Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere

Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere

Ihe Ọmụmụ nke 7

Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere

N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ikpe ekpere mgbe nile? (1)

Ònye ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere, n’ụzọ dịkwa aṅaa? (2, 3)

Olee isiokwu ndị kwesịrị ekwesị maka ekpere? (4)

Olee mgbe i kwesịrị ikpe ekpere? (5, 6)

Chineke ọ̀ na-anụ ekpere nile? (7)

1. Ekpere bụ iji obi umeala gwa Chineke okwu. I kwesịrị ikpegara Chineke ekpere mgbe nile. N’ụzọ dị otú ahụ ị pụrụ inwe mmetụta nke ịnọ ya nso dị ka enyi a hụrụ n’anya. Jehova dị ukwuu dịkwa ike hie nne, ma ọ na-ege ntị n’ekpere anyị! Ị̀ na-ekpegara Chineke ekpere mgbe nile?—Abụ Ọma 65:2; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.

2. Ekpere bụ akụkụ nke ofufe anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ikpegara nanị Chineke, bụ́ Jehova, ekpere. Mgbe Jisọs nọ n’elu ụwa, o kpegaara Nna ya ekpere mgbe nile, ọ bụghị onye ọ bụla ọzọ. Anyị kwesịrị ime otu ihe ahụ. (Matiu 4:10; 6:9) Otú ọ dị, anyị kwesịrị ikpe ekpere anyị nile n’aha Jisọs. Nke a na-egosi na anyị na-akwanyere ọnọdụ Jisọs ùgwù nakwa na anyị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ya.—Jọn 14:6; 1 Jọn 2:1, 2.

3. Mgbe anyị na-ekpe ekpere anyị kwesịrị ịgwa Chineke okwu site n’obi anyị. Anyị ekwesịghị ikpe ekpere anyị site n’ihe e bu n’isi ma ọ bụ gụpụta ya site n’akwụkwọ ekpere. (Matiu 6:7, 8) Anyị pụrụ ikpe ekpere n’ọnọdụ ọ bụla na-egosi nkwanye ùgwù, n’oge ọ bụla, na n’ebe ọ bụla. Chineke pụrụ ịnụ ọbụna ekpere anyị na-ekpepụtaghị ekpepụta. (1 Samuel 1:12, 13) Ọ dị mma ịchọta ebe dị jụụ ndị ọzọ na-anọghị ya iji kpee ekpere onwe onye anyị.—Mak 1:35.

4. Isiokwu ndị dị aṅaa ka ị pụrụ ikpe ekpere banyere ha? Ihe ọ bụla nke pụrụ imetụta mmekọrịta gị na ya. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ekpere ihe atụ ahụ na-egosi na anyị kwesịrị ikpe ekpere banyere aha na nzube Jehova. Anyị pụkwara ịrịọ ka e gboo mkpa anụ ahụ anyị, ka a gbaghara anyị mmehie anyị, na maka enyemaka iji guzogide ọnwụnwa. (Matiu 6:9-13) Ekpere anyị ekwesịghị ịbụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye. Anyị kwesịrị ikpe ekpere nanị maka ihe ndị kwekọrọ n’uche Chineke.—1 Jọn 5:14.

5. Ị pụrụ ikpe ekpere mgbe ọ bụla obi gị kwaliri gị ikele ma ọ bụ ito Chineke. (1 Ihe Emere 29:10-13) I kwesịrị ikpe ekpere mgbe i nwere nsogbu na mgbe a na-ele okwukwe gị ule. (Abụ Ọma 55:22; 120:1) O kwesịrị ekwesị ikpe ekpere tupu i rie nri gị. (Matiu 14:19) Jehova na-akpọ anyị òkù ikpe ekpere “n’oge nile.”—Ndị Efesọs 6:18.

6. Ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere karịsịa ma ọ bụrụ na anyị emewo mmehie dị njọ. N’oge ndị dị otú ahụ anyị kwesịrị ịrịọ maka ebere na mgbaghara Jehova. Ọ bụrụ na anyị ekwupụtara ya mmehie anyị ma mee ihe nile anyị pụrụ ime ịghara imeghachi ha, Chineke ‘dị njikere ịgbaghara.’—Abụ Ọma 86:5, NW; Ilu 28:13.

7. Jehova na-ege ntị nanị n’ekpere ndị ezi omume. Ka Chineke wee nụ ekpere gị, ị ghaghị ịdị na-agbalị ibi ndụ dị ka ụkpụrụ ya nile si dị. (Ilu 15:29; 28:9) Ị ghaghị ịdị obi umeala mgbe ị na-ekpe ekpere. (Luk 18:9-14) Ọ dị gị mkpa ịrụ ọrụ n’ihe ahụ ị na-ekpe ekpere maka ya. Ị ga-esi otú ahụ gosi na i nwere okwukwe nakwa na uche gị dị n’ezie n’ihe ị na-ekwu. Nanị mgbe ahụ ka Jehova ga-aza ekpere gị.—Ndị Hibru 11:6.