Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Jisọs Kraịst?

Ònye Bụ Jisọs Kraịst?

Ihe Ọmụmụ nke 3

Ònye Bụ Jisọs Kraịst?

N’ihi gịnị ka e ji akpọ Jisọs Ọkpara Chineke “e buru ụzọ mụọ”? (1)

N’ihi gịnị ka e ji akpọ ya “Okwu ahụ”? (1)

N’ihi gịnị ka Jisọs ji bịa n’ụwa dị ka mmadụ? (2-4)

N’ihi gịnị ka o ji rụọ ọrụ ebube? (5)

Gịnị ka Jisọs ga-eme n’ọdịnihu dị nso? (6)

1. Jisọs biri n’eluigwe dị ka onye bụ mmụọ tupu ọ bịa n’ụwa. Ọ bụ ihe okike mbụ nke Chineke, ya mere a na-akpọkwa ya Ọkpara Chineke “e buru ụzọ mụọ.” (Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14) Jisọs bụ nanị Ọkpara nke Chineke kere n’onwe ya. Jehova jiri Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ mee ihe dị ka “onye ọkà” ya n’ike ihe nile ọzọ dị n’eluigwe na n’elu ala. (Ilu 8:22-31; Ndị Kọlọsi 1:16, 17) Chineke jikwara ya mee ihe dị ka ọnụ bụ isi na-ekwuru Ya. Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ Jisọs “Okwu ahụ.”—Jọn 1:1-3; Mkpughe 19:13.

2. Chineke zitere Ọkpara Ya n’ụwa site n’ibufe ndụ ya n’akpa nwa nke Meri. Ya mere Jisọs enweghị nna nke bụ mmadụ. Ọ bụ ya mere na o ketaghị mmehie ma ọ bụ ezughị okè ọ bụla. Chineke zitere Jisọs n’ụwa n’ihi ihe atọ: (1) Ịkụziri anyị eziokwu banyere Chineke (Jọn 18:37), (2) ijigide iguzosi ike n’ezi ihe zuru okè, na-esetịpụ ihe ilereanya anyị ga-agbaso (1 Pita 2:21), na (3) ịchụ ndụ ya n’àjà iji tọhapụ anyị site ná mmehie na ọnwụ. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa?—Matiu 20:28.

3. Site n’inupụ isi n’iwu Chineke, mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, mere ihe Bible na-akpọ “mmehie.” Ya mere Chineke mara ya ikpe ọnwụ. (Jenesis 3:17-19) O rukwaghị ụkpụrụ Chineke, ya mere ọ bụkwaghị onye zuru okè. Nwayọọ nwayọọ ọ kara nká ma nwụọ. Adam nyefere ụmụ ya nile mmehie. Ọ bụ n’ihi nke ahụ ka anyị ji na-akakwa nká, na-ada ọrịa, ma na-anwụ anwụ. Olee otú a pụrụ isi zọpụta ihe a kpọrọ mmadụ?—Ndị Rom 3:23; 5:12.

4. Jisọs bụ mmadụ zuru okè dị nnọọ ka Adam. Ma, n’adịghị ka Adam, Jisọs rubeere Chineke isi n’ụzọ zuru okè ọbụna n’okpuru ule kasị sie ike. Ya mere ọ pụrụ ịchụ ndụ mmadụ ya zuru okè n’àjà iji kwụọ ụgwọ maka mmehie Adam. Nke a bụ ihe Bible na-arụtụ aka dị ka “ihe mgbapụta” ahụ. A pụrụ isi otú a tọhapụ ụmụ Adam site n’ikpe ọmụma nke ọnwụ. Ndị nile tinyere okwukwe ha na Jisọs pụrụ ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha ma nata ndụ ebighị ebi.—1 Timoti 2:5, 6; Jọn 3:16; Ndị Rom 5:18, 19.

5. Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, meekwa ka oké ifufe dajụọ. Ọbụna na ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. N’ihi gịnị ka o ji rụọ ọrụ ebube? (1) O nwere ọmịiko maka ndị mmadụ na-ahụju anya, ọ chọkwara inyere ha aka. (2) Ọrụ ebube ya gosiri na ọ bụ Ọkpara Chineke. (3) Ha gosiri ihe ọ ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi mgbe ọ ga-achị dị ka Eze n’elu ụwa.—Matiu 14:14; Mak 2:10-12; Jọn 5:28, 29.

6. Jisọs nwụrụ, Chineke kpọlitekwara ya n’ọnwụ dị ka ihe e kere eke bụ mmụọ, ọ laghachikwara n’eluigwe. (1 Pita 3:18) Eri mgbe ahụ, Chineke emewo ya Eze. N’oge na-adịghị anya Jisọs ga-ewepụ ajọ omume nile na nhụjuanya site n’ụwa a.—Abụ Ọma 37:9-11; Ilu 2:21, 22.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ozi Jisọs gụnyere izi ihe, ịrụ ọrụ ebube, na ọbụna ịchụ ndụ ya n’àjà n’ihi anyị