Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ

Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ

Ihe Ọmụmụ nke 8

Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ

Gịnị bụ ọnọdụ nke di n’ime ezinụlọ? (1)

Olee otú di kwesịrị isi mesoo nwunye ya? (2)

Ibu ọrụ dịgasị aṅaa ka nna nwere? (3)

Gịnị bụ ọrụ onye bụ nwunye n’ime ezinụlọ? (4)

Gịni ka Chineke na-achọ n’aka ndị nne na nna na n’aka ụmụ? (5)

Gịnị bụ echiche Bible banyere nkewa na ịgba alụkwaghịm? (6, 7)

1. Bible na-asị na di bụ isi nke ezinụlọ ya. (1 Ndị Kọrint 11:3) Di agha­ghị inwe nanị otu nwunye. Ha kwesịrị ịbụ ndị gbara akwụkwọ otú ­kwesịrị ekwesị dị ka iwu si dị.—1 Timoti 3:2; Taịtọs 3:1.

2. Di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya. O kwesịrị imeso ya omume n’ụzọ Jisọs si emeso ụmụazụ ya. (Ndị Efesọs 5:25, 28, 29) O kwesị­ghị iti nwunye ya ihe ma ọlị ma ọ bụ megbuo ya n’ụzọ ọ bụla. Kama nke ahụ, o kwesịrị inye ya nsọpụrụ na nkwanye ùgwù.—Ndị Kọlọsi 3:19; 1 Pita 3:7.

3. Nna kwesịrị ịrụsi ọrụ ike iji lekọta ezinụlọ ya. Ọ ghaghị inye nwunye ya na ụmụ ya ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Nna aghaghịkwa imeju mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ya. (1 Timoti 5:8) Ọ na-ebute ụzọ n’inyere ezinụlọ ya aka ịmụta banyere Chineke na nzube Ya.—Deuterọnọmi 6:4-9; Ndị Efesọs 6:4.

4. Nwunye kwesịrị ịbụrụ di ya ezi onye inyeaka. (Jenesis 2:18) O kwesịrị inyere di ya aka n’ịkụziri ụmụ ha ihe na ịzụlite ha. (Ilu 1:8) Jehova na-achọ ka nwunye jiri ịhụnanya na-elekọta ezinụlọ ya. (Ilu 31:10, 15, 26, 27; Taịtọs 2:4, 5) O kwesịrị ịdị na-atụ egwu di ya.—Ndị Efesọs 5:22, 23, 33.

5. Chineke chọrọ ka ụmụ na-erubere nne na nna ha isi. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ na-atụ anya ka ndị nne na nna zie ụmụ ha ihe ma gbazie ha olu. Ọ dị ndị nne na nna mkpa iwepụta oge soro ụmụ ha nọkọọ ma mụọrọ ha Bible, na-egbo mkpa ime mmụọ na nke mmetụta uche ha. (Deuterọnọmi 11:18, 19; Ilu 22:6, 15) Ndị nne na nna ekwesịghị mgbe ọ bụla ịdọ ụmụ ha aka ná ntị n’ụzọ aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ.—Ndị Kọlọsi 3:21.

6. Mgbe di na nwunye nwere nsogbu nke enweghị nkwekọrịta, ha kwesịrị ịgbalị itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Bible na-agba anyị ume igosi ịhụnanya ma na-agbaghara. (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Okwu Chineke adịghị agba ume iwere nkewa dị ka ụzọ isi dozie nsogbu ndị dị nta. Ma nwunye pụrụ ịhọrọ ịhapụ di ya ma ọ bụrụ na (1) o were isi ike jụ ịkwado ezinụlọ ya, (2) ọ na-eme ihe ike nke ukwuu nke na ndụ na ahụ ike ya nọ n’ihe ize ndụ, ma ọ bụ (3) mmegide ya gabigara ókè na-eme ya ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe ya omume ife Jehova.—1 Ndị Kọrint 7:12, 13.

7. Ndị di na nwunye aghaghị ikwesị ntụkwasị obi nye ibe ha. Ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye bụ mmehie megide Chineke na megide onye mmadụ lụrụ. (Ndị Hibru 13:4) Mmekọahụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye bụ nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm na-enye ohere maka nlụgharị. (Matiu 19:6-9; Ndị Rom 7:2, 3) Jehova na-akpọ ya asị mgbe ndị mmadụ na-agba alụkwaghịm n’enweghị nkwado Akwụkwọ Nsọ ma lụrụ onye ọzọ.—Malakaị 2:14-16.

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Chineke na-atụ anya ka ndị nne na nna zie ụmụ ha ihe ma gbazie ha olu

[Foto dị na peeji nke 17]

Nna na-ahụ n’anya na-enye ezinụlọ ya ihe anụ ahụ na ihe ime mmụọ