Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ?

Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ?

Ihe Ọmụmụ nke 13

Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ?

Okpukpe nile hà na-atọ Chineke ụtọ, ka ọ̀ bụ nanị otu? (1)

N’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ okpukpe na-azọrọ ịbụ nke Kraịst? (2)

Olee otú ị pụrụ isi chọpụta ezi ndị Kraịst? (3-7)

1. Jisọs malitere otu ezi okpukpe ndị Kraịst. Ya mere taa a ghaghị inwe nanị otu ìgwè, ma ọ bụ òtù, nke ezi ndị na-efe Jehova Chineke ofufe. (Jọn 4:23, 24; Ndị Efesọs 4:4, 5) Bible na-akụzi na nanị mmadụ ole na ole nọ n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduga ná ndụ.—Matiu 7:13, 14.

2. Bible buru amụma na mgbe ọnwụ ndị ozi gasịrị, ozizi ụgha na omume na-ekwesịghị ndị Kraịst ga-eji nwayọọ bata n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị mmadụ ga-adọpụ ndị kwere ekwe isoro ha kama Kraịst. (Matiu 7:15, 21-23; Ọrụ 20:29, 30) Ọ bụ n’ihi ya ka anyị ji ahụ ọtụtụ okpukpe dị iche iche na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst. Olee otú anyị pụrụ isi chọpụta ezi ndị Kraịst?

3. Akara pụtakarịsịrị ìhè nke ezi ndị Kraịst bụ na ha nwere ezi ịhụnanya n’etiti onwe ha. (Jọn 13:34, 35) E zighị ha iche na ha ka ndị si n’agbụrụ ma ọ bụ ụcha akpụkpọ anụ ahụ ndị ọzọ mma. E zighịkwa ha ịkpọ ndị si ná mba ndị ọzọ asị. (Ọrụ 10:34, 35) Ya mere ha adịghị ekere òkè n’agha. Ezi ndị Kraịst na-emeso ibe ha dị ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị.—1 Jọn 4:20, 21.

4. Akara ọzọ nke ezi okpukpe bụ na ndị òtù ya nwere nkwanye ùgwù miri emi maka Bible. Ha na-anakwere ya dị ka Okwu Chineke, na-ekwerekwa ihe ọ na-ekwu. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17) Ha na-emeso Okwu Chineke dị ka ihe dị mkpa karịa nchepụta ma ọ bụ omenala ndị mmadụ. (Matiu 15:1-3, 7-9) Ha na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na Bible ná ndụ ha kwa ụbọchị. Ya mere ha adịghị ekwusa otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.—Taịtọs 1:15, 16.

5. Ezi okpukpe aghaghịkwa ịsọpụrụ aha Chineke. (Matiu 6:9) Jisọs mere ka ndị ọzọ mara aha Chineke, bụ́ Jehova. Ezi ndị Kraịst aghaghị ime otu ihe ahụ. (Jọn 17:6, 26; Ndị Rom 10:13, 14) Olee ndị n’ógbè unu na-agwa ndị ọzọ banyere aha Chineke?

6. Ezi ndị Kraịst aghaghị ikwusa banyere Alaeze Chineke. Jisọs mere otú ahụ. Ọ na-ekwu mgbe nile banyere Alaeze ahụ. (Luk 8:1) O nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ikwusa otu ozi a n’ụwa nile. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ezi ndị Kraịst kwere na nanị Alaeze Chineke ga-eweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ụwa a.—Abụ Ọma 146:3-5.

7. Ndị na-eso ụzọ Jisọs agaghị abụ akụkụ nke ụwa ajọ omume a ma ọlị. (Jọn 17:16) Ha adịghị etinye onwe ha n’ihe omume ndọrọ ndọ­rọ ọchịchị na esemokwu ọha na eze ụwa. Ha na-ezere àgwà na ihe omume ndị na-emerụ ahụ bụ́ ndị jupụtara n’ụwa. (Jemes 1:27; 4:4) Ị̀ pụrụ ịtụ òtù okpukpe ọ bụla n’ógbè gị aka nke nwere akara ndị a nke ezi Iso Ụzọ Kraịst?

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

Ezi ndị Kraịst na-ahụ ibe ha n’anya, na-akwanyere Bible ùgwù, na-ekwusakwa banyere Alaeze Chineke