Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Omume Ndị Chineke Kpọrọ Asị

Omume Ndị Chineke Kpọrọ Asị

Ihe Ọmụmụ nke 10

Omume Ndị Chineke Kpọrọ Asị

Olee mmetụta i kwesịrị inwe banyere ihe ndị Chineke sịrị na ha dị njọ? (1)

Ụdị omume mmekọahụ ndị dị aṅaa dị njọ? (2)

Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi were ịgha ụgha? (3) ịgba chaa chaa? (3) izu ohi? (3) ime ihe ike? (4) mgbaasị? (5) ịṅụbiga mmanye ókè? (6)

Olee otú mmadụ pụrụ isi tọhapụ onwe ya pụọ n’omume ọjọọ? (7)

1. Ndị na-ejere Chineke ozi na-ahụ ezi ihe n’anya. Ma ha aghaghịkwa ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị. (Abụ Ọma 97:10) Nke ahụ pụtara izere omume ụfọdụ Chineke kpọrọ asị. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime omume ndị ahụ?

2. Ịkwa Iko: Mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, idina anụmanụ, mmekọahụ n’etiti ndị ikwu, na ndina ụdị onwe bụcha mmehie dị oké njọ megide Chineke. (Levitikọs 18:6; Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụghị di na nwunye ma na-ebikọ ọnụ, ha kwesịrị ikewapụ ma ọ́ bụghị ya ha agbaa akwụkwọ dị ka iwu kwadoro.—Ndị Hibru 13:4.

3. Ịgha Ụgha, Ịgba Chaa Chaa, Izu Ohi: Jehova Chineke apụghị ikwu okwu ụgha. (Taịtọs 1:2) Ndị chọrọ nnwapụta ya aghaghị izere ịgha ụgha. (Ilu 6:16-19; Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ụdị ọ bụla nke ịgba chaa chaa bụ ihe anyaukwu merụworo. Ya mere ndị Kraịst adịghị ekere òkè n’ụdị ọ bụla nke ịgba chaa chaa, dị ka ịgba lọtrị, ọsọ ịnyịnya, na bingo. (Ndị Efesọs 5:3-5) Ndị Kraịst adịghịkwa ezu ohi. Ha adịghị akpachara anya zụrụ ihe e zuru n’ohi ma ọ bụ were ihe n’anataghị ikike.—Ọpụpụ 20:15; Ndị Efesọs 4:28.

4. Ọnụma, Ime Ihe Ike: Iwe a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ iduga n’ime ihe ike. (Jenesis 4:5-8) Onye na-eme ihe ike apụghị ịbụ enyi Chineke. (Abụ Ọma 11:5; Ilu 22:24, 25) Ọ bụ ihe na-adịghị mma ịbọ ọ́bọ̀ ma ọ bụ iji ihe ọjọọ akwụghachi ajọ ihe nke ndị ọzọ pụrụ ime anyị.—Ilu 24:29; Ndị Rom 12:17-21.

5. Ịkọ Ọgwụ na Mgbaasị: Ụfọdụ ndị na-akpọku ike ndị mmụọ iji gbalịa ịgwọ ọrịa. Ndị ọzọ na-akọ ndị iro ha ọgwụ iji mee ka ha daa ọrịa ma ọ bụ ọbụna iji gbuo ha. Ike dị n’azụ omume ndị a nile bụ Setan. Ya mere ndị Kraịst agaghị ekere òkè n’akụkụ nke ọ bụla n’ime ha. (Deuterọnọmi 18:9-13) Ịnọ Jehova nso bụ ihe nchebe kasị mma site n’ọgwụ ndị ọzọ pụrụ ịkọ anyị.—Ilu 18:10.

6. Ịṅụbiga Mmanya Ókè: Ọ dịghị njọ ịṅụ obere mmanya, biya, ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya. (Abụ Ọma 104:15; 1 Timoti 5:23) Ma ịṅụ oké mmanya na ịṅụbiga mmanya ókè dị njọ n’anya Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:11-13; 1 Timoti 3:8) Ịṅụ mmanya nke ukwuu pụrụ imebi ahụ ike gị ma tisaa ezinụlọ gị. Ọ pụkwara ime ka ị daba ngwa ngwa n’ọnwụnwa ndị ọzọ.—Ilu 23:20, 21, 29-35.

7. Ndị na-eme ihe Chineke sịrị na ha dị njọ “agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galetia 5:19-21) Ọ bụrụ n’ezie na ị hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ, ị pụrụ inwere onwe gị pụọ n’omume ndị a. (1 Jọn 5:3) Mụta ịkpọ ihe Chineke sịrị na ọ di njọ asị. (Ndị Rom 12:9) Soro ndị nwere àgwà nsọpụrụ Chineke na-akpakọrịta. (Ilu 13:20) Mkpakọrịta nke ndị Kraịst tozuru okè pụrụ ịbụ isi iyi nke enyemaka. (Jemes 5:14) N’elu ihe nile, dabere n’enyemaka Chineke site n’ekpere.—Ndị Filipaị 4:6, 7, 13.

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Chineke kpọrọ ịṅụbiga mmanya ókè, izu ohi, ịgba chaa chaa, na omume ime ihe ike asị