IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA
Olee Otú Ọrụ Si Na-aga na Wọwik?
OTÚ ọrụ si na-aga ngwa ngwa n’ebe a na-arụ isi ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị na Wọwik, dị́ na Niu Yọk, gosiri n’eziokwu na Jehova na-akwado anyị.
Nwanna Anthony Morris, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru na a rụchaa ya, a ga na-anabata ụmụnna anyị sí n’ebe dị iche iche n’ụwa ka ha bịa legharịa anya.