ụmụnna anyị si gbasie mbọ ike nyere ụmụnna ha aka dabara n’ihe e kwuru n’Ilu 17:17. Ebe ahụ sịrị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” Ihe ndị mere eme gosiri na Jehova na-eji mmụọ nsọ ya na ụmụnna anyị enyere anyị aka, a sịgodị na mmadụ nwụnahụrụ anyị. E nyeere ụmụnna anyị nọ na Heiti aka ruo ọtụtụ ọnwa. Ndịàmà Jehova tụkọtara ihe oriri na ihe ndị ọzọ juru ọtụtụ gwongworo zigara ụmụnna ha, kesaakwara ha ya. Ụmụnna anyị ndị dọkịta na ndị nọọsụ, dị ihe dị ka mmadụ iri asaa na asatọ, si mba dị iche iche bịa nyere ụmụnna ndị nọ na Heiti aka. E nwekwara ọtụtụ ụmụnna anyị ndị ọzọ wepụtara onwe ha nyere ha aka n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. *

^ para. 1 Ị chọọ ịmatakwu otú e si nyere ụmụnna anyị aka, gụọ Teta! Bekee nke Disemba 2010, peeji nke 14-19.