INDONESHIA
O Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe
Thio Seng Bie
-
A MỤRỤ YA N’AFỌ 1906
-
E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1937
-
ONYE Ọ BỤ Ọ bụ okenye ji obi ya niile fee Jehova. O diri ike e mesiri ya n’ihi agbụrụ o si.—Ọ bụ nwa ya nwaanyị aha ya bụ Thio Sioe Nio kọrọ akụkọ a.
N’ỌNWA Mee afọ 1963, ndị na-achọghị iji anya ahụ ndị Chaịna kpatara ọgba aghara n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java. Ebe ọgba aghara a kacha kpụrụ ọkụ n’ọnụ bụ n’obodo Sukabumi, bụ́ ebe ezinụlọ anyị nwere gwongworo ndị na-agbara anyị n’ụzọ. Ọtụtụ narị mmadụ, bụ́ ndị na-eme ara ara nakwa ụfọdụ ndị agbata obi anyị kụkara ụlọ anyị bata, mebisie ihe anyị, ma zuru ngwongwo anyị. Ezigbo ụjọ ji anyị, anyị niile agbakọta otu ebe na-ele ihe na-emenụ.
Mgbe ndị ahụ lara, ụfọdụ ndị agbata obi anyị bịara ka ha kasie anyị obi. Ha na papa m nọ n’ala na palọ kparịta ụka. Papa m hụrụ Baịbụl ya e dere n’asụsụ Sudaniiz ná ngwongwo anyị ndị a tụsasịrị n’ụlọ anyị. O mepere ya gwa ndị agbata obi anyị na Baịbụl kwuru na ụdị ihe a merenụ ga-eme. Ọ kọwaara ha banyere Alaeze Chineke anyị na-atụ anya ya, bụ́ nke na-eme anyị obi ụtọ.
Mkpa papa m abụghị ịkpakọbara onwe ya akụ̀ n’ụwa ebe a. Ọ na-agwakarị anyị, sị: “Ihe gbasara ofufe Chineke kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ anyị.” Ofufe Chineke o ji kpọrọ ihe mere ka ụmụ ya isii, papa ya dị́ afọ iri itoolu, mama anyị, ọtụtụ ndị ikwu anyị, nakwa ọtụtụ ndị agbata obi anyị bata n’ọgbakọ.