Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ na Ọbara

Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ na Ọbara

Ihe Ọmụmụ nke 12

Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ na Ọbara

Olee otú anyị kwesịrị isi lee ndụ anya? (1) nsikwopu afọ ime? (1)

Olee otú ndị Kraịst si egosi na ha na-ebu ihe nchebe n’uche? (2)

Ọ̀ dị njọ igbu ụmụ anụmanụ? (3)

Gịnị bụ ụfọdụ omume ndị na-adịghị egosi nkwanye ùgwù maka ndụ? (4)

Gịnị bụ iwu Chineke banyere ọbara? (5)

Nke a ọ̀ gụnyere mmịnye ọbara? (6)

1. Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ. Ihe nile dị ndụ ji Chineke ụgwọ ndụ ha. (Abụ Ọma 36:9) Ndụ bụ ihe dị nsọ nye Chineke. Ọbụna ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ nke nọ n’ime afọ nne ya dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ịkpachara anya gbuo nwa ọhụrụ dị otú ahụ dị njọ n’anya Chineke.—Ọpụpụ 21:22, 23; Abụ Ọma 127:3.

2. Ezi ndị Kraịst na-eburu ihe nchebe n’uche. Ha na-ejide n’aka na ụgbọ ala ha na ebe obibi ha adịghị ize ndụ. (Deuterọnọmi 22:8) Ndị ohu Chineke adịghị etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ na-adịghị mkpa nanị maka ihe ụtọ ma ọ bụ mkpali. Ya mere ha adịghị ekere òkè n’egwuregwu ime ihe ike nke na-akpacha­ra anya emerụ ndị ọzọ ahụ. Ha na-ezere ihe ntụrụndụ na-akwalite ime ihe ike.—Abụ Ọma 11:5; Jọn 13:35.

3. Ndụ anụmanụ dịkwa nsọ n’anya Onye Okike. Onye Kraịst pụrụ igbu anụmanụ iji nweta ihe oriri na uwe oyiyi ma ọ bụ iji chebe onwe ya site ná nrịanrịa na ihe ize ndụ. (Jenesis 3:21; 9:3; Ọpụpụ 21:28) Ma ọ dịghị mma imeso ụmụ anụmanụ omume na-adịghị mma ma ọ bụ gbuo ha nanị maka egwuregwu ma ọ bụ ihe ụtọ.—Ilu 12:10.

4. Ise siga, ịta akị osisi betel, na ịṅụ ọgwụ n’ihi ihe ụtọ abụghị maka ndị Kraịst. Omume ndị a dị njọ n’ihi na (1) ha na-eme anyị ohu ha, (2) ha na-emerụ anyị ahụ, na (3) ha adịghị ọcha. (Ndị Rom 6:19; 12:1; 2 Ndị Kọrint 7:1) Ọ pụrụ isi oké ike ịhapụ àgwà ndị a. Ma anyị aghaghị ime otú ahụ iji wee mee Jehova obi ụtọ.

5. Ọbara dịkwa nsọ n’anya Chineke. Chineke sịrị na mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ, dị n’ime ọbara. Ya mere ọ dị njọ iri ọbara. Ọ dịkwa njọ iri anụ anụmanụ ọ bụla a na-egbupụghị ọbara nke ọma. Ọ bụrụ na a kwụgburu anụmanụ akwụgbu ma ọ bụ ọ nwụọ n’ọnyà, e kwesịghị iri ya. Ọ bụrụ na a mara ya ube ma ọ bụ gbaa ya égbè, a ghaghị igbupụ ya ọbara ngwa ngwa ma ọ bụrụ na a ga-eri ya eri.—Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:13, 14; Ọrụ 15:28, 29.

6. Ọ̀ dị njọ ịnara mmịnye ọbara? Cheta, Jehova chọrọ ka anyị hapụ ọbara. Nke a pụtara na anyị agaghị amị­nye n’ime ahụ anyị ọbara ndị ọzọ n’ụzọ ọ bụla ma ọ bụ ọbụna ọbara nke anyị nke e debere edebe. (Ọrụ 21:25) Ya mere ezi ndị Kraịst agaghị anara mmị­nye ọbara. Ha ga-anabata ụdị ndị ọzọ nke ọgwụgwọ ọrịa, dị ka mmịnye nke ihe ndị a na-ejighị ọbara mee. Ha chọrọ ịdị ndụ, ma ha agaghị agbalị ịzọpụta ndụ ha site n’imebi iwu Chineke.—Matiu 16:25.

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị aghaghị izere mmịnye ọbara, àgwà ndị na-adịghị ọcha, na ihe ize ndụ ndị na-adịghị mkpa