Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa nke Ndị Nna Ochie Ahụ

Ụwa nke Ndị Nna Ochie Ahụ

STIVIN malitere okwu ya a ma ama site n’ịkpotụ aha ebe ụfọdụ ndị dị adị n’ezie, na-asị: “[Jehova] pụtara ìhè nye nna nna anyị bụ́ Ebreham ka ọ nọ na Mesopotemia, tupu o biri na Heran, ọ gwakwara ya, sị, ‘. . . [Banye] n’ala nke m ga-egosi gi.’” (Ọrụ 7:1-4) Nke a tọrọ ntọala maka isi ihe ụfọdụ gaje ime n’Ala Nkwa ahụ bụ́ ndị metụtara Ebreham, Aịzik, na Jekọb, ihe omume ndị e jikọrọ ha na nzube Chineke ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ.—Je 12:1-3; Jọs 24:3.

Chineke si na Ọọ nke ndị Kaldia, bụ́ obodo bara ọgaranya nke dị n’oge ahụ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ikpere Osimiri Yufretis, kpọpụta Ebreham (ma ọ bụ, Ebram). Olee ụzọ Ebreham ga-esi? Ọ pụrụ iyi ka ọ̀ ga-adị mfe isi Kaldia, bụ́ ebe a na-akpọkwa Suma ma ọ bụ Shaịna, gawa ebe ọdịda anyanwụ. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji gbagowe Heran?

Ọọ dị nso ná nsọtụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Ógbè Na-eme Nri, bụ́ ebe fọrọ nke nta ka ọ dị okirikiri, nke malitere na Palestaịn gbasapụ banye ebe nile osimiri Taịgris na Yufretis na-erute. Ọ pụrụ ịbụ na ebe ndị a abụbughị ebe oké okpomọkụ. N’ebe ndịda nke gburugburu ógbè ahụ na-eme nri, e nwere ọzara dị n’agbata Siria na Arebia, bụ́ nke e ji ugwu jupụtara na nkume na-acha nzu nzu na ala uzuzu dị larịị mara. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-asị na ọ bụ “ihe mgbochi rara nnọọ ahụ́ ngafe” bụ́ nke dị n’agbata Ụsọ Osimiri Mediterenian na Mesopotemia. Ìgwè ndị ahịa ụfọdụ pụrụ isi na Yufretis gafere jee Tadmọ, sizie ebe ahụ gawa Damaskọs, ma Ebreham edughị ezinụlọ ya na ìgwè anụ ụlọ ya gafere ọzara dị otú ahụ.

Kama nke ahụ, Ebreham si na ndagwurugwu Osimiri Yufretis rịgoo gawa Heran. Site n’ebe ahụ, ọ pụrụ iso ụzọ ndị ahịa wee ruo n’ebe mmiri na-adịghị ògbú na Kakemish ma tinye isi n’ebe ndịda, si Damaskọs gafere rute Oké Osimiri Galili. Ụzọ a na-akpọ Via Maris, ma ọ bụ “Ụzọ Oké Osimiri,” si Megido gafere gawa Ijipt. Otú ọ dị, Ebreham sooro ụzọ ugwu ndị dị na Sameria, mesịa bịa maa ụlọikwuu na Shikem. Ka oge na-aga, ọ nọgidere na-aga n’ebe ndịda nke ụzọ ahụ si n’elu ugwu gafere. Soro ya ka ị na-agụ Jenesis 12:8–13:4. Rịba ama ọtụtụ ebe ndị ọzọ o rugasịrị: Dan, Damaskọs, Hoba, Mamre, Sọdọm, Giraa, Bia-shiba, na Moraịa (Jeruselem).—Je 14:14-16; 18:1-16; 20:1-18; 21:25-34; 22:1-19.

Ịghọta ihe ụfọdụ banyere otú ala ndị ahụ dị na-eme ka a ghọtakwuo ihe ndị mere ná ndụ Aịzik na Jekọb. Dị ka ihe atụ, mgbe Ebreham nọ na Bia-shiba, ebee ka o zigara onye na-ejere ya ozi ịga chọtara Aịzik nwunye? Ọ bụ Mesopotemia (nke pụtara, “Ala Dị n’Etiti Osimiri Abụọ”), n’ógbè ya bụ́ Padan-eram, nke dị n’ebe dị nnọọ anya n’ebe ugwu. Chezienụ banyere njem tara akpụ Rebeka ji kamel mee gaa Negeb, nke dị Kedesh nso ma eleghị anya, iji jekwuru Aịzik.—Je 24:10, 62-64.

Ka oge na-aga, nwa ha nwoke bụ́ Jekọb (Izrel) mekwara ogologo njem yiri nke ahụ iji lụọ onye na-efe Jehova. Jekọb sooro ụzọ dịtụ iche mgbe ọ na-alaghachi obodo ya. Mgbe Jekọb jisịrị ụkwụ gafee mmiri iyi Jabọk nke dị nso na Penuel, ọ gbasoro mmụọ ozi mgba. (Je 31:21-25; 32:2, 22-30) Ịsọ zutere ya n’ógbè ahụ, mgbe ahụkwa, onye nke ọ bụla n’ime ha jewaara nke ya ịga biri n’ebe ọzọ.—Je 33:1, 15-20.

Mgbe e dinasịrị nwa nwanyị Jekọb bụ́ Daịna n’ike na Shikem, Jekọb kwagara Betel. Otú ọ dị, ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ otú ebe ụmụ ndị ikom Jekọb jere ịzụ atụrụ ya dịruru n’anya na ebe Josef mesịrị chọta ha? Map a (nakwa peeji nke 18-19) pụrụ inyere gị aka ịhụ otú isi Betel gaa Dotan dịruru n’anya. (Je 35:1-8; 37:12-17) Ụmụnne Josef resịrị ya ndị ahịa na-aga Ijipt. Olee ụzọ i chere ha si na-aga ná njem nke mesịrị duga ná nkwaga ụmụ Izrel kwagara Ijipt nakwa n’Ọpụpụ ha?—Je 37:25-28.

[Map ndị dị na peeji 7]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Njem Ndị Ebreham Mere (Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)

Njem Ndị Aịzik Mere (Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)

Njem Ndị Jekọb Mere (Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)

Okporo Ụzọ (Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)

Ndị Nna Ochie

A4 GOSHEN

A5 IJIPT

B4 SHỌỌ

B5 PERAN

CH3 Damaskọs

CH3 Dan (Leish)

CH4 Shikem

CH4 Betel

CH4 Hibrọn (Kiriat-aba)

CH4 Giraa

CH4 Bia-shiba

CH4 SIA

CH4 Kedesh

CH5 IDỌM

D1 Kakemish

D2 Tadmọ

D3 Hoba

E1 PADAN-ERAM

E1 Heran

F2 MESOPOTEMIA

G1 Ninive

G2 ÓGBÈ NA-EME NRI

G3 Babilọn

GB4 KALDIA

GB4 Ọọ

[Ugwu]

Moraịa

[Mmiri]

B3 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)

[Osimiri]

E2 Yufretis

G2 Taịgris

Ndị Nna Ochie (n’Ala Nkwa)

KENAN

Megido

GILIED

Dotan

Shikem

Sọkọt

Mahaneim

Penuel

Betel (Lọz)

E-aị

Jeruselem (Selem)

Betlehem (Efrat)

Mamri

Hibrọn (Mak-pila)

Giraa

Bia-shiba

Sọdọm?

NEGEB

Rehobọt?

Bia-lehaị-rọị

Kedesh

[Okporo Ụzọ]

Via Maris

Okporo Ụzọ Eze

[Ugwu]

Moraịa

[Mmiri]

Oké Osimiri Nnu

[Osimiri na Iyi]

Jabọk

Jọdan

[Foto dị na peeji nke 6]

Osimiri Yufretis nke dị Babilọn nso

[Foto dị na peeji nke 6]

Ebreham biri na Bia-shiba ma na-azụ anụ ụlọ ya n’ebe dị nso

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndagwurugwu mmiri iyi Jabọk