Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Ekwensu?

Ònye Bụ Ekwensu?

Ihe Ọmụmụ nke 4

Ònye Bụ Ekwensu?

Setan bụ́ Ekwensu—Olee ebe o si bịa? (1, 2)

Olee otú Setan si eduhie ndị mmadụ? (3-7)

N’ihi gịnị ka i ji kwesị iguzogide Ekwensu? (7)

1. Okwu ahụ bụ́ “ekwensu” pụtara onye na-ekwu ajọ okwu ụgha banyere onye ọzọ. “Setan” pụtara onye iro ma ọ bụ onye mmegide. Aha ndị a ka e nyere onye iro bụ́ isi nke Chineke. Na mbụ, ọ bụ mmụọ ozi zuru okè n’eluigwe n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, o mesịrị chebiga echiche ókè banyere onwe ya ma chọọ ofufe ahụ nke dịịrị nanị Chineke.—Matiu 4:8-10.

2. Mmụọ ozi a, bụ́ Setan, ji agwọ gwa Iv okwu. Site n’ịgwa ya okwu ụgha, o nwetara ya inupụrụ Chineke isi. Setan si otú a maa ihe a na-akpọ “ọbụbụeze” Chineke, ma ọ bụ ọnọdụ dị ka Onye Kachasị Ihe Nile Elu, aka. Setan rụrụ ụka ma Chineke ọ̀ na-achị n’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’ọdịmma kasịnụ nke ndị Ọ na-achị. Setan welitekwara obi abụọ ma ọ̀ dị mmadụ ọ bụla pụrụ iguzosi ike n’ihe nye Chineke. Site n’ime nke a, Setan mere onwe ya onye iro Chineke. Ọ bụ n’ihi ya ka e ji malite ịkpọ ya Setan bụ́ Ekwensu.—Jenesis 3:1-5; Job 1:8-11; Mkpughe 12:9.

3. Setan na-anwa ịghọgbuta ndị mmadụ ife ya ofufe. (2 Ndị Kọrint 11:3, 14) Otu ụzọ o si eduhie ndị mmadụ bụ site n’okpukpe ụgha. Ọ bụrụ na okpukpe na-akụzi ụgha dị iche iche banyere Chineke, n’ezie ọ na-ejere nzube Setan ozi. (Jọn 8:44) Ndị bụ́ ndị òtù okpukpe ụgha pụrụ iji ezi obi kwere na ha na-efe ezi Chineke ahụ ofufe. Ma ha na-efe Setan n’ezie. Ọ bụ ‘chi nke ụwa nke a.’—2 Ndị Kọrint 4:4.

4. Mgbaasị bụ ụzọ ọzọ Setan si eweta ndị mmadụ n’okpuru ike ya. Ha pụrụ ịkpọku ndị mmụọ ichebe ha, imerụ ndị ọzọ ahụ, ịkọ ọdịnihu, ma ọ bụ ịrụ ọrụ ebube. Setan bụ ike ọjọọ nọ n’azụ ihe omume ndị a nile. Iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị agaghị enwe ihe ọ bụla jikọrọ anyị na mgbaasị.—Deuterọnọmi 18:10-12; Ọrụ 19:18, 19.

5. Setan na-eduhiekwa ndị mmadụ site na nganga nke agbụrụ gabigara -ókè na ofufe nke nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche. Ụfọdụ na-eche na mba ma ọ bụ agbụrụ ha ka ndị ọzọ mma. Ma nke a abụghị eziokwu. (Ọrụ 10:34, 35) Ndị ọzọ na-elega­ra nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche anya idozi nsogbu ụmụ mmadụ. Site n’ime nke a, ha na-ajụ Alaeze Chineke. Ọ bụ nanị ihe ngwọta e nwere maka nsogbu anyị.—Daniel 2:44.

6. Ụzọ ọzọ Setan ji eduhie ndị mmadụ bụ site n’iji ọchịchọ mmehie nwaa ha. Jehova na-agwa anyị ka anyị zere omume mmehie dị iche iche n’ihi na ọ maara na ha ga-emerụ anyị ahụ. (Ndị Galetia 6:7, 8) Ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ ka i sonyere ha n’omume ndị dị otú ahụ. Ma, cheta, ọ bụ Setan n’ezie bụ onye na-achọ ka i mee ihe ndị a.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 15:33.

7. Setan pụrụ iji mkpagbu ma ọ bụ mmegide mee ka ị hapụ Jehova. Ụfọdụ n’ime ndị ị hụrụ n’anya pụrụ iwe oké iwe n’ihi na ị na-amụ Bible. Ndị ọzọ pụrụ ịkwa gị emo. Ma ònye ka ndụ gị dabeere na ya? Setan chọrọ iyi gị egwu ka i wee kwụsị ịmụ banyere Jehova. Ekwela ka Setan merie! (Matiu 10:34-39; 1 Pita 5:8, 9) Site n’iguzogide Ekwensu, ị pụrụ ime Jehova obi ụtọ ma gosi na ị na-ebuli ọbụbụeze Ya elu.—Ilu 27:11.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Okpukpe ụgha, mgbaasị, na ịhụ mba n’anya na-eduhie ndị mmadụ

[Foto dị na peeji nke 9]

Guzogide Setan site n’ịnọgide na-amụ banyere Jehova