Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Ihe Ọmụmụ nke 5

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

N’ihi gịnị ka Jehova ji kee ụwa? (1, 2)

Gịnị mere na ụwa abụghị paradaịs ugbu a? (3)

Gịnị ga-eme ndị ajọ omume? (4)

N’ọdịnihu, gịnị ka Jisọs ga-emere ndị ọrịa? ndị agadi? ndị nwụrụ anwụ? (5, 6)

Iji kere òkè ná ngọzi ọdịnihu ndị ahụ, gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee? (7)

1. Jehova kere ụwa a ka ụmụ mmadụ wee nwee ike inwe obi ụtọ ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ chọrọ ka ụwa bụrụ mgbe nile ihe ndị ezi omume na-enwe obi ụtọ bijupụtara. (Abụ Ọma 115:16; Aịsaịa 45:18) A gaghị ebibi ụwa mgbe ọ bụla; ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 104:5; Eklisiastis 1:4.

2. Tupu Chineke emee mmadụ, Ọ họọrọ otu akụkụ dị nta nke ụwa ma mee ya paradaịs mara mma. Ọ kpọrọ ya ogige Iden. Ọ bụ n’ebe a ka o tinyere nwoke na nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv. Chineke zubere ka ha mụọ ụmụ, jupụtakwa ụwa nile. Nke nta nke nta ha ga-emeworị ka ụwa dum ghọọ paradaịs.—Jenesis 1:28; 2:8, 15.

3. Adam na Iv mehiere site n’ịkpachara anya mebie iwu Chineke. Ya mere Jehova chụpụrụ ha n’ogige Iden. A tụfuru paradaịs. (Jenesis 3:1-6, 23) Ma Jehova echefubeghị nzube ya maka ụwa a. O na-ekwe nkwa ime ya ka ọ bụrụ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú ọ ga-esi mee nke a?—Abụ Ọma 37:29.

4. Tupu ụwa a enwee ike ịghọ paradaịs, a ghaghị iwepụ ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 37:38) Nke a ga-eme n’Amagedọn, nke bụ agha Chineke iji weta ajọ omume ná njedebe. Mgbe nke a gasịrị, a ga-atụ Setan mkpọrọ 1,000 afọ. Nke a pụtara na a gaghị ahapụ ndị ajọ omume ọ bụla imebi ụwa. Nanị ndị Chineke ga-alanarị.—Mkpughe 16:14, 16; 20:1-3.

5. Mgbe ahụ Jisọs Kraịst ga-achị dị ka Eze n’elu ụwa a ruo 1,000 afọ. (Mkpughe 20:6) Ọ ga-eji nke nta nke nta wepụ mmehie n’uche na n’ahụ anyị. Anyị ga-aghọ ụmụ mmadụ zuru okè dị nnọọ ka Adam na Iv zuru okè tupu ha emehie. Mgbe ahụ a gaghị enwekwa ọrịa, ịka nká, na ọnwụ ọzọ. A ga-agwọ ndị ọrịa, ndị agadi ga-aghọkwa ndị na-eto eto ọzọ.—Job 33:25; Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3, 4.

6. N’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs, ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-arụ ọrụ ime ka ụwa nile ghọọ paradaịs. (Luk 23:43) Ọzọkwa, a ga-akpọliteghachi ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ gaa ná ndụ mmadụ n’elu ala. (Ọrụ 24:15) Ọ bụrụ na ha emee ihe Chineke chọrọ n’aka ha, ha ga-anọgide na-adị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọ́ bụghị ya, a ga-ebibi ha ruo ebighị ebi.—Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:11-15.

7. Nzube mbụ nke Chineke maka ụwa ga-esi otú a gaa nke ọma. Ọ̀ ga-amasị gị ikere òkè ná ngọzi ọdịnihu ndị a? Ya bụrụ otú ahụ, ọ dị gị mkpa ịnọgide na-amụ banyere Jehova ma na-erubere ihe ọ chọrọ isi. Ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè gị ga-enyere gị aka ime otú ahụ.—Aịsaịa 11:9; Ndị Hibru 10:24, 25.

[Foto dị na peeji nke 10]

Paradaịs furu efu

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Amagedọn gasịa, a ga-eme ụwa ka ọ ghọọ paradaịs