Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ohu Chineke Aghaghị Ịdị Ọcha

Ndị Ohu Chineke Aghaghị Ịdị Ọcha

Ihe Ọmụmụ nke 9

Ndị Ohu Chineke Aghaghị Ịdị Ọcha

N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji dị ọcha n’ụzọ ọ bụla? (1)

Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịdị ọcha nke ime mmụọ? (2) ịdị ọcha n’omume? (3) ịdị ọcha n’uche? (4) ịdị ọcha n’anụ ahụ? (5)

Ụdị dịgasị aṅaa nke okwu na-adịghị ọcha ka anyị kwesịrị izere? (6)

1. Jehova Chineke dị ọcha dịkwa nsọ. Ọ na-atụ anya ka ndị na-efe ya ofufe na-anọgide na-adị ọcha—n’ime mmụọ, n’omume, n’uche, na n’anụ ahụ. (1 Pita 1:16) Ọ na-ewe ezi mgbalị iji dị ọcha n’anya Chineke. Anyị na-ebi n’ụwa nke adịghị ọcha. Anyị na-agbakwa mgba megide ọchịchọ anyị ime ihe na-adịghị mma. Ma anyị agajeghị ịda mbà ma ọlị.

2. Ịdị Ọcha Ime Mmụọ: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ijere Jehova ozi, anyị apụghị ịnọ na-ejigide ụdị ọ bụla nke nkụzi ma ọ bụ omenala nke okpukpe ụgha. Anyị aghaghị isi n’okpukpe ụgha pụta, gharakwa ịkwado ya n’ụzọ ọ bụla. (2 Ndị Kọrint 6:14-18; Mkpughe 18:4) Ozugbo anyị mụtaworo eziokwu banyere Chineke, anyị aghaghị ịkpachara anya ka ndị na-ezi ihe na-ezighị ezi ghara iduhie anyị.—2 Jọn 10, 11.

3. Ịdị Ọcha nke Omume: Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe na-eme omume dị ka ezi ndị Kraịst mgbe nile. (1 Pita 2:12) Ọ na-ahụ ihe nile anyị na-eme, ọbụna ná nzuzo. (Ndị Hibru 4:13) Anyị kwesịrị izere mmekọahụ rụrụ arụ na omume ndị ọzọ na-adịghị ọcha nke ụwa a.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

4. Ịdị Ọcha nke Uche: Ọ bụrụ na anyị ejiri echiche ndị dị ọcha mejupụta uche anyị, omume anyị ga-adịkwa ọcha. (Ndị Filipaị 4:8) Ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị uche n’ihe ndị na-adịghị ọcha, ọ ga-arụpụta omume ọjọọ. (Matiu 15:18-20) Anyị kwesịrị izere ụdị ntụrụndụ ndị pụrụ imetọ uche anyị. Anyị pụrụ iji echiche ndị dị ọcha mejuo uche anyị site n’ịmụ Okwu Chineke.

5. Ịdị Ọcha nke Anụ Ahụ: N’ihi na ha na-anọchite anya Chineke, ndị Kraịst kwesịrị idebe ahụ ha na uwe ha ọcha. Anyị kwesịrị ịkwọ aka anyị mgbe anyị jesịrị mposi, anyị kwesịkwara ịkwọ ha tupu e rie nri ma ọ bụ metụ ihe oriri aka. Ọ bụrụ na i nweghị usoro mposi dị mma, e kwesịrị ili nsị n’ime ala. (Deuterọnọmi 23:12, 13) Ịnọgide na-adị ọcha n’elu ahụ na-etinye ihe n’ezi ahụ ike. Ebe obibi nke onye Kraịst kwesịrị ịdị ọcha dịkwa mma n’anya ma n’ime ma n’èzí. O kwesịrị iguzopụ iche n’ógbè ahụ dị ka ezi ihe atụ.

6. Okwu Dị Ọcha: Ndị ohu Chineke aghaghị ikwu eziokwu mgbe nile. Ndị ụgha agaghị aba n’Alaeze Chineke. (Ndị Efesọs 4:25; Mkpughe 21:8) Ndị Kraịst adịghị eji okwu rere ure eme ihe. Ha adịghị ege ntị na ma ọ bụ na-ama njakịrị ndị ruru unyi ma ọ bụ akụkọ ndị na-adịghị ọcha. N’ihi okwu ha dị ọcha, ha na-eguzopụ dị ka ndị dị iche n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ na n’agbata obi.—Ndị Efesọs 4:29, 31; 5:3.

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Ndị ohu Chineke aghaghị ịdị ọcha n’akụkụ nile