Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

Jehova Chineke si n’ike mmụọ nsọ mee ka Aịzaya buo amụma, sị: “M ga-eweta ọlaedo jiri ya dochie ọla kọpa, m ga-ewetakwa ọlaọcha jiri ya dochie ígwè, were ọla kọpa dochie osisi, werekwa ígwè dochie nkume.” (Aịza. 60:17) N’afọ gara aga, anyị hụrụ ihe ndị doro anya gosiri na amụma a ka na-emezu. Otú ahụ iwepụ ihe dịbu adị ma jiri nke ka ya mma dochie ya si egosi na a na-enwe ọganihu, Ndịàmà Jehova na-enwe ọganihu n’ihi ihe ndị ha hazigharịrịla ná nzukọ ha n’oge ikpeazụ a.—Mat. 24:3.

NÁ NKEBI A

Ọrụ Na-aga n’Ihu n’Ihu na Wọwik

Ị ga-agụta ihe ga-eme gị obi ụtọ mere n’ebe Ndịàmà Jehova na-ewu isi ụlọ ọrụ ọhụrụ ha na Wọwik.

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile

Ngalaba ọhụrụ a nwere nnukwu ọrụ nke bụ́ ịhụ na a rụchapụrụ ihe karịrị puku ụlọ nzukọ alaeze iri na atọ ngwa ngwa.

Baịbụl E Bipụtara ma Kwee Ka Ọ Ghara Imebi Ngwa Ngwa

Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ e degharịrị edegharị n’asụsụ Bekee n’afọ 2013 mara ezigbo mma, e mekwara ya ka ọ ghara imebi ngwa ngwa.

Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla

Ndị bịara nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania nke 129 karịrị ndị bịatụrụla nnọkọ a.

E Nyefere Jehova Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Dị na Sri Lanka

E si n’Ịntanet mee ka ụmụnna ndị zukọrọ n’ebe dị iche iche kirie ihe omume ahụ ma nụrụ ihe e kwuru.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Ndịàmà Jehova ka na-agbasi mbọ ike ka e kwe ha ka ha kpewe okpukpe ha otú ha chọrọ.

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Olee ihe mere ụmụntakịrị nwaanyị abụọ bi ná mba Jọjia ji were ego ha chọburu iji zụọ ekwentị nye ka a rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze?

“Anyị Ahụwo Ihe Ọhụrụ”

Olee ihe ndị na-eme n’oge a e nwere ike iji tụnyere ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ n’oge ọ nọ n’ụwa?