Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Uche Chineke

Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Uche Chineke

Ihe Ọmụmụ nke 15

Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Uche Chineke

N’ihi gịnị ka ị ga-eji gwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ị na-amụta? (1)

Olee ndị ka ị pụrụ isoro kerịta ozi ọma ahụ? (2)

Mmetụta dị aṅaa ka àgwà gị pụrụ inwe n’ahụ ndị ọzọ? (2)

Olee mgbe ị pụrụ isoro ọgbakọ mee nkwusa? (3)

1. Ka ọ dị ugbu a, ị mụtawo ọtụtụ ihe dị mma site na Bible. Ihe ọmụma a kwesịrị iduga na gị ịzụlite ọdịdị nke ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ihe ọmụma dị otú ahụ dị mkpa ka i wee nwee ike inweta ndụ agwụghị agwụ. (Jọn 17:3) Otú ọ dị, ọ dịkwa ndị ọzọ mkpa ịnụ ozi ọma ahụ ka e wee nwee ike ịzọpụtakwa ha. Ezi ndị Kraịst nile aghaghị ịgbara ndị ọzọ àmà. Ọ bụ iwu Chineke.—Ndị Rom 10:10; 1 Ndị Kọrint 9:16; 1 Timoti 4:16.

2. Ị pụrụ ịmalite site n’isoro ndị ọzọ nọ gị nso kerịta ezi ihe ndị ị na-amụta. Kọọrọ ha ndị ezinụlọ, ndị enyi, ụmụ akwụkwọ, na ndị ọrụ ibe gị. Na-enwe obi ebere na ndidi mgbe ị na-eme otú ahụ. (2 Timoti 2:24, 25) Cheta na ndị mmadụ na-elekarị àgwà mmadụ anya karịa ka ha na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. Ya mere ezi àgwà gị pụrụ ịdọta ndị ọzọ ịṅa ntị n’ozi ị na-ezi ha.—Matiu 5:16; 1 Pita 3:1, 2, 16.

3. Ka oge na-aga, ị pụrụ iru eru ịmalite iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị mee nkwusa. Nke a bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ọganihu gị. (Matiu 24:14) Lee aha ọṅụ ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere onye ọzọ aka ịghọ ohu Jehova ma nweta ndụ agwụghị agwụ!—1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, 20.