DỌMINIKAN RIPỌBLIK
Obi Ha Tachiri Mere Ka Ha Nwere Onwe Ha
Anyị Na-eji Akọ Ezi Ozi Ọma
E nwere otu nwanna nwoke a na-akpọ Rafael Pared. Ya na nwunye ya Francia na-eje ozi na Betel. Ọ ghọrọ onye nkwusa n’afọ 1957, mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. O kwuru otú
ndị uwe ojii si na-esogharị ya mgbe ọ gara ozi ọma. Ihe mere ha ji na-esogharị ya bụ ka ha chọta ihe ha ga-akụdo aka jide ma ya ma ndị ya na ha na-arụ n’ozi ọma. Nwanna Rafael sịrị: “Mgbe ụfọdụ anyị chọọ ịpụ, anyị esi n’azụ ụlọ ma ọ bụ wụọ mgbidi ka ndị uwe ojii ghara ijide anyị.” Nwanna Nwaanyị Andrea Almánzar kwuru ihe ya na ụmụnna ndị ọzọ na eme ka a ghara ijide ha. Ọ sịrị: “Anyị na-eji akọ ezi ozi ọma. Ọ na-abụ anyị zie ozi ọma n’otu ụlọ, anyị agafee ụlọ iri zie ozi ọma na nke iri na otu.”E Mechara Kagbuo Iwu Ahụ A Machiri Anyị
N’abalị iri na anọ n’ọnwa Jun, afọ 1959, ụfọdụ ndị Dọminikan Ripọblik, bụ́ ndị si n’obodo ha gbaga obodo ọzọ, si n’ebe ndị ha gbagara bịa ka ha chụtuo Trujillo n’ọchịchị. N’oge ahụ, Trujillo achịala ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ. Nkata ahụ kụrụ afọ n’ala. E gburu ụfọdụ n’ime ha, tụọkwa ụfọdụ mkpọrọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, ndị na-agba ọchịchị Trujillo ụkwụ gbasiwere ya ike n’ihi na obi siri ha ike na e nwere ike ịkwatu ya n’ọchịchị.
N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Jenụwarị, afọ 1960, ndị isi Chọọchị Katọlik dere akwụkwọ ha ji kwuo na Trujillo na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ, ọ bụ eziokwu na ha akwadoola ọchịchị ya ọtụtụ afọ. Otu onye Dọminikan Ripọblik aha ya bụ Bernardo Vega, bụ́ onye na-akọ akụkọ ihe mere eme, sịrị: “Mbọ ahụ a gbara ịkwatu ọchịchị Trujillo na Jun afọ 1959 na ọnụ Trujillo mekpọrọ ndị chọrọ ịkwatu ọchịchị ya nakwa otú o si mechaa mesie ndị ọzọ gbara ọchịchị ya ụkwụ ike, mere ka Chọọchị Katọlik megidewezie ya.”
Mgbe ọtụtụ afọ gachara a machiri ụmụnna anyị iwu, gọọmenti kagburu iwu ahụ na Mee afọ 1960. Ọ bụ Trujillo kagburu ya. Ụmụnna anyị atụghịkwanụ anya na ọ bụ ya ga-akagbu ya. Ihe mere o ji mee otú ahụ bụ na ya na ndị Katọlik adịghịzi ná mma.